Nicole Asinugo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nicole Asinugo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereNicole Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nhazi ederede, storyteller, film screenwriter, onye nchikota akuko Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Nottingham, Ụlọ Akwụkwọ Iwu Nigeria, London School of Journalism Dezie
Ihe nriteAfrica Magic Viewers' Choice Awards Dezie
webụsaịtịhttp://www.nicoleasinugo.com/ Dezie

Nicole Asinugo bụ onye nduzi akụkọ, si Naijiria. Ọ bụ onye na-akọ akụkọ, onye na-emepụta ihe na onye ederede ihe ngosi.[1][2] Ọ bụ onye mmeri (ya na C.J. Obasi) na mmemme nke Africa Magic Viewers’ Choice Awards maka onye edemede ihe ngosi kachasị mma na ngalaba ihe nkiri fim ma ọ bụ Televishion na 2020 maka nyocha mbụ ya; Living in Bondage: Breaking Free.[3][4][5][6] Ọ bụkwa onye dere ihe ngosi nke ihe nkiri Nollywood bụ 'Rattlesnake'.[7][8][9][10] Ọ bụ onye na-akọ akụkọ na onye na-ahazi ọdịnaya maka mmemme World Expo 2020 na United Arab Emirates, mgbe ọ rụchara ọrụ ya dị ka onyeisi ndị editọ na onye na-emepụta ọdịnaya na Ndani TV.[11]

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Asinugo na United Kingdom. Ọ gụrụ akwụkwọ na University of Nottingham, ebe o nwetara nzere bachlọ maka mmuta Iwu (LLB) na 2010. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ nwetara asambodo Barrister na Iwu (BL) site na ụlọ akwụkwọ iwu nke Naijiria na 2011. Mgbe ahụ ọ gara London School of Journalism na 2012 ebe ọ nwetara post-graduate diploma (PGD) na mmuta nchikota ma mgbasa ozi akpọọrọ Journalism na-asụsụ bekee.[11]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Asinugo bụ onye nchịkọta akụkọ na ''In and out magazine'' na 2010 nke bụ akwụkwọ gbasara njemnleghari anya nke Niajiria. Na 2012, ọ gara na Channels Television dị ka onye edemede akụkọ, maka akụkọ banyere Environment, Aviation na Foreign Affairs. Na 2013, ọrụrụ ọrụ na ụlọ ọrụ ngosi ozi akpọrọ DDB na Lagos ruo afọ atọ bụrụ nnukwu onye ode akwụkwọ. O mepere ụfọdụ ụlọ ọrụ akwụkwọ gunyere Diageo, Pernod Ricard, Unilever, MTN na Interswitch yana ịmepụta ihe ọhụụ maka ngosiputa na igbasa ozi.  Na 2016 Asinugo sonyeere Ndani TV na Lagos, dịka onyeisi ndi nduzi na onye na-emepụta ihe.[1]

Nicole Asinugo na NdaniRealtalk S2E1

Ọrụ Asinugo dịka onyeisi ndi nduzi akụkọ mere Ndani lifestyle boro ya ebubo maka okike, ịmalite na ijikwa blọgụ Ndani lifestyle.

Nicole on NdaniRealtalk S2E10

O bu onye na emeputa ma na-akwado ihe ngosi Ndani TV nke bụ Real Talk. Ọ hapụrụ ọrụ ya na Ndani TV maka World Epo 2020 emere na Dubai dị ka onye na-akọ akụkọ na onye na-emepụta ihe ọgụgụ na 2020, ebe ọ na-ahazi akụkọ maka obodo.[2][1]

Na 2019, o mepụtara ihe ngosi izizi ya Living in Bondage: Breaking Free nke so merie onyinye na mmemme nke Africa Magic viewers' choice awards (AMVCA) ya na CJ Obasi na February 6, 2020, na Eko expo hall na Victoria Island, Lagos.[12][13][14][15][16] Na Eprel 2020, o mechara ihe nkiri ya nke abụọ bụ ‘‘Rattle Snake’’.[17] O nwere blọgụ akpọọrọ "2 scoops of life and style", ebe o na-akọrọ ahụmịhe ya na ọdịbendị ndị Naijiria na ịba ọgaranya maka mmadu ịbi naanị ya na Lagos. Blọọgụ ahụ nwere ngalaba klọb akwụkwọ, ebe ọ na-ezute ya na ndị na-agụ akwụkwọ ma tụlee akwụkwọ mmasi.[18]

Onyinye na nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

Asinugo natara onyinye maka ọrụ ya dịka onye mmeri nke onye edemede ihe ngosi kacha mma na fim ma ọ bụ usoro TV na mmemme nke asaa maka Africa Magic viewers 'Choice Awards (AMVCA).[3][4][5][6]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Kachi Tila Adesina (5 March 2018). A day in the work life of Nicole Asinugo - Editor and content producer.
  2. 2.0 2.1 Nicole Asinugo.
  3. 3.0 3.1 Africa! Here are your winners - AMVCA.
  4. 4.0 4.1 AMVCA 2020: "Living in bondage sweeps through Africa's biggest movie night.
  5. 5.0 5.1 Jayne Augoye (14 October 2019). Nigeria: David, Flavour feature on "Living in Bondage soundtrack.
  6. 6.0 6.1 Atume Philip (16 March 2020). AMVCA 2020: celebrities, others make history (full list of winners). Archived from the original on 8 April 2020. Retrieved on 28 November 2020.
  7. Kay Ugwuzor (18 April 2020). Nicole Asinugo is screenwriter for "Rattlesnake remake. Archived from the original on 12 December 2020. Retrieved on 28 November 2020.
  8. Precious Mamazeus Nwogu (16 April 2020). Nicole Asinugo confirmed as screenwriter for "Rattlesnake remake.
  9. Nicole Asinugo confirmed as screenwriter for "Rattlesnake remake (16 April 2020).
  10. Nicole Asinugo is the brain behind the amazing script for forthcoming Nollywood classic (16 April 2020). Archived from the original on 9 December 2020. Retrieved on 28 November 2020.
  11. 11.0 11.1 WCW: Nicole Asinugo.
  12. Daniel Anazia (1 November 2019). Living in Bondage returns 27 years after with "breaking free".
  13. Inemesit Udodiong (23 February 2020). Here are the 3 Nigerian films selected for the 2020 Hollywood exhibition.
  14. Living in Bondage: Breaking free (2019).
  15. Taiwo Okanlawon. check out the full list of winners at AMVCA 2020.
  16. Webby (14 March 2020). Live update: Check out winners at AMVCA 2020. Archived from the original on 24 September 2020. Retrieved on 28 November 2020.
  17. Ugboaue Richard. Nicole Asinugo confirmed as screenwriter for "Rattlesnake" remake.
  18. 2 scoops of life and Style.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Nicole Asinugo on IMDb