Ezenwa-Ohaeto

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ezenwa-Ohaeto
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Maachị 1958 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya25 Ọktoba 2005 Dezie
Ebe ọ nwụrụCambridge Dezie
ihe kpatara ọnwụliver cancer Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akapidgin Naịjirịa, Bekee Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria, Mahadum nke Benin Dezie

Ezenwa-Ohaeto (1958), bụ onye Naijiria na-ede uri, onye na-ede akụkọ mkpirikpi na onye nkuzi.[1][2] [3]Ọ bụ otu n'ime ndị Naijiria mbụ bipụtara uri e dere na pidgin English.[3] Ọ nwụrụ na mba Cambridge n'afọ 2005.[4]

Ndụ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ezenwa-Ohaeto na 31 Maachị 1958 n'aka Michael Ogbonnaya Ohaeto na Rebecca Ohaeto n'Ife Ezinihite Mbaise na mpaghara gọọmentị nke Imo Steeti.[5] Ọ malitere agụmakwụkwọ praịmarị ya na St. Augustine Grammar School, Nkwerre n'afọ 1971.[5] Ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ya n'afọ 1975 na nka na sayensị ebe ọ nwetara asambodo Grade One.[5] Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum[3] Naịjirịa n'okpuru nkuzi nke onye edemede Chinua Achebe na onye nkatọ Donatus Nwoga site n'afọ 1971 ruo 1979.[5] O mechara gụsịa akwụkwọ ma nweta nzere Bachelor of Arts na nsọpụrụ na Bekee.[5] O nwetara Masters of Arts site na UNN na agụmakwụkwọ site na gọọmentị steeti Imo n'afọ 1982.[5] N'afọ 1991, e nyere ya nzere PhD n'ide akwụkwọ site na Mahadum Benin .[3][5]

Ezenwa-Ohaeto malitere ọrụ nkuzi ya n'afọ 1980 dị ka onye enyemaka nkuzi na Mahadum Ahmadu Bello .[5] Site n'afọ 1982 ruo 1992 ọ kụziri na Anambra State College of Education, Awka dị ka onye nkuzi.[5] Ọ kụziri na Alvan Ikoku Federal College of Education dị ka osote prọfesọ site n'afọ 1992 ruo 1998 na dị ka onye nkuzi dị elu na Mahadum Nnamdi Azikiwe site n'afọ 1998 ruo mgbe ọ nwụrụ na 2005.[5][5] Ezenwa-Ohaeto lụrụ Ngozi onye ya na ya nwere ụmụ anọ.

Ọ bụ nna Chinua Ezenwa-Ohaeto.[6]

Onyinye na nkwanye ùgwù[dezie | dezie ebe o si]

  • Ihe nrite BBC Arts na Africa Poetry
  • Association of Nigerian Authors/Cadbury Poetry Award
  • Fellow, African Studies Centre, Mahadum Cambridge

Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

    • Chants of a Minstrel
    • I Wan Bi President
    • Songs of a Traveller
    • Chinua Achebe: A Biography
    • The Voice of the Night Masquerade
    • "If to Say I bi Soja"
    • "Winging Words"

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nwakanma (2007). "Ezenwa-Ohaeto: Chants and the Minstrel". Dialectical Anthropology 31 (1/3): 65–72. Retrieved on 23 May 2022. 
  2. Of Minstrelsy and Masks: The Legacy of Ezenwa-Ohaeto in Nigerian Writing.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Ezenwa - Ohaeto. Poetry Foundation. Retrieved on 24 May 2022. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "PoF" defined multiple times with different content
  4. Nigeria: Ezenwa Ohaeto (1958-2005). This Day (8 November 2005). Retrieved on 24 May 2022.
  5. 5.00 5.01 5.02 5.03 5.04 5.05 5.06 5.07 5.08 5.09 5.10 Emmanuel K. et al., 2012, Pg. 322
  6. Chika (2022). Chinua Ezenwa-Ohaeto: The Shape of Dreams and Memories. AfroCritik. Retrieved on 31 October 2022.