Jide Obi
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1962 |
| Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Asụsụ Yoruba, Nigerian Pidgin |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye egwu |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Nigeria, gọọmentị kọleji Umuahia |
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]Nne ya mụrụ Jide Obi na England site na onye ọka iwu Naijiria nke Lincoln Inn England, o bukwa onye nkuzi.
N'ọgwụgwụ afọ 1970 ọ gụrụ akwụkwọ gbasara iwu n'Enugwu campus nke mahadum Naịjirịa, ebe ya na umu nwakwụkwọ ibe ya bụ Chris Okotie ghọrọ enyi. [1] [2]
N'ịgbaso ọganihu Okotie, na mmalite 1980s ọ wepụtara album mbụ ya bụ "Front Page News" [3] n'okpuru akara Tabansi Records . [1] Ihe egwu ndị ọzọ gụnyere igbu m n'ịhụnanya, na akụkọ ihu ihu . Ọ orukwara ọtụtụ ihe gosikwarw na redio na telivishọn Naijiria.
Na Nọvemba 1981, akara ndekọ ya, Tabansi Records, nyere ya ihe nrite diski ọla edo mbụ ya na National Theater, Surulere . Afọ abụọ ka e mesịrị, ọ gara eja nlegharị anya Eastern Nigeria na Bunny Mack nke Sierra Leone, nke ndị Comrades nke Enugu, Nigeria kwadoro ofuma.
O nweela urodu ndị egwu na-akwado ya, tinyere onye egwu Guyanese Eddy Grant 's Coach House Band, Dukes nke Freetown Sierra Leone, na Ndịozi nke Aba. Ọ bụ onye obodo Barbados bụ Bill Campbell mepụtara albums ya Front Page News na Kill Me With Love . Ex- Osibisa na Funkees onye egwu Jake Solo mere na ndekọ abụọ ahụ. N'afọ 1984, Obi dere isiokwu egwu ihe nkiri ụmụaka NTA Tales By Moonlight .
Na Dizzy K Falola, Chris Okotie, na Felix Liberty ọ kpaliri ụlọ ọrụ egwu na-apụta nke Nigeria. [4] Ọ guru agwu ozi ọma ọgbara ọhụrụ, [2] akọwara dị ka pop/blues. [5] A hụrụ ya dị ka akụkụ nke otu ndị na-agba mbọ maka mgbanwe na imegide ahaghị nhata na Naijiria. [6]
A maara Jide Obi ka ọ na-enye ndị nta akụkọ ajụjụ ọnụ na-akatọ akụkụ okpukpe. Ihe atụ kacha pụta ìhè mekwere na 1989 na 1990, mgbe o kwura okpukpe dị ka ihe na-akpatakarị nsogbu. Akụkọ a mere mkpuchi nke akwụkwọ akụkọ National Concord nke onye ijeri Naijiria bụ MKO Abiola .
N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ha lale Jide Obi ka ọ na-ebi na Britain na United States, n’agbanyeghị na ọ bụ onye a na-adịghị ahụkebe n’ihu agbakwo.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 Obiora, Alfred (4 March 2002). "Nigeria's Presidency - Pastor Okotie to the Rescue?". NigeriaWorld. Retrieved 23 May 2009.
- 1 2 Timothy-Asobele, S. J. (2002). Historical trends of Nigerian indigenous and contemporary music. Rothmed International.
- ↑ Nworah, Uche (30 January 2007). "Nigeria: Cheating Our Way to Success". Global Politician. Archived from the original on 3 January 2010. Retrieved 23 May 2009.
- ↑ Adeniji, Olayiwola (26 April 2002). "For Dizzy K, a Centre of Joy". Africa News Service.
- ↑ Froelich, Hildegard (2000). Education of the Professional Musician. Routledge. p. 55. ISBN 978-90-5755-130-7.
- ↑ Ihonvbere, Julius Omozuanvbo (1998). Illusions of Power. Africa World Press. pp. 136. ISBN 978-0-86543-642-8.