Mayen Adetiba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mayen Adetiba
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereMayen Dezie
aha ezinụlọ yaAdetiba Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1954 Dezie
nwaKemi Adetiba Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụcivil engineer, omee Dezie
ebe agụmakwụkwọVirginia Union University, Columbia University Dezie
ogo mmụtaBachelor of Science, nzere masters Dezie
Ebe obibiLagos Dezie
Ebe ọrụLagos Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Onye òtù nkeNigerian Society of Engineers Dezie
Mayen Adetiba
Afọ a mụrụ ya 1954
Obodo ya Nigeria
Agụm akwụkwọ Mahadum nke Columbia
Ọrụ Injinịa
Njiri mara Injinịa nwaanyi nke Naijiria
Di ya Dele Adetiba
Ụmụ Atọ

Mayen Adetiba (a mụrụ ya n'afọ 1954) bụ onye Naijiria na-eme ihe egwuregwu nkiri, ọ gara n’ihu ibu onye ọrụ Injinịa ama ama n' obodo .

Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Adetiba n'afọ 1954 na Naijiria. [1] Na mbụ ọ chọrọ ị bụ onye odebe, mgbakọ ego bụ nke ndị oyibo kporọ Accountant, mana o mechara ga- gụọ ihe gbasara ịchụ nta akụkọ [2]

Ọ rụrụ ọrụ n'ihe nkiri a kpọrọ The Bar Beach Show , ọ kpara agwa dika nwunye Lakunle Ojo n'egwregwu Village Headmaster . Ọ sokwa mepụta ihe egwregwu Kongi's Harvest bụ nke pụtara ihe n'afọ 1980. [2] Ọ gara obodo oyibo na US maka agụmakwụkwọ nke mahadum ebe ọ nwetara ọrụ n'ihi nne na nna ya enweghị ike izitere ya ego n'ihi ihe mgbochi nwepụ ihe n'ala Naijiria. Ọ nọrọ nwantịtị oge na Mahadum nke New York tupu ọ gafee na Mahadum nke Columbia iji mụọ maka injinia nke na-ahụ maka eletriki. A gwara ya na injinia ịrụ okporo ụzọ, akwa mmiri, ụlọ di iche iche w.d.g bụ nke akpọrọ ''civil engineer'' ga aka nata ugwu na nsọpụrụ karia injinia eletriki, nke a mere ka ọ gbanwee gụwazie ''civil engineer''.

Mgbe ọ gbanwere ịgụ Civil injinịa na Mahadum Columbia, ọ bụghị naanị na ọ bụ naani nwaafọ Naịjirịa, kama kwa ọ bụ naanị ya bụ nwa nwaanyị ojii na-enweta ọzụzụ ị bụ injinia a. [3] Ọ gara n’ihu nweta nzere nke Mastas na Mahadum Cornell . [2]

Ọ lụrụ Mazi Dele Adetiba ha mụta nwa nwaanyị aha ya bụ Kemi onye nke a mụrụ na Lagos na Jenụwarị n'afọ1980. [4]

A hoputara ya dika onye isi ndi otu a kpọrọ Association of Consulting Engineers of Nigeria ma bụrụkwa osote onye isi n'otu ọzọ a kpọrọ Nigerian Society of Engineers ugboro ato. [3] Ọ bụ nwanyị mbụ ahọpụtara ka ọ bụrụ onye isi oche nke Executivi Kọmitii nke otu 'Nigerian Society of Engineers'. [4] Ọrụ ya gụnyere ịrụ ọrụ nke metụtara Ụlọ ọrụ African Union Southern Africa Regional nke dị na Malawi nakwa nnukwu ụlọ a kpọrọ Summerhill Baptist Church dị na Lagos. Ọ rụrụa ọrụ ebe a na anaghị ego maọbụ ihe nrite ndị ọzọ. [2]

N'afọ 2017 a họpụtara ya ịnọ n' ihe nkiri nwa ya nwaanyị a kpọrọ "King Women" ebe Kemi Adetiba gbara ya ajụjụ ọnụ. O sonyeere "King Women" ndị ọzọ bụ Chigul, Taiwo Ajai-Lycett, TY Bello na Tara Durotoye [5]

Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]