Adenike Akinsemolu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adenike Akinsemolu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAdenike Dezie
aha ezinụlọ yaAkínṣẹ̀mólú Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Ebe ọmụmụȮra Ondo Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic, social entrepreneur, lecturer, Odee akwụkwọ, environmentalist Dezie
ụdị ọrụ yateaching, Odee akwụkwọ, advocacy, lecturer, author Dezie
onye were ọrụMahadum Obafemi Awolowo, Clinton Foundation Dezie
ebe agụmakwụkwọBabcock University, Mahadum Obafemi Awolowo, Mahadum Federal nke Nkà na ụzụ, Akure Dezie
ogo mmụtanzere masters, doctorate, Doctor of Philosophy Dezie
Ebe obibiNaijiria Dezie
webụsaịtịhttps://greeninstitute.ng Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Adenike Adebukola Akinsemolu bụ nwafọ Naijiria bụ onye nkwado na onye na-akwuchitere gburugburu ebe obibi, onye nkuzi, onye edemede na onye ọchụnta ego i ji na-elekọta mmadụ . Ọ bụ onye nkuzi na mahadum nke Obafemi Awolowo (Adeyemi College Campus). A maara Adenike dịka otu n’ime ndị ọkachamara na-ahụ maka nchekwa gburugburu ebe obibi.


Adenike bụ onye guzobere Green Campus Initiative, ụlọ akwụkwọ izizi nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka gburugburu ebe obibi na Naijiria, na Green Institute, na-enyocha ma na-akwado agụmakwụkwọ.

Ọrụ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Adenike na Ondo Steeti, na Naijiria. O nwere nzere Masta na Dọktọreti n'ihe gbasara Maịkrobayọlọji nke gburugburu ebe obibi site na mahadum nke Babcock naFederal University of Technology, nakwazị diplọmanke Postgraduate n'ihe gbasara agụmakwụkwọ na Mahadum nke Obafemi Awolowo . Ya na Clinton Foundation rụkọrọ ọrụ na New York ma mechaa hiwe Green Campus Initiative, nke bụ onye otu n'òtù United Nations .

Akinsemolu bu onye otu Royal Commonwealth Society na onye otu nke National Steering Committee of Sustainable Energy Practitioners Association of Nigeria n’okpuru mịnịstrị n'ahụ maka ọkụ. Ọ bụ onye nrite nke Robert Bosch Stiftung Young Researcher. N'ọnwa Ọktọba nke afọ 2015, o ritere ihe nrita nke Nigeria Energy Awards for Energy Efficiency and Advocacy.

Ọ kwadoro ka e tinye ''green education and sustainability'' na usoro mmụta agụmakwụkwọ nke Naịjirịa. [1] N’afọ 2015, ndị Sahara Reporters mere ihe nkiri na Green Journey ya.

Akinsemolu na-arụ ọrụ dika onye na-ahụ maka mmụta na ihe ọmụmụ na United Nations Sustainable Development Solutions Network, nakwazi Scientific Committee Member of the 6th Annual International Conference on Sustainable Development (ICSD), na Earth Institute, Mahadum nke Columbia . [2] N'afọ 2020, Akinsemolu bipụtara akwụkwọ bụ The Principles of Green and Sustainability Science, nke na-enyocha okwu nkwado na Afrịka. [3]

Green Institute[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2015, Akinsemolu guzobere Green Campus Initiative (GCI), ụlọ ọrụ izizi gbasara nchekwa gburugburu ebe obibi na Naijiria. A matara usoro nhazi ya n'agba nke anọ nke Green Campuses Conference nke afọ 2015 a na-eme kwa afọ na Mahadum nke Western Cape dị na South Africa tinyekwara nrite ihe onyinye maka mmemme green campus. GCI bụ onye otu UN Sustainable Development Network, nwere ihe karịrị ndị nnọchi anya 500, ma zụọkwa karịa ụmụ akwụkwọ 5,500 gafee ihe ruru mahadum 28 dị na mba dị iche iche. N'afọ 2017, Green Campus Initiative tugharịrị bụrụ Green Institute, ụlọ ọrụ na-ahụ maka nkwado ọzụzụ na nnyocha , nakwazi ụlọ ọrụ na-elekọta ndị mmadụ . Prọfesọ Damilola S. Olawuyi ghọrọ onye isi oche mbụ nke ụlọ akwụkwọ ahụ. Ụlọ akwụkwọ ahụ na-enye agụmakwụkwọ na nkwado na iwulite azụmaahịa mmekọrịta mmadụ na ibe ya, n'usoro izute United Nations Sustainable Development Goals . Otu a bụ ụlọ akwụkwọ agụmakwụkwọ izizi na Naịjirịa kwụrụ ụgwọ ụlọ akwụkwọ kọleji site na nchịkọta mmemme i kpofu ahịhịa, nke a kpọrọ "Trash for education" na-ebinye ụmụ akwụkwọ ego maka ikpo ahịhịa a nakọtara ha, nke gọọmentị steeti na ụlọ ọrụ ndị ọzọ na-azụ ka e mechara.

Okwu metụtara ọha na eze na nkwado[dezie | dezie ebe o si]

Adenike a kwalitela agụmakwụkwọ nke nwatakịrị nwanyị ma guzobe 'Girl Prize', usoro agụmakwụkwọ n'efu na ndụmọdụ. [4] [5] O tinyere aka na ọrụ enyemaka nke Clinton Foundation ka ala ọma jiji nke afọ 2004 mechara na Indian Ocean ,nakwa Hurricane Katrina na New Orleans . [6]

Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]

  • The role of microorganisms in achieving the sustainable development goals
  • The vulnerability of women to climate change in coastal regions of Nigeria: A case of the Ilaje community in Ondo State

Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

  • The Principles of Green and Sustainability Science, Springer, 2020 [7]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Akintomide, Yemi. "Nigeria: Renewable Energy - Adeyemi College to Adopt Solar Power On Campus", AllAfrica.com, 2015-06-22.
  2. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  3. Who We Are (en-US).
  4. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  5. Go Green!.
  6. Susty Person of The Week - Adenike Akinsemolu (en-US).
  7. The Principles of Green and Sustainability Science (in en).