Bambitious

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bambitious
film
ụdịromantic comedy Dezie
mba osiNaijiria Dezie
Mmalite asụsụ ihe ngosiBekee Dezie
afọ/ụbọchị mbipụta2014 Dezie
Onye nduziOkechukwu Oku Dezie

Bambitious bụ ihe nkiri ihunanya nke Naịjirịa nke afọ 2014 nke Okechukwu Oku duziri, nke Daniel K Daniel na Belinda Effah mere . [1] O mere ihe ngosi mbụ ya na Jenesis Cinema, Enugu State ma bụrụkwa nke a na-ekwu na ọ bụ ihe nkiri Nollywood izizi emere na ndịda ọwụwa anyanwụ Naijiria . Pete Edochie, Zack Orji na John Okafor nọ na mmemme ahụ. [2]

Ndị Sonyere n'ihe nkiri a[dezie | dezie ebe o si]

  • Daniel K Daniel dị ka Jerry
  • Belinda Effah dị ka Bambi
  • Ebele Okaro dị ka Dr. Ese
  • Bucci Franklin dị ka Frank
  • Hekka Hedet dị ka Funmi Coker

Akụkọ ndịnaya[dezie | dezie ebe o si]

Ihe nkiri malitere ebe mmadụ abụọ ndị hụrụ ọnwa ha n'anya, Bambi ( Belinda Effah ) na Frank ( Bucci Franklin ) na ọdọ mmiri. Jerry nwere mmasị karịa n'akwụkwọ ya, ma Bambi nọ na ọdọ mmiri. Nke a kpasuru ya iwe ma ha kpebie ịla. Mgbe ọ nọ n'ebe obibi Frank, Bambi nwere mkpasụ iwe na Frank enweghị ike ịkpata ego nyere mmasị ya. Ọtụtụ ụbọchị ka e mesịrị, mgbe obere esemokwu gasịrị, Ndị a hụrụ onwe ha n'anya kpebiri ịga ụzọ dị iche iche maka nke Frank nwere ịta onwe ya ụ̀ta n'ikpeazụ . Mgbe obere oge gasịrị, Bambi malitere ịhụ Jerry ( Daniel K. Daniel )n'anya, onye bara ọgaranya sitere na ezinụlọ a ma ama. N'ịmata ịhụnanya ọhụrụ ọ chọtara, Frank kpebiri imebi ya mgbe ọ chọpụtara na ọ na-atụ anya nwa. Bambi kwụrụ ya puku naira iri abụọ na iri ise ka o kpuchie ihe dịịrị n'etiti ha mana ọ ga-akọwa ya dịka enyi nwoke enyi ya. Jerry na Frank na-emekọrịta nke ọma nke na Jerry kpebiri iji Frank dị ka nwoke nsonazụ ya n'oge agbamakwụkwọ ya. Onyr bụbu enyi nwanyị Jerry bụ, Funmi Coker (Hekka Hedet), onye ka nwere mmasị na Jerry gbalịrị iji Frank laghachi n'ihunaya ya na Jerry. Nne Jerry, Dọkịta Ese (Ebere Okaro), bụ onye megidere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye wepụrụ Obi na Bambi mgbe ọ chọpụtara na ọ dị ime nwa Frank wee rafuo Jerry ka ya na ya dina.

nnabata[dezie | dezie ebe o si]

Ihe nkiri ahụ nwetara nlebanya na-adịghị mma site n'aka talkafricanmovies.com, saịtị nyocha nke na-akwado ihe nkiri ma ọ bụ "wepụ" ya. Ọ katọrọ ọdịdị "atụmatụ" na "nchịkọta" nke ihe nkiri ahụ. Ọ katọkwara nkọwa nke Bambi dị ka onye"oké ọchịchọ", mgbe ọ na-enweghị ọrụ ma na-eche naanị banyere ịlụ nwoke bara ọgaranya. Ọ katọrọ usoro akụkọ na ozi ihe nkiri ahụ na-achọ ịzi. Ọ tụrụ aro "Golddiggerlicious"ya bụ onye chọrọ ọgwụgwọ ego n'ike dị ka aha kwesịrị ekwesị maka ihe nkiri ahụ. Ọ kọwakwara n'akụkọ ahụ dị “dị larịị” mana toro ikwe ike nke ihe nkiri ahụ. O mechiri nyocha ya site n'iwepụ ihe nkiri ahụ, nke pụtara na akwadoghị ya. [3]

Oluwatoyosi Agbaje maka tns.ng toro usoro akuko a"nke kwụ ọtọ ruo n'isi", ma nwee obi uto ịhụ Frank ka ọ na-arụ ọrụ n'abughị na Tinsel na Ay's Crib . Agbanyeghị, o gosipụtara enweghị ezi okwu n'ụzọ Bambi siri chọpụta afọ ime ya, ọkachasị n'ihi na ọ gaghị ụlọ ọgwụ. O mechiri nyocha ya site n'ikwu na "ihe nkiri ahụ dị mma". [4]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. Izuzu (February 12, 2014). Daniel K Daniel, Belinda Effah, Selebobo attend Enugu premiere.
  2. admin (2014). Bambitious: First Ever Movie to be Premiered In Enugu.
  3. admin (April 12, 2015). Bambitious.
  4. ODEJIMI (July 6, 2015). Cinema Review: Belinda Effah Shows More Ambition On "Bambitious". Archived from the original on October 6, 2015. Retrieved on January 4, 2017.