Chioma Toplis

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chioma Toplis
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereChioma Dezie
aha ezinụlọ yaToplis Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Novemba 1972 Dezie
Ebe ọmụmụUmuahia Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Chioma Elizabeth Toplis bụ nwaafọ Naijiria na-eme ihe nkiri na ụlọ ọrụ ihe nkiri Naijiria (nke a kpọrọ Nollywood ). O mere oru mbu ya n'afọ 2004 n'ime ihe nkiri Stolen Bible tinyere Kate Henshaw mana ọ buụrụ onye a ma ama mgbe ọ putara n’ime ihe nkiri afọ 2005 a kpọrọ Trinity na otutu ndi ozo a ma ama na Naijiria [1]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Toplis, onye aha bekee bu Elizabeth, bu onye obodo Umuahia,dị n'Abia Steeti, na mpaghara ndida Naijiria . Ya na onye Nollywood ọzọ na-eme ihe nkiri na onye isi oche gara aga nke Actors Guild nke Naijiria, bụ Ejike Asiegbu bụ ụmụnna. [2] Site n'afọ 1979 ruo n'afọ 1985, ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị ya n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ: St Michaels Primary School Umuahia, Orji Town Primary School Owerri, Umuhu Central School, Umuahia na 67 Infantry Battalion Primary School Faulks Road, Aba . Site n'afọ 1985 ruo n'afọ 1990, ọ gụrụ akwụkwọ na Ohuhu Community Secondary School Amaogwugwu, Umuahia. Mgbe ọ hapụrụ Naijiria were bie ọtụtụ afọ na Lọndọn, ọ malitere na Valentine High School ịmụ asụsụ Bekee were mesịa debanye aha na Barking and Dagenham College n'afọ 2003 iji mụọ maka Social Healthcare.

Ndụ ezinụlọ[dezie | dezie ebe o si]

Chioma Toplis a lụọla di ma nwee ụmụ atọ. [3] O nwere ulo na Lọndọn, United Kingdom na Victoria Island, ebe di elu na Legos, Naijiria . [4] O nwere mmasi n'ọrụ ebere ma sonye n'ọrụ Home For The Elderly[5]

Ndụ azụmahịa[dezie | dezie ebe o si]

Chioma Toplis bụkwa nwanyị na-azụ ahịa nwere mmasi na akwa na ihe ịchọ mma, ma nwee ọtụtụ ụlọ ahịa na Legos na Lọndọn.

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Toplis malitere ọrụ ya mgbe ọ pụtara n'ihe nkiri nke afọ 2004 gara nke ọma bụ Stolen Bible . Ngosipụta ya na ihe nkiri n'afọ 2005 bụTrinity ya na Hanks Anuku, Val Nwigwe na onye na-eme ihe nkiri Oge Okoye, natara nlezianya dị mma, a na-ahụkwa ya dị ka mmepe ụzọ Toplis n'ime nnukwu oge na <i>Nollywood</i> . [6] [7]

Chioma Toplis, Rita Edochie na Patience Ozokwor na ogige nhazi ihe nkiri Abuja Top Ladies, n'afọ 2006.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Chioma Toplis on IMDb

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Actress Chioma Toplis To Femi Fani-Kayode: I'm Laughing Out Lout At Your Stupidity. News2.onlinenigeria.com. Retrieved on 2013-09-15.
  2. Supremacy tussle: Emeka Ike, Ejike Asiegbu in war of words - Peoples Daily Newspaper of Nigeria | Peoples Daily Newspaper of Nigeria. Peoplesdailyng.com (2013-08-30). Retrieved on 2013-09-15.
  3. I have been accused of using black magic (Juju) on my husband – Chioma Toplis | INFORMATION NIGERIA. Informationng.com (2013-06-09). Retrieved on 2013-09-15.
  4. Chioma Toplis living large | The Nation. Thenationonlineng.net (2013-03-16). Retrieved on 2013-09-15.
  5. Chioma Toplis celebrates 40th birthday with the elderly | My Daily Newswatch. Mydailynewswatchng.com. Retrieved on 2013-09-15.
  6. IMDb page:Trinity. www.imdb.com. Retrieved on 2013-09-20.
  7. TRINITY.