Henry Adefope

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Henry Adefope
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereHenry Dezie
aha ezinụlọ yaAdefope Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Maachị 1926 Dezie
Ebe ọmụmụKaduna Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya11 Maachị 2012 Dezie
Ebe ọ nwụrụLagos Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụdiplomat, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị agha, physician Dezie
Ọkwá o jiMinister of Foreign Affairs, Nigerian Minister of Labour, president, vice president Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Glasgow, CMS Grammar School, Lagos Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
ọkwa aghamajor general of tank forces Dezie
Onye òtù nkeInternational Olympic Committee, Ndị agha Naịjirịa Dezie
Ihe nriteSilver Olympic Order Dezie

Henry Edmund Olufemi Adefope (amụrụ n'abalị iri na ise nke ọnwa Machị afọ 1926 ruo abalị iri na otu nke ọnwa Machị nke afọ 2012) bụ onye isi ndị agha Naijiria nke jere ozi dị ka Minista nke Mmekọrịta Mba Ọzọ na dịka onye otu Kọmitii Olympic mba ụwa site n'afọ 1985 ruo 2006 na onye otu nsọpụrụ nke Kọmitii Olimpik mba ụwa kemgbe 2007.[1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Henry Adefope n'abalị iri na ise nke ọnwa Machị afọ 1926 na Kaduna, Naịjirịa nye Alice Adefope. Ọ gụrụ akwụkwọ na CMS Grammar School, Lagos na Mahadum Glasgow,ọ gụsịrị akwụkwọ na mmụta gburugburu ọgwụ na ahụike na 1952. Ọ rụrụ ọrụ dị ka dọkịta site n'afọ 1953 ruo 1963 o wee banye n'otu ndị agha Naịjirịa n'afọ 1963.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ rịgooro ruo n'ọkwa Major General ma jee ozi dị ka onye ntuziaka nke ozi gbasara ọgwụ. Site n'afọ 1975 ruo 1978 ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista nke Ọrụ ma site n'afọ 1978 ruo 1979 ọ rụrụ ọrụ dịka Minista nke Mmekọrịta Mba Ọzọ, ọfịs abụọ nke ụlọ ọrụ n'okpuru nchịkwa ndị agha nke General Olusegun Obasanjo.

Adefope jere ozi n'ọkwá dịgasị iche iche na nchịkwa egwuregwu, gụnyere okwu dị ka onye isi oche nke Kọmitii Olympic nke Naịjirịa site n'afọ 1967 ruo 1976 na dịka osote onye isi oche ya nke egwuregwu mba nke Commonwealth site n'afọ 1974 ruo 1982. N'afọ 1985, a họpụtara ya na IOC. Mgbe ọ nọ na IOC, ọ bụ onye otu kọmitii nke họọrọ obodo ndị na-akwado maka egwuregwu afọ 2000 na 2004 Summer Olympik. E nyochara ya, mana ewepụrụ ya n'ihe gbasara ihe 2002 Winter Olympic bid.[2] Ọ ghọrọ onye otu IOC na 2006.

Ezinụlọ[dezie | dezie ebe o si]

Adefope bụ nna, nna nna na nna nna nna. Ụmụ ya gụnyere Femi Adefope, Dotun Okojie, Folake Nedd, Ronke Eso, Seyi Adefope.[3]

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Henry Adefope nwụrụ n'abalị iri na otu nke ọnwa Machị afọ 2012 mgbe ọ dị afọ iri asatọ na ise. ụbọchị anọ tupu ụbọchị ọmụmụ ya nke afọ iri asatọ na isii.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Former Nigerian IOC member, Adefope, dies at 86. Afriquejet.com. Archived from the original on 2012-07-30. Retrieved on 2012-03-13.
  2. Commission Recommends Censure to IOC Members
  3. Admin. Veterans mourn General Adefope (Rtd). Vanguard. Retrieved on 25 January 2019.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị
onye nyefere ya ọrụ

Joseph Nanyen Garba

Minista nke mmekọrịta Naijiria na mba ụwa

1978-1979

onye onyefere ọrụ

Ishaya Audu