Oluchi Onweagba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Oluchi Onweagba
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Ọgọọst 1982 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
nwaUgo Ugochukwu Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụmodel Dezie
ebe agụmakwụkwọNew York University Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
webụsaịtịhttp://www.oluchi.com Dezie
nọchitere anya yaDNA Model Management Dezie

Oluchi Onweagba-Orlandi onye amụrụ na abali mbụ n’onwa nke asato n'afọ 1980 ,bụ onye ihe nlere anya nke Naịjirịa.

Mmalite Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Onweagba tolitere na ala mgbalị nke Lagos, Naijiria, ya na ụmụnne ya ụmụ nwoke abụọ na ụmụ nwanyị . Ọ bụ nwa nwanyị nke nne ya bụ nọọsụ na nna yabụ onye ọrụ obodo.

Nchọpụta[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gbara afọ iri na asaa, enyi ezinụlọ ha gwara Onweagba ka ọ banye na nyocha mbụ nke M-Net “Face of Africa” n’ụlọ ọrụ M-Net dị na Victoria Island, Lagos. [1] ụlọ ọrụ ahụ zulitere ya ka ọ bụrụ otu n’ime ndị batara ọhụrụ maka asọmpi a 1998 (nke a na-akpọzi Nokia Face of Africa). Nke a n'agbanyeghị mgbe ọ na-etolite, ọ nọgidere na-amaghị ihe banyere ejiji na ịme ngosi uwe .  Mana na nkwado nke ezinụlọ ya na ndị enyi ya, o kpebiri ka o sonye asọmpi mbipụta mbụ nke Face of Africa na 1998. Nke a bụ asọmpi mbụ nke kọntinenti niile, nke ndị South Africa na-ahazi M-Net na mmekorita ya na Elite Model Management .  Ọ meriri n'asọmpi ahụ. [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ kwagachara New York City, ebe ọ ka bi, ọ malitere ịpụta na nchịkọta akụkọ maka American na Italian Vogue, Harper's Bazaar, Marie Claire, Allure,Nylon na W.

O jerela Gucci, Carolina Herrera, John Galliano, Missoni, Tommy Hilfiger, Chanel, Bottega Veneta, Christian Dior, Alessandro Dell'Acqua, Jeremy Scott, Helmut Lang, Fendi, Anna Sui, Givenchy, Kenzo, Giorgio Armani, Céline, Nina Ricci, na Diane Von Furstenberg ije nlereanya Azụmahịa.

Ọ gosiputakwala na mgbasa ozi Azụmahịa nke Gianfranco Ferré, Lancôme, Ann Taylor, Clinique, Bergdorf Goodman, Nordstrom, Macy's, Banana Republic, Gap, Express, L'Oreal, Coca-Cola ,ma gaa n'ihu irụrụ Victoria's Secret maka afọ asaa na ihe ngosi ejiji Victoria Secret kwa afọ . [3] Ya na ndị ọrụ foto dịka Steven Meisel, Nick Knight, David LaChapelle, na Patrick Demarchelier rụkọrọ ọrụ .E wezụga ịme ihe ngosi ejiji ,Onweagba na-agba mbọ ije ozi dị ka onye nlereanya maka ndị ọzọ nwere ọnụnụ ọkụ n'obi na Naịjirịa, ọkachasị ụmụ agbọghọ.  Ọ wepụtara onwe ya na oge maka ndị otú ọrụ akwụ ụgwọ NGO dị ka LEAP Africa (ndị ọzụzụ maka akụ onwe) na NIPRO. Ọ malitekwara agụmakwụkwọ ya dị elu, ebe ọ gụbuuru maka akara ugo mmụta dịgri na usoro agụmakwụkwọ New York City.Mgbe nkwekọrịta ya na Elite nọrọ afọ atọ bịara na njedebe, Onweagba binyere aka na DNA Model Management.  ọ gosiputala na "Sports Illustrated Swimsuit Issue" ugboro atọ. [4]

N’afọ 2008, ọ butere ụlọ ọrụ n'ahụ maka ihe nlereanya na South Africa, OModel Africa, nwee isi ụlọ ọrụ na Johannesburg na nso nso Cape Town.  Onye mmeri nke M-Net Face nke Africa, Kate Tachie-Menson na 2008, nyere OMDel Africa nkwekọrịta mbupute US $ 50,000.  ọ bụ ugbu a onye ọbịa na onye isi ọka ikpe nke Africa Next Top Model . [5]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Aha mbụ Onweagba sitere n’asụsụ Igbo ma pụtakwa “Ọlụ Chukwu”. [6]

N’afọ 2006, Onweagba lụrụ onye Italian fashọn dizaina aha ya bụ Luca Orlandi. Ha nwere ụmụ nwoke abụọ.

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Facing Off", Times LIVE, Tim. Retrieved on 22 August 2010.
  2. "Model Bio: Oluchi". New York Magazine.
  3. "Show Buzz", New York Post.
  4. Throwback Thursday: Oluchi Onweagba (en).
  5. Archive copy. Archived from the original on 2013-11-08. Retrieved on 2020-11-14.
  6. 2007 Sports illustrated Swimsuit Bio -Oluchi Onweagba. CNN/Sports Illustrated. Retrieved on 2009-01-30.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]