Rashidi Yekini

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rashidi Yekini
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Aha enyereRashid Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya23 Ọktoba 1963 Dezie
Ebe ọmụmụKaduna Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya4 Mee 2012 Dezie
Ebe ọ nwụrụIbadan Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụichegaa n'ihu Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1981 Dezie
Oge ọrụ ya (njedebe)2005 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie

Rashidi Yekini (23 Ọktoba 1963 – 4 Mee 2012) bụ onye ọkachamara na-agba bọọlu na Naijiria na agba bọọlu dị ka onye ọkpọ.Ọ bụ onye kacha nwee goolu na mba ya.

Ọrụ ọkachamara ya, nke gafere afọ iri abụọ, jikotara ya na Vitória de Setúbal dị na Portugal, mana ọ gbakwara bọọlu na mba isii ndị ọzọ na-abụghị nke ya. [1]

Yekini nyere goolu iri atọ na asaa dịka onye na-agba bọọlụ mba Naịjirịa nke Mba Uwa, ma nọchitekwa anya mba n'asọmpi asaa dị oké mkpa, nke gụnyere iko mba ụwa abụọ ebe o nyere goolu mbụ mba ahụ n'asọmpi ahụ. Akpọrọ ya aha onye na-agba bọọlụ Afịrịka nke afọ n'afọ 1993. [2] [3]

Ọrụ klọb[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Yekini na Kaduna, ma bụrụ onye ala Yoruba . Mgbe ọ malitesịrị ọrụ ọkachamara ya na Otu egwuregwu Naijiria, ọ gakwara Ivory Coast ka ọ gbaara Otu Mba Egwuregwu nke Afịrịka, ma sirI ebe ahụ gaa Portugal na Vitória de Setúbal ebe ọ nwetara afọ echefu echefu ya, ma mechaa ghọọ onye isi nke Primeira Liga . na oge 1993–94 mgbe ọ gbatara goolu 21; [4] mgbasa ozi gara aga ọ gbatara 34 na egwuregwu 32 nke bu ọkà mma na ọrụ ya, iji nyere Sadinos aka ịkwalite site na ngalaba nke abụọ, omume ndị ahụ mere ka ọ nweta aha onye na-agba bọọlu nke afọ n'Afirika otu ugboro, nke mbụ maka mba ahụ. [5]

N'oge okpomọkụ n'afọ 1994, Yekini bịanyere aka na ụlọ Klọb Greek Olympiacos, ma ya na ndị otu egwuregwu ya agakọrịtaghi ya wee pụọ n'oge na-adịghị anya. Ọrụ ya alaghachighị azụ n'ezie, ọbụlagodi na mgbe ọ laghachiri na Setúbal nke mere mgbe ihe adịghị mma, na La Liga ma na Sporting de Gijón ; [6] ya na FC Zürich, Club Athlétique Bizertin na Al-Shabab Riyadh rụrụ nke ọma,tupu ya abanye na egwuregwu Afirika. N'afọ 2003, mgbe ọ dị afọ 39, ọ laghachiri n'asọmpi Naijiria ya na Julius Berger FC . [7]

Na Eprel n'afọ 2005, Yekini dị afọ 41 lọghachiri azụ, ya na onye òtù mba mbụ Mobi Oparaku na Gateway United FC . [7]

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

N'inye goolu iri atọ na asaa maka Naịjirịa n'ime egwuregwu iri isii na abụọ, [8] Yekini bụ onye na enye goolu nke mba. Ọ bụ onye nke otu ndị sonyere na 1994 (ebe ọ nwetara goolu mbụ Naijiria na Ịkọ Ụwa, ma jiri 3-0 merie Bulgaria, añụrị ya mgbe ọ gbachara, mere ojiri jide ụgbụ goolu na ebe ákwà ghọrọ otu n'ime otutu onyonyo akara ngosi ndị na-eme egwuregwu nke asọmpi [9] ) na Íko Ụwa 1998 nke FIFA .

Na mgbakwunye, Yekini nyeere ndị Super Eagles aka merie Iko Mba Afrịka nke 1994 na Tunisia bụ ebe ọ nọkwa bụrụ onye mbụ na chaatị ndị nyere goolu ma bụrụkwa onye ọkpụkpọ kacha mma n'asọmpi ahụ. [10] Ọ sonyekwara na ọkwa Olympic na Seoul 1988 .

Goolu mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Akara na rịzọlt bu ụzọ depụta akara goolu Naịjirịa, kọlụm akara na-egosi akara mgbe ọ bụla goolu Yekini gachara . [8]

Ndụ nke onwe[dezie | dezie ebe o si]

Yekini lụrụ ụmụ nwanyị atọ. Ọ mụtara umua nwanyị atọ, aha ha bu Yemisi, Omoyemi and Damilola.[11][12]

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

A kọrọ na Yekini rịara ọrịa ogologo oge. N'afọ 2011, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na Naịjirịa malitere ikwuputa ozi gbasara ahụ ike ya dara ada, ma ekwuru na ọ na-arịa ọrịa bipolar, ịda mbà n'obi na ọrịa isi mgbaka ndị ọzọ ekwuputaghị. Ọ nwụrụ na Ibadan na 4 Mee 2012 na obere afọ 48, [2] ndị kwadoro akụkọ a bu ndị otu egwuregwu mba ahụ bụ Mutiu Adepoju na Ike Shorunmu ; [13] e liri ya n'ụlọ ya di na Ira, Kwara State . [14] Ọ nwụnahụrụ nne ya mere agadi, nwanne ya nwoke, ndị nwunye ya na ụmụ ya na ndị ọzọ. [11] [12]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

Ebenleta mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nigerian football legend, Rashidi Yekini, dies at 49; The Times of Nigeria, 4 May 2012
  2. 2.0 2.1 Obituary: Rashidi Yekini (1963–2012). Yahoo Sports (4 May 2012). Archived from the original on 20 February 2014. Retrieved on 5 May 2012.
  3. Nigeria: Legendary footballer, Rashidi Yekini dies at 48; All Africa, 5 May 2012
  4. Portugal – List of Topscorers. RSSSF. Retrieved on 5 April 2017.
  5. African Player of the Year 1993. RSSSF. Retrieved on 31 March 2017.
  6. "El Sporting remonta dos veces", Mundo Deportivo, 30 October 2005. Retrieved on 30 May 2014. (in es)
  7. 7.0 7.1 Yekini set for another return. BBC Sport (21 April 2005). Retrieved on 31 March 2017.
  8. 8.0 8.1 Rashidi Yekini – Goals in International Matches. RSSSF. Retrieved on 6 August 2011.
  9. Nigeria's first-ever World Cup goal & Rashidi Yekini's five most memorable moments. Goal (5 May 2012). Retrieved on 6 May 2012.
  10. "Rashidi Yekini: 'One of the best African players ever to walk this earth'", The Guardian, 21 June 2014. Retrieved on 21 June 2014.
  11. 11.0 11.1 "The agony of Rashidi Yekini's three-year old daughter", Premium Times, 2012. Retrieved on 10 August 2017.
  12. 12.0 12.1 "I want my father's death investigated — Yemisi Yekini", The Punch, 19 July 2016. Retrieved on 10 August 2017.
  13. "Rashidi Yekini dead: Ex-players react", Tribune, 4 May 2012. Retrieved on 5 May 2012.
  14. "An era ends: Rashidi Yekini buried in Kwara as hundreds weep", Premium Times, May 2012. Retrieved on 15 March 2015.