Uzodinma Iweala

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Uzodinma Iweala
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika, Naijiria Dezie
Aha enyereUzodinma Dezie
aha ezinụlọ yaIweala Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya5 Novemba 1982 Dezie
Ebe ọmụmụWashington, D.C. Dezie
ŃnéNgozi Okonjo Iweala Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ, sociologist, physician, filmmaker Dezie
onye were ọrụThe Africa Center Dezie
ebe agụmakwụkwọHarvard University, Columbia University, Columbia University Vagelos College of Physicians and Surgeons, Harvard College, St. Albans School Dezie
so naGlobal Conference 2021 Dezie
Ihe nriteJohn Llewellyn Rhys Prize, Sue Kaufman Prize for First Fiction, Los Angeles Times Book Prize Dezie

Uzodinma Iweala (amụrụ ya na Nọvamba 5, 1982) bụ onye Naịjirịa na Amerịka na-ede akwụkwọ na kwa onye dibịa bekee. [1] Ịdụazị mbụ ya "Beast of no Return" bụ tesis ya na Harvard. Ọ na-egosi nwatakịrị soja na mba Afrịka, a na-akpọghị aha. Akwụkwọ ahụ, nke e bipụtara na 2005 ma bụrụ nke a gbanwere dị ka ihe nkiri na 2015, nke ndị Time Magazine, New York Times, Entertainment Weekly, The Times, [2] na Rolling Stone kwuru maka ya. O mechara wepụta ịdụazị akpọrọ "Speak No Evil", nke e bipụtara n’afọ 2018, nke gosipụtara ndụ nwata nwoke aha ya bụ Niru, bụ onye Naịjirịa na Amerịka nwere mmasị n'ebe nwoke ibe ya no. [3]

Iweala bụ onye isi nke "The Africa Center" na Harlem, New York. [4]

Ezinụlọ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Nwa Dr. Ngozi Okonjo-Iweala, Iweala gara ụlọ akwụkwọ St. Albans dị na Washington DC ma mesịa gaa Harvard Koleji, nke o si na ya gụchaa na AB, magna cum laude, na Asụsụ Bekee na Agụmagụ Amerịka, na 2004. [5] Onye ya na ya bi na Harvard bụ onye ga-emesịa bụrụ onye isi ndị South Bend, Indiana na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị onye isi ala nke 2020 Pete Buttigieg . [6] Mgbe ọ nọ na Harvard, Iweala nwetara Nrite nke ndị Hoopes na Dorothy Hicks Lee maka ọ pụrụ iche Tesis ya na 2004; [7] Nrite nke ndị Eager ọkachasị mma obele akụkọ na 2003; [8] na Nrite Horman maka Ọkachamma na "Creative Writing" na 2003. Ọ gụsịrị akwụkwọ na "Columbia University College of Physicians and Surgeons" na 2011 [9] ma bụrụ onye otu na Radcliffe Institute for Advanced Study na Harvard University. [10]

Ịdụazị[dezie | dezie ebe o si]

Speak No Evil (2018)[dezie | dezie ebe o si]

Na ịdụazị nke abụọ ya , Iweala kọwara ọtụtụ ihe ndị gụnyere agbụrụ, klas, okike, mmekọahụ, mba na n'Ógbè Ndị Juu site na akụkọ nke Niru, onye Naịjịrịa na Amerịka bụ nwata akwụkwọ bi na ndịpụ Washington, DC, nke gwara enyi ya nwoke onye ọcha, aha ya bụ Meredith na ọ na-enwe mmasị n'ebe nwoke ibe ya nọ. Ọ bụ ya kọrọ ụzọ abụọ ịdụazị ya dị atọ, ebe nke ikpeazụ bụ Meredith kọtọpụrụ ya. Niru aghaghị ịmụta ụzọ esi akparịta ụka ya na ọtụtụ ndị mmadụ: ịbụ onye ojii na Amerịka, ịbụ nwa nke ndị si mba Naịjirịa kwabata, Ị bụ onye nkịtị na kwa onye nwere mmasị n'ebe nwoke Ibe ya nọ. Iweala gbakwụnyekwa okwu ndị metụtara ọkpụkperechi, mwezuga ọdịbendị, ahụike uche, afọ njo nke ndị uwe ojii, na ọtụtụ ndị ọzọ, ha niile gbakwụnyere ma na-eme ka ndụ Niru sie ike.

Niru na-abịakwute enyi ya, Meredith, mgbe ọ jụsịrị agụụ mmekọahụ ya. N'ịgbalị inyere ya aka, Meredith budatara ngwa ndị mmekọ dịka Tinder na Grindr na ekwentị Niru ma gbaa ya ume ka ya na otu nwoke aha ya bụ Ryan nwee mmekọrịta. Mgbe Niru chefuru ekwentị ya, nna ya chọtara ya were hụ ozi ederede sitere na Ryan. Nna ya weli iwe site na-iti Niru ihe ma kpụga ya Naịjirịa maka "nwulite mmụọ", dika ọ kpọrọ ya. Iwe nna ya na-ewe Niru maka ntaramahụhụ a n'ihi na ọ kpọrọ ileta Nigeria asị n'ihi enweghị obi iru ala ọ na-enwe ebe ahụ na okpomoku, na enweghị ngwa ọrụ.

Na nkeji nke abụọ nke "Speak No Evil ", anyị na-aga n'ihu na-ahụ mgba chere Niru ihu maka na ọ nwere mmasị n'ebe nwoke Ibe ya nọ na kwa ịbụ onye isi ojii na Amerịka. Mgbe Niru laghachiri Amerịka, ya na ezinụlọ ya gbalịrị ịlaghachi na-ibi ka ha si ebi mbụ dịka a ga-asị na ọ nweghị ihe merenụ. Nna Niru were ekwentị ya, nye ya ekwentị Nokia nke na-enweghị ike ịbanye na ịntanetị , sọọsọ oku ka eji ya akpọ. Achọrọ ka Niru na ụkọchukwu ụka ha bụ Reverend Olumide na-ezukọ kwa izu. Niru gara nnọkọ oriri ebe o nụbigara mmanya ókè, ya na Meredith lụrụ ọgụ, emesịa onye ọbịa a, a na-elekọta ya anya (Damien). Ọ mechara ya na Damien amalite ịnwe mmekọrịta ịhụnanya, ma gbalịa ịghọta uwa n'ohere dị n'etiti ụwa: ụlọ ya na ụlọ akwụkwọ ya, ebe ọ ga-ezobe mmekọrịta nwoke na nwanyị ya, na ohere nke ya na Damien. Niru malitere ịnye onye ọ bụla ohere, gụnyere Meredith. N'oge ya na Damien nwere mkparịta ụka mmekọahụ, Niru kwara ya aka were pụọ, hapụ mmekọrịta ha n'ọnọdụ siri ike. N'oge na-adịghị anya Niru na enyi ya Meredith doro. Niru gbapụrụ n'aka nna ya, ya na Meredith were gaa na klọb, ebe ndị uwe ojii gbagburu ya, ọ were nwụọ. Ọkara nke abụọ nke ịdụazị ahụ, bụ Meredith kọrọ ya, ma gosipụta ọgụ ya, yana mgba nke nna Niru, maka ichefu ọnwụ nwa ya nwoke Niru.

Nrite ederede[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 2006, Iweala nwetere onyinye nrite nke Ọdụm Akụkọ emeghị eme nke "New York Public Library " . [11] Na 2007, akpọrọ ya dịka otu n'ime Granta magazine ndị 20 kacha mma nke ndị Amerịka na-eto eto . [12]

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

mpụga[dezie | dezie ebe o si]