Titilope Gbemisola Akosa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Titilope Gbemisola Akosa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu, climate activist Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of California, Berkeley Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2004 Dezie

Titilope Gbemisola Akosa, nke a maara dị ka Titilope Akosa, (amụrụ na Lagos, Nigeria ) bụ onye Naijiria na -ahụ maka gburugburu ebe obibi, onye na-akwado ikpe ihu igwe, ọkaiwu, ọkachamara n'ihe gbasara nwoke na nwanyị na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na onye na-akwado ikike mmadụ . Ọ bụ onye hiwere ma buru onye isi nchịkwa maka ụlọ ọrụ nkwado na-abụghị nke gọọmentị nke a kpọrọ Center for 21st Century Issues (C21st). Ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ iwu nke Titi Akosa & Co Nigeria. [1] N'afọ 2015, ọ bụ onye nkwuchite ọnụ n'aha ụmụ nwanyị na òtù ndị na-abụghị ndị nwoke na nwanyị na 2015 Paris Climate Treaty na isiokwu 'Towards a Gender Responsive Green weather Fund in Africa'. [2] [3] [4] [5]

Ndụ Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Titilope Ngozi Akosa bu onye a mụrụ ma buru onye tolitere na Lagos State, Naijiria. Mgbe ọ dị obere, ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị na Legọs steeti. N'oge ọ nọ na Legọs steeti, o debanyere aha na mahadum maka agụmakwụkwọ ya mgbe ọ gụchara akwụkwọ sekọndri. Akosa gụsịrị akwụkwọ na Lagos State University, Nigeria ebe ọ nwetara nzere bachelọ nke iwu (LL. B) na Barrister-at-Law (BL) sitere na Ụlọ Akwụkwọ Iwu Naijiria na 1992. Ọ nwetakwara nz,ere Masters na Iwu (LL. M) sitere na Mahadum Lagos Nigeria na 1996. Dịka onye gụsịrị akwụkwọ n'iwu, Titilope Akosa bụ onye na-ahụ maka iwu dabere na ikpe obodo na mpụ na onye na- akwado ikike mmadụ . Ọ sonyere na nkuzi na ọzụzụ dị iche iche nke gụnyere; Associate Membership Course, Chartered Institute of Arbitrators, UK, alaka Naijiria, Lagos, Naijiria na April 2004, nlekota oru na Evaluation Training nke emere na Liberia nke otu Forum For African Women Educationalist (FAWE), Kenya hiwere na Aug 2006. [1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Titilope Akosa malitere dị ka onye ọka iwu na-eme ihe mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ mgbe a nabatara n'otu ndị ọkà iwu Naijiria. Ọ gara n'ihu mepee ụlọ ọrụ iwu nke Titi Akosa & Co ya na ụfọdụ ndị ọrụ ibe ya. Ọ jere ozi dịka onye isi na onye na-enye ndụmọdụ gbasara iwu, gbasara ikike mmadụ na ụmụ nwanyị, okike na mgbanwe ihu igwe. [6] Akosa malitere ọgbakọ nkwado na-abụghị nke gọọmentị maka Climate-Advocacy 'Centre for 21st Century Issues' (C21st) Naijiria wee bụrụ onye nhazi ọrụ ahụ. [2]

O sonyekwara n'ọrụ nke International Alliance of Indigenous Tribal Peoples of the Tropical Forests na mmemme akpọrọ Indigenous Network for Change project (IPNC), ebe ọ na-enyocha ma lekọta usoro GEF na otu ha si metụta ụmụ amaala . [7] Okwuru na nsonye ya na mmemme IPNC emela ka e tinye aha ya na ndekọ nke ndi okachamara n'ihe gbasara umu amaala na West Africa . [7] [1]

Nkwado[dezie | dezie ebe o si]

Titilope Akosa na-arụ ọrụ ugbu a n'ịmalite atụmatụ ọrụ, ịkpata ego na ịhazi ka ihe si aga n'ụlọọrụ ya. Ọ na-arụkwa ọrụ dịka onye na-ahụ maka iwu na onye na-enye ọzụzụ maka otu mba na mba dị iche iche ma na Naijiria, ma na mba ofesi. Nke a bu nke ọ na-eme mmalite mmata na mgbasa ozi gbasara ịbụ nwoke na nwanyị nakwa mgbanwe ihu igwe. Ọ na-akwado ma na-ahazi mmemme n'okpuru mkpọsa nkwado maka ọzụzụ ike maka ndị na-eme mkpebi, ndị otu obodo na ndị ọzọ metụtara ya na nlekọta gburugburu ebe obibi, na okike na mgbanwe ihu igwe. Ọ na-akwado ikike agụmakwụkwọ ụmụaka na Naijiria ọ na-ekwu kwaa ka gọọmentị Naijiria mee ihe niile dị mkpa iji nweta ntọhapụ ụmụ agbọghọ Chibok na Dapchi na-efu efu bụ ndị Boko Haram tọọrọ. [5] [8]

Na 2009, O duuru nyocha na mmekorita ya na International Alliance of Indigenous and Tribal Peoples of the Tropical Forests, Henrich Boell Foundation na ndi otu obodo ndi ozo iji mee nyocha banyere okike na mgbanwe ihu igwe. Emere nke a iji weta ihe akaebe pụtara ìhè n'ịkwalite atụmatụ okike na mgbanwe ihu igwe na Nigeria. [9] [10]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Titilope Ngozi Akosa. Global Issues (21 September 2015). Retrieved on 8 May 2020.
  2. 2.0 2.1 "HLS Speakers List", Digital Journal, 21 December 2015. Retrieved on 8 May 2020.
  3. Does Paris Climate Accord hang Women, Indigenous People. Juan Cole (21 December 2015). Retrieved on 8 May 2020.
  4. "African Peoples to Europe: Don’t Hijack Our Renewable Energy", IDC News, 21 December 2015. Retrieved on 8 May 2020.
  5. 5.0 5.1 "Towards a Gender Responsive Green Climate Fuund in Africa", Climate-Chance.Org, 21 September 2015. Retrieved on 8 May 2020.
  6. "Unique Roadshow Highlights Climate Change in Africa", Digital Journal, 21 December 2014. Retrieved on 8 May 2020.
  7. 7.0 7.1 "Titilope Akosa", The Nation, 31 July 2011. Retrieved on 8 May 2020.
  8. "Girl Child Education Takes a Hit as Students Remain Missin", 24 June 2018. Retrieved on 8 May 2020.
  9. MS Gbemisola Titilope Ngozi Akosa (en-gb). Panafrican Climate Justice Alliance. Retrieved on 2021-09-10.
  10. Nigerian woman activist speaks at UN Paris climate talks (en). Financial Nigeria International Limited. Retrieved on 2021-09-10.