Omoyele Sowore

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Omoyele Sowore
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Febụwarị 1971 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Ondo Dezie
Dị/nwunyeOpeyemi Sowore Dezie
onye were ọrụAfrican Action Congress, Sahara Reporters Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos, School of International and Public Affairs, Columbia University Dezie
candidacy in election2019 Nigerian presidential election Dezie
dị na mpaghara echedoroSteeti Abia Dezie
webụsaịtịhttp://saharareporters.com/ Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Omoyele "Yele" Sowore (a mụrụ n'ụbọchị nke 16 n'ọnwa Febụwarị n'afọ 1971) bụ onye Naijiria na-akwado ikike mmadụ, onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya, onye zoburu ọkwa onye isi ala, na onye guzobere ụlọ ọrụ mgbasa ozi n'ịntanetị nke apooro Sahara Reporters.[1]

N'ụbọchị nke atọ n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2019 ndi oru nchekwa steeti Naịjirịa (SSS) jidere Sowore maka ebubo ịgba ọchịchị mgba mgbe ọ kpọsịrị maka ngagharị iwe akpọrọ RevolutionNow .[2] E jidere ya ọzọ ma tie ya ihe n'oge ngagharị iwe na Abuja na Jenụwarị 1, 2021.[3] Onye uwe ojii merụrụ Sowore ahụ n'oge ngagharị iwe na Abuja na Mee 31, 2021[4]

Ndụ mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Yele Sowore si Ese-Odo, Ondo Steeti na South West Nigeria. A mụrụ Sowore na mpaghara Niger Delta nke Naijiria (nke gụnyere steeti isii na mpaghara South-South, Ondo, Abia na Imo Steeti) ebe a zụlitere ya n'ụlọ nwere ụmụ iri na isii.[5] Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ọ mụtara ịnya ọgba tum tum ka o wee nwee ike ịga ọdọ mmiri ahụ ịga azụ maka nri maka ezinụlọ ya dum kwa ụtụtụ tupu ọ gaa ụlọ akwụkwọ. Mmasị na ọchịchọ Sowore na ihe gbasara mgbasa ozi kpaliri n'oge ochichi ndi agha na Naijiria.[6]


Sowore gụrụ Geography na Planning na Mahadum nke Lagos site na 1989 ruo 1995 na mmemme agụmakwụkwọ ya gbakwunyere afọ abụọ ọzọ mgbe a chụpụrụ ya ugboro abụọ n'ihi emume ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụmụ akwụkwọ.[7] Ọ bụ onye isi oche nke Mahadum nke Lagos Student Union Government n'afọ 1992 ruo 1994 ebe o tinyere aka na mmegide otu nzuzu na mmegide nrụrụ aka.[7] Sowore nwere nzere masta na Public Administration na Columbia University.[8]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ ngagharị iwe[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1989, o sonyere na ngagharị iwe ụmụ akwụkwọ na-eme ngagharị iwe maka ọnọdụ ego International Monetary Fund (IMF) biiri Naijiria bu $120 nde iji mee ihe maka pipeline mmanụ ụgbọala. Tinyere n'ime ọnọdụ nke ego IMF, bụ mbelata ọnụ ọgụgụ mahadum na Naịjirịa site na 28 ruo 5.[9]

Sowore duru ụmụakwụkwọ 5,100 mee ngagharị iwe megide ọchịchị Naijiria na 1992. Mkpesa a mere ka ndị uwe ojii jiri mgbọ wee gbuo ndị ngagharị iwe asaa. E jidere Sowore ma taa ya ahụhụ. Omoyele tinyekwara aka n'ịchọ ka gọọmentị onye kwuo uche ya weghara ọchịchị ndị agha na June 12, 1993. Nke a butere ọtụtụ njide nga na mmeso ndị na-eyi ndụ egwu site n'aka ndị ọrụ gọọmentị. [10]

Mkpọrọ[dezie | dezie ebe o si]

Na Jenụwarị 12, 2017, ndị uwe ojii na Lagos Steeti jidere Sowore n'ihi mkpesa nke onye na-ebipụta magazin, Lekan Fatodu.[11] Ka e mesịrị n'uhuruchi nke otu ụbọchị ahụ, Sowore kwadoro ihe mere na vidiyo o tinyere na Facebook ya ebe ọ boro ndị uwe ojii ebubo na ha na-akwado Fatodu mgbe ọ wakporo ya na Area F Police Command.[12]

Ebo ịgba ọchịchị mgba[dezie | dezie ebe o si]

Ndị DSS jidere Sowore na-abali ato nke Ọgọstụ 2019 tupu ngagharị iwe nke akpooro #RevolutionNow.[13] Gọọmentị mechara kweta na o ha jidere ya, nke a mere Wole Soyinka, Oby Ezekwesili na ọtụtụ ndị ọzọ na-eme ihe ike katọrọ ha.[14][15] E mechara kwuo na ọ na-agba izu ịgba ọchịchị mgba na ịkparị onye isi ala bu Muhammadu Buhari".[16]

N'abalị iri abụọ na anọ n'ọnwa Septemba afọ 2019, Ụlọikpe Kasị Elu nke bu Federal High Court di na-Abuja nyere Sowore mgbapụta, n'ọnọdụ na ọ ga-enyefe paspọtụ mba ụwa ya.[17] Ndị DSS ajụla ịhapụ Sowore na-ekwu na ha amaghị iwu ụlọ ikpe ahụ. Ihe ahu butere ngagharị iwe na UN Plaza na New York nke nwunye Sowore duziri ma kpalie nkatọ zuru ụwa ọnụ banyere ọchịchị onye kwuo uche ya nke Naijiria dara ada.[18]

Na 29 Septemba 2019, Sowore pụtara nke mbụ ya n'èzí kemgbe a tụrụ ya mkpọrọ. Ọ kọwara mmeso ọjọọ mgbe a kpọchiri ya n'ime mkpọrọ n'enweghị ìhè anyanwụ. O kwukwara na "ndị ọchịagha Boko Haram na-eme emume di egwu nwere ohere ịnweta ekwentị, igwe onyonyo n'ime ụlọ mkpọrọ ha" ebe a na-egbochi ya ohere dị otú ahụ.[16] Ụlọ ikpe ahụ tọhapụrụ Sowore ọzọ na 5 Disemba 2019, na-akwado na o meela ndokwa mgbapụta ya. E mechara tọhapụ ya na 24 Disemba 2019.[19]

Sahara Reporters[dezie | dezie ebe o si]

Sowore malitere ulo mgbasa ozi nke akpooro Sahara Reporters na New York City n'afọ 2006 iji ịlụ ọgụ megide ọchịchị rụrụ arụ na nke na-ezighị ezi.[8] A na-akwado Sahara Reporters site na onyinye ego sitere na Ford Foundation na Omidyar Foundation. Edere na-akụkụ nke iwu ha Sahara anaghị anabata mgbasa ozi na nkwado ego site n'aka gọọmentị Naịjirịa.[20]

Kampeenu onye isi ala[dezie | dezie ebe o si]

refer to caption
Sowore na Luton

Na 25 Febụwarị 2018, Sowore kwupụtara ebumnuche ya ịzọ ọkwa onye isi ala na ntuli aka Naijiria nke 2019.[21] N'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2018, o guzobere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, African Action Congress (AAC), nke ọ ga eji azọ ọchịchị na 2019.[22] Na 6 Ọktọba 2018, ka emechara ntuli aka praịmarị nke AAC, Omoyele Sowore ghọrọ dị ka onye na-azọ ọkwa onye isi ala n'enweghi onye gbochiri ya.[23] Mgbe ọ gara ọtụtụ steeti na Naịjirịa, na-eleta ndị ama ama dịka Emir nke Kano na Wole Soyinka, Sowore malitere njem ego na gburugburu ụwa niile gụnyere Australia, United States of America na UK. Ọ nọ na Luton, England, na 10 Nọvemba 2018.[24]

Nsonaazụ ntuli aka[dezie | dezie ebe o si]

Onye isi ala Muhammdu Buhari nke All Progressives Congress (APC), nwetara vootu 15,191,847 iji merie ebe onye osote ya, Atiku Abubakar nke People's Democratic Party nwetara vootu 11,264,977 iji bụrụ onye nke abụọ. Sowore bịara onodu nke ise na votu 33,953 n'ihu ndị ọzọ batara ọhụrụ n'ọsọ ahụ dịka Fela Durotoye nke Alliance for New Nigeria (ANN), onye nwetara votu 16,779, na Kingsley Moghalu nke Young Democratic Party (YPP), onye nwetara votu 21,886.[25]

Na 1 Maachị 2022, Sowore kwuputara ebumnuche ya ịzọ ọkwa onyeisiala 2023 Nigerian general election. [26]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Sowore na ezinụlọ ya abụrụla ndị bi na Haworth, New Jersey. [27]

N'ọnwa Septemba n'afọ 2021 ka ekwuru na ndị na-achị ehi ma ọ bụ ndị ntọọrọ agbagbuola nwanne Sowore n'Edo steeti. [28]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Spiegel. "From Safety of New York, Reporting on a Distant Homeland", The New York Times, 2011-11-19. Retrieved on 2018-05-24. (in en-US)
  2. Sowore Arrested For Planning Revolution-DSS. Sahara Reporters (2019-08-04). Archived from the original on 2019-09-07. Retrieved on 2019-09-07.
  3. "Nigeria arrests journalist and opposition leader Sowore", msn.com, January 3, 2021. Retrieved on January 4, 2021.
  4. "Sowore shot by a police officer in Abuja", News Now Africa, May 31, 2021. Retrieved on May 31, 2021.
  5. "Meet Omoyele Sowore, The Founder Of Sahara Reporters [Photos - INFORMATION NIGERIA]", INFORMATION NIGERIA, 2015-10-24. Retrieved on 2018-05-24. (in en-US)
  6. "How I Started SAHARA REPORTERS In 2006 - US Based Founder, OMOYELE SOWORE Tells City People | City People Magazine", City People Magazine, 2017-05-29. Retrieved on 2018-05-24. (in en-US)
  7. 7.0 7.1 Sowore Was Arrested By The DSS Ahead Of The Planned Protest (en-US). EveryEvery (2019-12-13). Archived from the original on 2020-02-03. Retrieved on 2020-02-03.
  8. 8.0 8.1 https://www.nigeriagalleria.com.+Omoyele Sowore (Saharareporters.com), Blogger, Writer, Lecturer, Human rights activist, Nigeria Personality Profiles (en-NG). www.nigeriagalleria.com. Archived from the original on 2018-05-25. Retrieved on 2018-05-24.
  9. "How about a Nigeria governed by President Omoyele Sowore? - TheCable", TheCable, 2018-03-05. Retrieved on 2018-05-24. (in en-US)
  10. "An analog brain cannot lead a digital youth population". Retrieved on 2018-05-24. (in en-US)
  11. Police confirms Sowore's arrest in Lagos (en-US). Vanguard News (2017-01-11). Retrieved on 2020-06-07.
  12. SaharaReporters founder, Sowore, arrested in Lagos (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2020-06-07.
  13. Omoyele Sowore reportedly arrested by DSS. MSN (3 August 2019). Archived from the original on 3 August 2019. Retrieved on 20 February 2020.
  14. Press (2019-08-04). Why DSS arrested Omoyele Sowore, Presidency reveals (en-US). Nigeria News | FellowPress.com. Archived from the original on 2019-08-04. Retrieved on 2019-08-04.
  15. Press (2019-08-04). Sowore's arrest: Buhari, Abacha's regime identical (en-US). Nigeria News | FellowPress.com. Archived from the original on 2019-08-04. Retrieved on 2019-08-04.
  16. 16.0 16.1 Sowore: DSS denied me phone access but granted same to Boko Haram commanders (en-US). TheCable (2019-09-30). Archived from the original on 2019-10-02. Retrieved on 2019-10-02.
  17. Even though he had been granted bail, Sowore is still in DSS custody. (en-US). www.pulse.ng (2019-09-26). Archived from the original on 2019-09-27. Retrieved on 2019-09-28.
  18. Sowore not yet released by DSS, wife leads anti-Buhari protest in UN (en-US). P.M. News (2019-09-24). Archived from the original on 2019-09-28. Retrieved on 2019-09-28.
  19. BREAKING :DSS Finally Releases Sowore (en-US). Punch (2019-12-24). Archived from the original on 2019-12-25. Retrieved on 2019-12-24.
  20. Shenon. "Sahara Reporters: Uncovering Nigeria’s Corruption", The Daily Beast, 2010-08-12. Retrieved on 2018-05-24. (in en)
  21. Bada. "SaharaReporters publisher to contest against Buhari in 2019". Retrieved on 2018-05-25. (in en-US)
  22. Ebuzor. "N100,000 for corps members monthly- Omoyele Sowore", Pulse. Retrieved on 2018-08-21. (in en-US)
  23. 2019: Sowore emerges AAC presidential candidate (en-GB) (2018-10-07). Archived from the original on 2019-09-30. Retrieved on 2019-06-28.
  24. Five Nigerian Politicians That Desperately Showed Interest In Becoming The President Of Nigeria (en-US). Elanza News (2020-08-12). Archived from the original on 2021-01-19. Retrieved on 2021-02-03.
  25. 2019 Election Result. Archived from the original on 2019-05-02. Retrieved on 2019-05-30.
  26. Sowore joins 2023 presidential race | Premium Times Nigeria (en-GB) (2022-03-01). Retrieved on 2022-03-01.
  27. Kaulessar, Ricardo. "Trial to begin for Omoyele Sowore, the Haworth journalist imprisoned in his native Nigeria" Àtụ:Webarchive, The Record (North Jersey), November 5, 2019. Accessed December 25, 2019. "Omoyele Sowore's family and friends are hoping the Haworth resident will come back to New Jersey soon."
  28. "Sowore's younger brother shot dead", Premium Times, 2021-09-04. Retrieved on 2021-09-26. (in en-GB)