Abdullahi Mohammed

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abdullahi Mohammed
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAbdullahi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1939 Dezie
Ebe ọmụmụIlorin Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụndị agha Dezie
Ọkwá o jiChief of Staff to the President Dezie
ebe agụmakwụkwọRoyal Military Academy Sandhurst Dezie
ọkwa aghaizugbe Dezie

Onye isi Abdullahi Mohammed, onye isi ọrụ ya onye isi ala

Abdullahi Mohammed bụ onye isi ndị agha Naijiria lara ezumike nká, onye jere ozi dị ka onye isi ndị ọrụ nke ndị isi ala Olusegun Obasanjo na Umaru Musa Yar'Adua site na n'afọ 1999 ruo n'afọ 2008; Onye ndụmọdụ nchekwa mba nke General Abdusalami Abubakar site na 1998 ruo 1999; Onye isi nchịkwa nke National Security Organization site na n'afọ 1976 ruo n'afọ 1979; na Gọvanọ nke Benue-Plateau State, Nigeria site na July 1975 ruo February 1976 n'oge ọchịchị ndị agha nke General Murtala Mohammed.[1]

Afọ Murtala na Obasanjo[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Julaị n'afọ 1975, Mohammed bụ onye isi nke ndị agha, ma guzobe ma mezuo atụmatụ ọchịchị nke Naijiria n'afọ 1975 ya na ndị isi ndị ọzọ gụnyere Shehu Musa Yar'Adua, Joseph Nanven Garba, Muhammadu Buhari na Ibrahim Taiwo iji wepụ General Yakubu Gowon, mgbe nke ahụ gasịrị ha nyefere ike na General Murtala Muhammed dị ka onye isi ala.[2]

Ozugbo nnupụisi ahụ gasịrị, a họpụtara ya dịka Gọvanọ nke Benue Plateau State.[3][4]

Mgbe Olusegun Obasanjo weghaara ikike, ọ opugachri Mohammed na Machị n'afọ 1976, wee họpụta ya na Kansụl Ndị Agha Kasị Elu dị ka Director General nke Nchebe Naịjirịa na ọrụ ọzọ maka nchekwa ndị uwe ojii.[5] E mechara mee ya onye nduzi nke ndị agha nzuzo.

N'oge Republic nke Abụọ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe General Olusegun Obasanjo nyefere ndị nkịtị a họpụtara ahọpụta na mmalite nke Republic nke Abụọ nke Naijiria na n'ofa 1979, Muhammed lara ezumike nká n'ọrụ agha. Ọ banyere na azụmaahịa onwe onye, bụrụ onye isi nchịkwa nke Atoto Press na Ilorin.[6]

Onye ndụmọdụ nchekwa mba[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1998, General Abdusalami Abubakar onye weghaara dịka onye isi ala mgbe ọnwụ nke General Sani Abacha, wepụrụ Ismaila Gwarzo ma họpụta Mohammed dị ka onye ndụmọdụ nchekwa mba.

N'oge Republic nke Anọ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1999, Onye isi ala Olusegun Obasanjo mere Mohammed onye isi ndị ọrụ ya, Onye isi ala Umaru Yar'Adua họpụtara Mohammed ọzọ dị ka Onye isi ndị ọrụ mgbe ọ malitere ọrụ na ọwa Mee 29, n'afọ 2007. Mohammed gbara arụkwaghịm na 2 June 2008.[6]

Edemsibe[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nigerian States. WorldStatesmen. Archived from the original on 28 May 2010. Retrieved on 2010-05-15.
  2. Nowa Omoigui. Military Rebellion of July 29, 1975: The coup against Gowon - Part 9. Dawodu. Retrieved on 2010-05-15.
  3. Ebenezer Babatope (7 November 2004). Nigeria's Quest for Stability: The Challenges Ahead (3). Vanguard. Retrieved on 2010-05-15.
  4. Max Siollun (2009). Oil, politics and violence: Nigeria's military coup culture (1966-1976). Algora Publishing. ISBN 0-87586-708-1. 
  5. S. K. Panter-Brick, Simone K. Panter-Brick (1978). Soldiers and oil: the political transformation of Nigeria. Routledge. ISBN 0-7146-3098-5. 
  6. 6.0 6.1 Juliana Taiwo (2008-05-30). Yar’Adua’s Chief of Staff, Mohammed, Resigns. ThisDay). Retrieved on 2010-05-15.