Muhammad Bala Shagari

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Muhammad Bala Shagari
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya17 Maachị 1949 Dezie
Ebe ọmụmụShagari Dezie
ebe agụmakwụkwọBarewa College, Ụlọ Akwụkwọ Nchebe Naijiria Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
Muhammad Bala Shagari
Sarkin Mafaran Shagari
District Head of Shagari
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Member of the FCT Judicial Service Committee
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Member of the Constituent Assembly Yabo Constituency
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Personal details
Born (1949-03-17) 17 Maachị 1949 (age 75)
Shagari, Sokoto State, Nigeria
ChildrenBello Bala Shagari
ParentsShehu Shagari
Alma materBarewa College
South Gloucestershire and Stroud College
Nigerian Defence Academy
Military service
Allegiance Nigeria
Branch/service Naijiria Army
Years of service1975Àtụ:Spaced ndash1984
RankCaptain

Muhammad Bala Shagari (amụrụ na n'ubọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị afọ 1949) bụ onye isi ndị agha lara ezumike nka na Onye-isi-ọchịchị nke mpaghara gọọmentị obodo Shagari na Sokoto Steeti, Naijiria. O ji aha ọdịnala bụ Sarkin Mafara nke Shagari. [1]

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

Shagari bụ ọkpara onye isi ala gara aga bụ Shehu Shagari nke nwunye ya bụ Hajiya Amina mụrụ. [2] [3] Amuru ya na obodo Shagari na Sokoto Steeti n’afo 1949. Ọ gara ụlọ akwụkwọ dị elu bụ Barewa kọleji, Zaria wee gaa Ụlọ mmụta Nchebe Naịjirịa n'afọ 1975 ebe ọ bụ onye otu mgbe n'ezie nke iri na asatọ. Mgbe agha nke ọnwa Decemba nke afọ 1983 na Naijiria nke General Muhammadu Buhari duziri nke wepụrụ nna ya, ejidere ya obere oge ma mesịa jiri ike laa ya ezumike nká site na ndị agha Naijiria na-enweghị mmejọ na ọkwa nke Captain . [4] [5]

Ọrụ emechaa[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ lara ezumike nká n'ọrụ ndị agha n'afọ 1984, Muhammad Bala Shagari guzobere Shag Náijiria Limited, ma mechaa chọpụta Ụlo ọrụ Hamadah Shipping ya na Alhaji Aliko Dangote na Sen. Usman Albishir, tinyere ndị ọzọ, n'afọ 1989. Ọ bụ onyeisi oche nke Ụlo ọrụ Hamadah Shipping n'oge ahụ.

Tupu Mba Naijiria nke atọ, ọ bụ onye otu ọgbakọ omebe iwu na-anọchite anya mpaghara Yabo, nke gụnyere gọọmentị obodo Yabo, Shagari na Tambuwal n'afọ 1988. Agbanyeghị naMba Naijiria nke atọ abịaghị na mmezu n'ihi nkagbu nke ntuli aka onye isi ala nke Naijiria n'afọ 1993. Emechara, họpụta ya dịka onye ntụzi-aka nke Nkwenye ndị ọrụ ugbo Naijiria na ụlọ akụ mmepe ime obodo (NACB) n'afọ 1993.

Ọ bụkwa onye isi oche nke mbadamba eletrik Ime obodo nke Sokoto Steeti na kansụl nke egwuregwu na Sokoto Steeti n'okpuru ọchịchị ndị agha gawa n'ihu na Steeti. n'afọ 1997, mgbe Shagari mechara bụrụ Gọọmenti Obodo, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye Isi nchịkwa mpaghara nke Shagari site n’aka Sultan Muhammadu Maccido . N’afọ 2009, ọ bụrụ onye otu Kọmitii na-ahụ maka ikpe na Federal Capital Territory. [6] Ugbu a ọ bụ onye otu ndị nlekọta nke PZ Cusons Foundation, onye otu ego ntụkwasị obi nke mmụta na Sokoto steeti, na onye otu otu ndị gọvanọ nke Aduvie International Schools.

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Muhammad Bala Shagari lụrụ nwanyị ma nwee ụmụ asatọ. Otu n’ime ha bụ onye ndu ndị ntorobịa bụ Bello Bala Shagari . Ya onwe ya bu ọkpara nwa onye isi ala Shehu Shagari .

Mallam Shagari bụ onye egwuregwu Polo na-anụ ọkụ n’obi na otu onye isi otu egwuregwu Polo nke Zaria. Ọ bụ onye mmeri nke Iko Georgian ama ama nke otu Polo nke Kaduna. Dịka onye hụrụ egwuregwu n'anya, ọ na-egwuri egwu ise, ọ bụkwa onye isi oche nke Fives Federation na Naijiria .

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Leave Shagari Out Of Mudslinging, Says Son", The Guardian Newspaper Nigeria.
  2. Shagari (2001). Shehu Shagari : beckoned to serve.. Ibadan: Heinemann Educational Books, 187. ISBN 9781299320. 
  3. Shagari. "Buhari honest, incorruptible leader, says Shagari".
  4. Shagari (2001). Shehu Shagari : beckoned to serve.. Ibadan: Heinemann Educational Books, 485. ISBN 9781299320. 
  5. says. "How Buhari, IBB forced me out of military – Capt. Bala Shagari, eldest son of late President Shagari", The Sun Nigeria, 12 January 2019.
  6. Muhammad. SENATE OF THE FEDERAL REPUBLIC OF NIGERIA ORDER PAPER. /www.nassnig.org. NATIONAL ASSEMBLY PRESS, ABUJA.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]