Mansur Dan Ali

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mansur Dan Ali
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Ọgọọst 1959 Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, Arabic, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụndị agha Dezie
Ọkwá o jiMinister of Defence of Nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọỤlọ Akwụkwọ Nchebe Naijiria, Bayero University Kano Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
ọkwa aghaizugbe Dezie

Mansur Muhammad Dan Ali (amụrụ n'abalị iri abụọ na ise n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1959) bụ onye agha Naịjirịa lara ezumike nká na onye bụbu Minista na-ahụ maka nchekwa nke Naịjirị nke Onye isi ala Muhammadu Buhari họpụtara na Nọvemba n'afọ 2015.[1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Dan-Ali na Ọgọst 25, na afọ 1959 na Zamfara Steeti. Ọ gara Birnin Magaji Town Primary School afọ (1966 -1972) maka agụmakwụkwọ elementrị ya na Government Secondary School, Shinkafi (1972-1977) maka agụmakmakwụkwọ sekọndrị ya.[2] Ọ natara Higher National Diploma (HND) ya na Photogrammetric na Surveying site na Kaduna Polytechnic (1977-1982) ma nwee nzere masta na Public Policy and Administration (MPPA) site na Mahadum Bayero Kano (2004-2005) na nzere masta n'ihe ọmụmụ nchekwa site na Machịkwa Bangladesh (2009).[3]

Ọrụ ndị agha[dezie | dezie ebe o si]

E nyere Dan Ali ọrụ dị ka onye isi nke abụọ na ndị agha Naịjirịa na afọ 1984 site na Short Service Commission na Nigerian Defence Academy.[3] Dan-Ali jere ozi n'ọchịchị na ikike ndị ọrụ dị iche iche, ụfọdụ n'ime ha gụnyere ịhazi ndị agha Naijiria na-akwado United Nations Africa Hybrid Mission na Sudan. Dan Ali nọ na Directing Staff nke Armed Forces Command and Staff College, Jaji site na afọ 2003 -2005 ma bụrụ Chief Instructor (CI) na Nigerian Defence Academy na afọ 2010. Ọ bụkwa onye na-anọchite anya onye nduzi ọzụzụ agha tupu e zigara ya na Ngalaba Nhazi nke Ministry of Defence dị ka osote onye nduzi. Ọ lara ezumike nká na ndị agha Naijiria n'abalị iri atọ n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2013.[3]

Minista na-ahụ maka nchekwa[dezie | dezie ebe o si]

Mansur Dan Ali (nke abụọ site n'aka ekpe) na General Tukur Yusuf Buratai na Gọvanọ Kashim Shettima (nke atọ na nke anọ site n' aka ekpe) na Sambisa Forest, na afọ 2017.

Ndị Senate Naịjirịa kwadoro Dan Ali dị ka Minista na-ahụ maka nchekwa n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2015 ma bụrụ Minista na Nọvemba n'afọ 2015.[4][1]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Odunsi. Change team unveiled: See full list of Buhari’s Ministers and their portfolios. Daily Post Nigeria. Retrieved on 8 February 2016.
  2. Who Is General Mohammad Mansur Dan Ali (RTD)?. Nigerian FM. Archived from the original on 6 October 2017. Retrieved on 8 February 2016.
  3. 3.0 3.1 3.2 BRIG. GEN MANSUR DAN-ALI (RTD) - HONOURABLE MINISTER. Ministry of Defence of Nigeria. Archived from the original on 5 May 2016. Retrieved on 8 February 2016.
  4. Onyedi. Senate confirms Buhari’s second ministerial list. The Nation. Retrieved on 8 February 2016.