Hadiza Aliyu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Hadiza Aliyu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoHadiza Aliyu Dezie
Aha ọmụmụHadiza Aliyu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Jụn 1989 Dezie
Ebe ọmụmụLibreville Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa, Asụsụ Fula Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, Arabic, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee Dezie
Ebe obibiKaduna Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2009 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
webụsaịtịhttp://www.hadizaaliyu.com Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Hadiza Aliyu amaara dị ka Hadiza Gabon bụ onye amụrụ na abalị mbụ nke ọnwa Jun[1] ma bụrụ Omee na onye mmepụta ihe nkiri nke Naịjirịa. Ọ na-emeihe nkiri ma na Awusa ma na nke English . Hadiza na-eje ozi dị ka onye nnọchi anya ụlọ ọrụ MTN Naịjirịa na ụlọ ọrụ Indomie noodles, a kpọrọ Hadiza aha nwanyị kachasị mma na 2013 Best of Nollywood Awards, ọ meriela akara ngosi abụọ nke Kannywood / MTN n'afọ 2014. Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka onye guzobere HAG Foundation. 

Mmalite ya na ezinụlọ ya[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ ya na Libreville, Republic of Gabon, [2] Hadiza Aliyu bụ nwa nwanyị Malam Aliyu onye bụ onye okenye steeti. N’akụkụ nna ya, Hadiza bụ onye agbụrụ Gabon, n’akụkụ nne ya, ọ bụ onye agbụrụ Fulani sitere na Steeti Adamawa, Nigeria . [3] Hadiza Aliyu gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na ụlọ akwụkwọ sekọndrị na obodo amụrụ ya [4] ebe ọ dere nyocha A-Level ya na ebumnuche ịbụ onye ọka iwu ma mesịa họrọ Iwu dị ka usoro mmụta kachasị amasị ya. Ọ malitere afọ mahadum dị ka nwa akwụkwọ, mana ọ kwụsịrị ịga akwụkwọ n'ihi nsogbu ụfọdụ na-esochi ọmụmụ ya. Emechiri agụmakwụkwọ ya mgbe ahụ ma nke ahụ nyere ya ohere ịga mmemme diplọma n'asụsụ French ma mesịa bụrụ onye nkuzi asụsụ French na ụlọ akwụkwọ nzuzo. 


Hadiza Aliyu sonyeere Kannywood n’oge na-adịghị anya ọ si Gabon bata Adamawa State, Nigeria . O si Adamawa ba na Kaduna kwalite inwe mmasi sonye na ulo oru ihe nkiri nke kannywood na nwanne nna ya. O nwere ohere izute Ali Nuhu wee chọọ enyemaka ya iji bido ya dịka onye na-eme ihe nkiri. [5] Hadiza bidoro pụta na 2009, ebe a tụbara ya na Artabu, ọ banyere n'ụlọ ọrụ ihe nkiri nke kannywood dịka otu n'ime ụmụnwaanyị ndị na-eduga site na enyemaka na ntuziaka nke Ali Nuhu na Aminu Shariff . [6]

Hadiza kpebiri isonyere Nollywood na 2017, na-agbaso nzọụkwụ Ali Nuhu, Sani Musa Danja, Yakubu Muhammed, Maryam Booth na Rahama Sadau . [7] E gosipụtara ya na ihe nkiri Nollywood mbụ ya tinyere Mike Ezuruonye, Mike Angel na Emmanuella n’ime ihe nkiri akpọrọ Lagos Real Fake Life . [8] [9]

Ihe nkiri ọ no[dezie | dezie ebe o si]

Ndepụta ihe nkiri nke Hadiza Aliyu [10]

Year Title Role Genre
Daina Kuka Actress Drama
Farar Saka Actress Drama
Fataken Dare Actress Drama
Kolo Actress Drama
Mukaddari Actress Drama
Sakayya Actress Drama
Umarnin Uwa Actress Drama
Ziyadat Actress Drama
2009 Artabu Actress Drama
2010 Wasila Actress Drama
2010 Umarnin Uwa Actress Drama
2012 Aisha Humaira Actress Drama
2012 'Yar Maye Actress Drama
2012 Badi Ba Rai Actress Drama
2012 Akirizzaman Actress Drama
2012 Dare Daya Actress Drama
2012 Wata Tafi Wata Actress Drama
2013 Da Kai Zan Gana Actress Drama
2013 Haske Actress Drama
2013 Ban Sani Ba Actress Drama
2014 Mai Dalilin Aure Actress Drama
2014 Daga Ni Sai Ke Actress Drama
2014 Ali Yaga Ali Actress Drama
2014 Basaja Actress Drama
2014 Uba Da 'Da Actress Drama
2014 Indon Kauye Actress Comedy/Drama
2014 Ba'asi Actress Drama
2014 Jarumta Actress Drama
2017 Gida da waje Actress Drama
2017 Ciki Da Raino Actress Comedy/Drama
2019 Hawwa Kulu Actress Drama
2019 Wakili Actress Drama
2019 Dan Birnin Actress Drama
2019 Gidan Badamasi Actress Comedy/Drama

Ùgwù na Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

Hadiza Aliyu natara ọtụtụ onyinye na nkwanye ugwu gụnyere 2013 Best of Nollywood Awards na 2nd Kannywood / MTN Awards na 2014. N’ịkwanyere ya ugwu dị egwu dịka onye na-eme ihe nkiri, Hadiza nwetara ihe nrite nkwanye ùgwù na 2013 site n’aka onye bụbu Gọvanọ Kano Steeti, Dr Rabiu Musa Kwankwaso.Enyekwara ya ihe nrite site na African Hollywood Awards dị ka Nwanyị Kachasị Mma [11]

Ndepụta nturu ugo nke Hadiza Aliyu nwetara [12]

Year Award Category Film Result
2013 Kwankwasiyya Award Recognition Award Kwankwasiyya Award Merie
2013 2013 Best of Nollywood Awards Best Actress (Hausa) Babban Zaure Merie
2014 City People Entertainment Awards Best Actress (Hausa) Babban Zaure Ahọpụtara
2014 2nd Kannywood/MTN Awards Best Actress of the Year(Jury Choice) Daga Ni Sai Ke Merie
2015 Kannywood AWA 24 Film & Merit Award Best Supporting Actress Ali Yaga Ali Merie
2016 African Hollywood Awards Best Actress African Films in Hausa Language Merie
2017 Arewa Night Award Recognition Award Merie
2017 2017 Best of Kannywood Award Best Actress (Hausa) Ahọpụtara

Nkwanye ùgwù[dezie | dezie ebe o si]

Ndepụta nkwanye ugwu nke Hadiza Aliyu natara

Afọ Ugwu usoro mpaghara
2016 Kano State Senior Secondary Schools Management Board Certificate of Appreciation[13] Educational Support
2016 Statup Kano Certificate of Appreciation[14] Empowerment Support
2016 Billycare Charity Fundation Recognition Award Philanthropy
2019 Hausa Students Association of Nigeria (BUK) Recognition Award Educational Support

Onye nnọchiteanya[dezie | dezie ebe o si]

N’ọnwa Disemba nke afọ 2018, ụlọ nrụpụta NASCON Allied Plc kpolitere Hadiza Aliyu, onye enyemaka nke otu Dangote Group dịka onye nnọchi anya Dangote Classic Seasoning n’oge ọrụ mmalite nke ngwaahịa a na Kano [15] [16] [17]

Ọrụ ebere[dezie | dezie ebe o si]

Na 2016, Hadiza guzobere otu ọrụ ebere nke akpọrọ HAG Foundation [18] Nke Ebumnuche ya bụ iji meziwanye ndụ ndị mmadụ site n'inye enyemaka na ngalaba agụmakwụkwọ na ahụike yana nchekwa nri. Ọ bụ otu n'ime ndị na-eme ihe nkiri mbụ n'akụkọ gbasara Kannywood nyere ụdị enyemaka ahụ. 

N’ọnwa Machị 2016, ọ gara n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ n’obodo Kano Steeti ebe o nyere onyinye nri, akwa na ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya nke ndị bi n’ogige ahụ bụ ndị gbasara site na ogbugbu ndị mmadụ na mgbago ugwu Naịjirịa. [19]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Hadiza Aliyu.
  2. All Africa. Nigeria: I Had to Learn Hausa to Feature in Kannywood - Hadiza Gabon. Amina Alhassan and Mulikat Mukaila. Retrieved on 28 December 2013.
  3. I want to settle down – Gabon - Blueprint. Archived from the original on 2015-04-02. Retrieved on 2015-03-10.
  4. Gabon Official. Archived from the original on 2015-03-24. Retrieved on 2020-11-30.
  5. Gold for Kannywood’s shinning star, Hadiza Gabon, from Queensland (12 November 2016). Archived from the original on 24 October 2019. Retrieved on 24 October 2019.
  6. Hadiza Gabon - HausaFilms.tv.
  7. Kannywood: Hadiza Gabon features in first Nollywood movie - Premium Times Nigeria (21 September 2017). Retrieved on 24 October 2019.
  8. Famous Kannywood Actress Hadiza Aliyu Gabon, Debuts In Nollywood Movie (21 September 2017). Retrieved on 24 October 2019.
  9. The trailer for Mike Ezuruonye's new movie ‘Lagos Real Fake Life’ isn't quite there yet » YNaija (10 October 2018). Retrieved on 24 October 2019.
  10. Gabon Official. Archived from the original on 2015-03-24. Retrieved on 2020-11-30.
  11. Hadiza Gabon, Usman Uzee honoured at African Hollywood Awards – Best Nigeria News. Archived from the original on 23 July 2018. Retrieved on 6 November 2016.
  12. Gabon Official. Archived from the original on 2015-03-24. Retrieved on 2020-11-30.
  13. Hadiza Aliyu Gabon on Instagram: Alhamdulillah ✌🏼️👌👌🏻. Instagram. Hadiza Aliyu Gabon. Retrieved on 10 December 2016.
  14. Was honored to be part of Startup Kano Women Conference.. Women empowerment gives me so much joy. Alhamdulillah.. Twitter. Hadiza Aliyu. Retrieved on 16 December 2016.
  15. "NASCON introduces Dangote classic seasoning into Kano market".
  16. NASCON launches New Dangote Classic Seasoning Cubes (en).
  17. Brand Ambassador Market Tour. Archived from the original on 2020-08-10. Retrieved on 2020-11-30.
  18. HAG Foundation - Committed to Serving Humanity. Archived from the original on 2017-02-02. Retrieved on 2020-11-30.
  19. Hadiza Gabon enlivens IDP camp.