Frank Ogbuewu
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Frank |
ụbọchị ọmụmụ ya | 12 Disemba 1953 |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | diplomat, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | ambassador of Nigeria to Greece, Minister of Culture and Tourism |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | All Progressives Grand Alliance, People's Democratic Party |
agbụrụ | Ndị Igbo |
Onye nnọchi anya Frank Nchita Ogbuewu bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria na onye bụbu Minista nke Ọdịbendị na Njem maka mba ahụ. N'ọnwa asaa, afọ puku abụọ na atọ (Julaị afọ 2003), gọọmentị Obasanjo kwadoro nhọpụta ya dị ka minista. Frank Ogbuewu bụ onye a na-edekọ dịka onye minista kachasị ogologo oge nke ozi ọdịbendị na njem nleta na ọchịchị Obasanjo. Tupu a họpụta ya dị ka minista nke ọdịbendị na njem nleta, ọ rụrụ ọrụ dị Ka onye nnọchi anya Naịjirịa na Gris[1] ma bụrụkwa onye isi oche otu oge sit n'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu na anọ ruo na otu puku, narị iteolu na iri iteolu n'isii (1994 - 1996) nke kansụl gọọmentị mpaghara ya, Ikwo. Nhọpụta ya dị ka onyeisi oche (onye isi obodo) nke Ikwo Local Gọọmentị mere ka ọ banye n'ìhè ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ nọgidere na-akwado mmepe ndị ntorobịa na steeti ya. Ogbuewu onye ruo n'ọnwa asatọ n'afọ puku abụọ n'iri (Ọgọstụ afọ 2010) bụ onye otu People's Democratic Party (PDP) na-achị chọrọ tiketi gọvanọ nke pati ya n"afọ puku abụọ na asaa (2007) megide gọvọnọ n-arụ ọrụ nke Ebonyi Steetị, Chief Martin Elechi mana ọ meriri. O mechara gbaa ọsọ maka ọkwa onye isi oche nke PDP mana o nweghị ike ịga nke ọma. N'abalị iri abụọ na asatọ n'ọnwa asatọ, afọ puku abụọ n'iri (28 Ọgọstụ n'afọ 2010), na - alụm di na nwunye ọdịnala nke nwa ya nwanyị nke okenye, Nnenna Ogbuewu, onye nnọchi anya ahụ kwupụtara ebumnuche ya ịsọ mpi ọzọ, maka ọfịs gọvanọ na steeti ya nke Ebonyi mana n "oge a", nʼokpuru otu dị iche. Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ họọrọ, All Progressives Grand Alliance ka a mara ya na ọnwa iteolu, afọ puku abụọ na iri (Septemba 2010). Na abalị iri na abụọ, n'ọnwa mbụ afọ puku abụọ na iri n'otu (Jenụwarị 12, 2011), ndị All Progressives Grand Alliance họpụtara onye nnọchi anya Ogbuewu na ngụkọta nke otu puku, narị asatọ na iri ise n'abụọ (1852) iji nọchite anya pati ahụ na ntuli aka gọvanọ na abalị iri na isii n'ọnwa anọ n'afọ puku abụọ na iri n'otu (Eprel 16, 2011).
Akụkọ ezinụlọ dị mkpirikpi
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ onye nnọchi anya Frank Ogbuewu na ọnwa iri na abụọ, n'afọ otu puku, narị iteolu na iri ise na atọ (Disemba 12, 1953), na Ikwo Local Government Area nke Ebonyi Steetị, Nigeria, ọ bụkwa nwa ikpeazụ nke nne ya Oginyi Nchita.[2] Nna ya bụ onye na-agbaso ọdịnala nke na'ịgwọ ahịhịa n'ala yana ịbụ onye ịchụ nta a ma ama. Onye nwere otu mgbe, onye nnọchi anya, Ogbuewu nwere ụmụ asaa site na nwunye abụọ. Ụmụ nwoke anọ mbụ (ụmụ nwoke atọ na otu nwa nwanyị) sitere na nwunye mbụ ya, Mrs. Eunice Ebin Ogbuewu Eunice, onye obodo Etung Local Government Area na Cross River Steetị lụrụ Ogbuewu n'ụzọ iwu kwadoro ruo afọ iri abụọ na abụọ karịa (22+) tupu ha kewaa. A hapụrụ Ogbuewu nwunye nke abụọ, Mrs. Rebecca Ogbuewu, onye Ezza LGA onye ya na ya nwere ụmụ atọ.
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[dezie | dezie ebe o si]Mgbalị Ogbuewu banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bịara dị ka ihe ijuanya nye ma ezinụlọ ya ma ndị enyi ya. Onye bụbu onye ọrụ Mbata na Ọpụpụ na Naịjirịa, Ogbuewu lara ezumike nká n'ọrụ dịka Onye enyemaka Suprịtendentị nke mbata na ọpụpụ. Mgbe ọ lara ezumike nká, o debara aha ya dị ka onye otu National Republican Convention (N. R. C) iji mee ka ọ gbaa ọsọ maka ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbalị mbụ ya bụ ọkwa onye isi oche nke gọọmentị ime obodo na mpaghara gọọmenti ime ụlọ ya. Ogbuewu mere mkpọsa ya n'ebe ọ bụla nke LGA ya mana mbọ ya kwụsịrị n'oge na-adịghị anya dịka usoro ntuli aka nke ọchịchị ndị agha oge ahụ bụ General Sani Abacha gbaghaara na afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu n'atọ (1993). N'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu n'anọ (1994), a họpụtara Ogbuewu dị ka onyeisi oche, Kọmitii Nlekọta maka mpaghara Gọọmentị Obodo ya, Ikwo. Ọchịchị ahụ were afọ abụọ. Mgbe ọnwụ nke General Sani Abacha na nhọpụta nke Janal Abdulsalami Abubakar (rtd) dị ka onye isi ndị agha nke Naịjirịa, ndebanye aha nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọhụrụ malitere ma hazie ka e mee ntuli aka na Naijiria maka inyefe ndị nkịtị. Ogbuewu debanyere aha ya dị ka onye otu All People's Party( APP) iji sọọ mpi na ntuli aka gọvanọ mana Chief Ogbonnaya Onu, onye bụ onyeisi oche nke pati ahụ, meriri ya na primaries. Ogbuewu mechara sonye na People Democratic Party (PDP) ma nye aka na nhọpụta Dr. Sam Egwu dị ka gọvanọ mbụ nke steeti ahụ. N'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu n'iteolu (1999), A họpụtara Ogbuewu maka ọkwa nnọchite anya nke ndị sineti kwadoro. E nyere ya ọrụ imeghe ụlọ ọrụ nnọchite anya Naịjirịa na Gris nke mechiri kemgbe obere oge. Ogbuewu jere ozi dị ka onye nnọchi anya Naijiria na Gris site na afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu na iteolu ruo n'afọ puku abụọ na atọ (1999 ruo 2003).
N'afọ puku abụọ na atọ (2003), gọọmentị Obasanjo kpọghachiri ya na Naijiria ka ọ bụrụ onye isi nke ngalaba ọdịbendị na njem nleta. N'afọ puku abụọ na isii (2006), onye nnọchi anya Ogbuewu gbara arụkwaghịm n'ọkwa ya dị ka minista ọdịbendị na njem nleta nke Naijiria iji sọọ mpi ntuli aka gọvanọ nke afọ puku abụọ na asaa (2007) na Ebonyi Steeti n'okpuru nchebe nke People Democratic Party (PDP). Ntuli aka gọvanọ nke nwere ihe dị ka mmadụ iri na atọ (13) PDP gụnyere gọvọnọ n'ọkwa, Chief Martin Elechi mechara bụrụ asọmpi n'etiti mmadụ abụọ. E dekọrọ na Ogbuewu bụ naanị onye na-azọ ọkwa onye jụrụ ịpụ n'ala ma nabata naanị Chief Elechi na primaries e mere n'ámá egwuregwu obodo, Abakaliki. Ogbuewu meriri na primaries ka o nwetara ihe karịrị vootu narị ise na iri asatọ (580) ma e jiri ya tụnyere vootu ndị nnọchiteanya Elechi karịrị puku abụọ (2000). N'afọ puku abụọ na asatọ (2008), mgbe mgbalị na-enweghị isi maka gọvanọ, onye nnọchi anya Ogbuewu gosipụtara mmasị na ọnọdụ onye isi oche nke Peoples Democratic Party nke e kenyere na steeti ndịda ọwụwa anyanwụ nke Abia, Imo, Ebonyi, Anambra na Enugu. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama dị ka Emmanuel Iwuanyanwu, onye bụbu onye isi oche Sịnetị Pius Anyim na onye gọvanọ nke Ebonyi Steetị, Dr. Sam Egwu gosikwara mmasị n'ọkwa ahụ. Steeti Ebonyi yiri ka ọ bụ steeti kacha mma na steeti ise ndịda ọwụwa anyanwụ niile, mana Gọvanọ steeti ahụ enweghị mmasị na onye ọ bụla n'ime ndị na-azọ ọkwa steeti ya.
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Ndepụta ndị si Ebonyi Steeti
Ebemsidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ World Factbook - Greece: Government. CIA. www.cia.gov (2007-03-15). Retrieved on 2007-04-07.
- ↑ Hamilton, Janice. Nigeria in Pictures. Page 71