Jump to content

Nigerian Federal Ministry of Agriculture

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ụlọ ọrụ Federal Ministrị nke ọrụ ugbo na mmepe ime Obodo bụ Ministryị nke Federal Gọọmenti nke Naịjiria nke nwere ikike iji hụ na nchekwa nri na ihe ọkụkụ, anụ ụlọ na ịkụ azụ, ịkwalite ọrụ ugbo na ọrụ, ịkwalite mmepụta na inye ihe ndị na-emepụta ihe na ụlọ ọrụ ndị jikọrọ aka na Agro, nye ahịa maka ngwaahịa nke ụlọ ọrụ mmepụta ihe, mepụta mgbanwe mba ọzọ ma nyere aka na mmepe Obodo mmekọ nke akụ na ụba na Naịjirịa niile.[1] Mohammad Mahmood Abubakar bụ Minista na-ahụ maka ọrụ ugbo na mmepe ime obodo ugbu a.[2][3] Abubakar nọchiri Sabo Nanono ma weghara ọrụ nke Ministrị nke ọrụ ugbo na mmepe Obodo n'ọnwa Septemba afọ 2021, mgbe Onye isi ala Muhammadu Buhari si na Federal Ministrị nke gburugburu ebe obibi.[4]

Akụkọ ihe mere eme

[dezie | dezie ebe o si]

E guzobere ụlọ ọrụ Federal Ministrị nke ọrụ ugbo na ihe mnweta nke ala n'afọ 1966, ọ gafere site na mgbanwe nke aha iji kwekọọ na ihu igwe nke njikọta na nkesa na ngalaba ndị metụtara ya.[5]

Ụlọ ọrụ Federal Ministry nke ọrụ ugbo pụtara n'afọ 1967 tinyere okike nke steeti n'abalị iri na abụọ site na mpaghara anọ na Naịjirịa mgbe nnwere onwe gasịrị .[6][7] Steeti ọ bụla nwere Ministri Ọrụ Ugbo na Akụ na Ụzụ nke ya.Dịka ọmụmaatụ, Ebonyi Steeti nwere nke ya.[8] N'ọnwa Eprel afọ 2010 mgbe Goodluck Jonathan họpụtara Sheikh Ahmed Abdullah, Ministrị Mmiri dị iche na Ministrị Ọrụ Ugbo na Ime Obodo. [9] Ọ bụ Adamu Bello, Abba Sayyadi Ruma na Sheikh Ahmed Abdullah duziri ozi ahụ.[10][11]

Onye isi ala Goodluck Jonathan họpụtara Akinwumi Adesina ka ọ bụrụ Minista Federal nke Ọrụ Ugbo na Mmepe Ime Obodo n'ọnwa Juun afọ 2011. Onye nọchiri ya bụ Audu Innocent Ogbeh onye Onye isi ala Muhammadu Buhari họpụtara n'afọ 2015.[12] Onye isi ala Buhari ejighi Audu maka oge nke abụọ ya ma jiri Sabo Nanono dochie ya n'afọ 2019. [13]Mustapha Baba Shehuri bụ Minista nke Steeti ugbu a ebe Ernest Afolabi Umakhihe bụ odeakwụkwọ na-adịgide adịgide ugbu a maka Ministri Ọrụ Ugbo na Mmepe Ime Obodo.

Ministri ahụ na-ahụ maka ọrụ dị iche iche metụtara ebumnuche mba nke mmepe ime obodo, nchekwa nri, uto ego ime obodo na ịmepụta ọrụ.[14] Ministri ahụ na-arụ ọrụ ya site na ngalaba ya na ụlọ ọrụ gọọmentị. Ọ na-elekọtakwa ma na-enye ego maka ụlọ ọrụ nyocha dịka ọmụmụ Nchọpụta mgbọrọgwụ a kụrụ na mba, ọmụmụ nnyocha mmepụta anumanu, (NAPRI), ọmụmụ nnyocha ọgwụ anụmanụ (NVRI) ọmụmụ nnyocha Rọba nke Naịjiria (RRIN) na ọzụzụ ọrụ ugbo na oke ọhịa n'etiti ndị ọzọ. (RRIN) dị na ime obodo IYANOMO , mpụga Benin/Sapele Highway, Benin City, Edo Steeti.[15]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Federal Ministry of Agriculture - NCTC (en-US). nctc.gov.ng (2023-11-15). Retrieved on 2024-07-06.
  2. FMARD 2022
  3. [1]
  4. Buhari Sacks Ministers Of Agriculture And Power | Channels Television. www.channelstv.com. Retrieved on 2021-09-23.
  5. Federal Ministry of Agriculture and Food Security (Nigeria).
  6. Federal Ministry of Agriculture and Rural Development (FMARD) (en). GAIN. Retrieved on 2024-07-06.
  7. Blueprint (2021-09-15). On the appointment of agric minister (en-US). Blueprint Newspapers Limited. Retrieved on 2022-06-01.
  8. Ministry of Agriculture And Natural Resources, Ebonyi State Government. www.ebonyistate.gov.ng. Archived from the original on 31 October 2022. Retrieved on 2022-06-01.
  9. George Oji (7 April 2010). Jonathan Takes Over Ministry of Power. ThisDay. Retrieved on 2011-02-27.
  10. Welcome. Abba Sayyadi Ruma. Archived from the original on 2010-03-26. Retrieved on 2009-12-15.
  11. Citizen Science Nigeria (en). citizensciencenigeria.org. Retrieved on 2024-07-06.
  12. Buhari finally names a new Nigerian government cabinet—but it's not that new. QuartzAfrica. Retrieved on 2019-08-26.
  13. Ex-Ministers Dropped By Buhari. Sahara Reporters. Retrieved on 2019-08-26.
  14. Welcome. Federal Ministry of Agriculture and Rural Development. Retrieved on 2019-08-26.
  15. Riskgratis Homepage (en-US). Federal Republic of Nigeria. Retrieved on 2024-07-06.