Muhammadu Dikko Yusufu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Muhammadu Dikko Yusufu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Novemba 1931 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1 Eprel 2015 Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Muhammadu Dikko Yusufu A makwaara dị ka MD Yusufu ma ọ bụ MD Yusuf (Ụbọchị iri nke ọnwa Novemba, afọ 1931 - ụbọchị mbụ nke ọnwa April afọ 2015) bụ onye uwe ojii Naijiria, Onye isi nyocha nke Ndị uwe ojii Naịjirịa , onye na-ejere ọha ozi na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. [1] Yusufu gara ụlọ akwụkwọ dị elu na Ụlọ akwụkwọ Nchịkwa, Zaria n'afọ 1954 na Mahadum Oxford ebe a zụrụ ya dịka onye isi nchịkwa.

Yusufu malitere ọrụ na Ụlọ ọrụ Ikike nwa-afọ Katsina na-eje ozi dị ka onye enyemaka Onyeisi mpaghara na mpaghara Ilorin site n'afọ 1949 ruo afọ 1954. Yusufu rigoro n'ọkwa onye isi nyocha ndị uweojii na Naịjirịa, ọkwa ọ nọrọ site n'afọ 1975 rue afọ 1979 n'oge ọchịchị ndị ọchịagha General Murtala Mohammed na Olusegun Obasanjo . A họpụtara ya dịka onye isi oche nke Ụlọ ọrụ ikuku mmanụ ala emere ka ọ ghọrọ mmiri nke Naịjirịa (NLNG) n'afọ 1994. [2] N'afọ 1998, o debara aha ya maka Ije ọchịchị onye kwuo uche ya na ikpe ziri ezi dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị N'afọ 1999 na 2003, ọ dọrọ ndọrọndọrọ ọchịchị dị ka onye isi ala na ndoro ndoro ochichi n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya. Na ntuli aka ndi ochichi obodo nke ọnwa Desemba afọ 1998, otu ndọrọndọrọ ọchịchị a biara nke ano wee merie oche ndi Kansụl iri abuo n'otu nke mba na onye isi oche nke Warri na Delta Steeti, Hadejia na Jigawa Steeti na Bama na Borno.

Yusufu bụ onye isi oche nke LNG Naịjirịa n'afọ 1994, mgbe ndị ọrụ nke otu KBR n'okpuru ụlọ ọrụ Halliburton na-arịọ maka nkwekọrịta iji wuo ụlọ mbupụ LNG na asọmpi ha na ụlọ ọrụ US Bechtel . N'akwụkwọ ozi e degaara Yusufu n'ọnwa Septemba nke afọ 1994, Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ ala Don Etiebet kwuru na ndị NLNG "etinyela ezigbo nkasi obi n'iguzosi ike n'ezi ihe nke onyinye nkwekọrịta a na-echere". O lere anya na e nweela mgbe e mebiri izu nzuzo, nke ahụ nwere ike ịbara ndị na-elekọta KBR uru. [2]

N’oge a na-enyocha nyocha gbasara ebubo inara aka azụ KBR, onye ndụmọdụ bi na London, Maazị Jeffrey Tesler kwuru na ya enyela Muhammadu Dikko Yusufu ụfọdụ ego n'ụdị nke ikwughachi ụgwọ. [3] Ego a gbapụtara $ puku ir asaa mgbe Yusufu gara London n'afọ 1998 ma ọ bụ afọ 1999. [4] Agbalịrị ime ka onye isi ala US Dick Cheney tinye aka na mkparị nrụrụ aka, nke gụnyere ihe karịrị $ nde Otu narị na iri asatọ nke aka azụ na nnọchite nke ụlọ ọrụ nke Halliburton duziri. [5]

Ọ sonyeere Kansụl mba Naịjirịa na Cameroon(NCNC) n'afọ 1950, yana Otu ọganihu nke ndị ugwu (NEPU) n'afo 1951, mana ọ hapụrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ọ banyere na Ije ozi mpaghara ugwu. Na mba nke abụọ mgbe ọ lara ezumike nká site na ndị uwe ojii ọ ghọrọ onye otu People's Redemption Party . Yusufu gosipụtara mmasị ịzọ ọkwa ntuli aka nke Onye isi ala n'okpuru Grassroots Democratic Movement na Naịjirịa n'oge mgbanwe gaa ochichi onye kwuo uche ya nke General Sani Abacha kwalitere n'afọ 1997-1998. Otu ndọrọndọrọ ọchịchị nwere nghazi aka ekpe. [6] N'afọ 2000, ọ ghọrọ onye isi oche nke Arewa Consultative Forum, otu nzukọ ọdịnala na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ndu ugwu . [7]

Mgbe e mechara ntuli aka ọnwa Eprel nke afọ 2003, ma Muhammadu Buhari nke ANPP na Yusufu, onye zọrọ ọkwa onye isi ala nke Movement for Democracy and Justice (MDJ), kwụ jọrọ mmeri ntuli aka nke President Obasanjo. [8] Ka osila dị, n'onwa June nke afọ 2003, Yusufu kwuru na ndị e meriri na ntuli aka bụ ndị adịghị njikere ịla ụlọ ikpe kwesịrị ịnabata mmeri ha n'ezi okwukwe. [9]

N’ọnwa Nọvemba nke afọ 2003, Yusufu kwuru na enyemaka onye isi ala Olusegun Obasanjo nyere onyeisiala Liberia a chụpụrụ, Charles Taylor enweghị ike ịgbachitere ya site na ikpe nkwụmọtọ ma ọ bụ nke na-enweghị isi, ya mere na a ga-achụpụ ya. [10]

MD Yusufu nwụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel afọ 2015 na Abuja. [11]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Okoi-Uyouyo. M.D. Yusufu: beyond the cop. Profiles & Biographies, 2005. ISBN 9783424254. 
  2. 2.0 2.1 PATRICK SMITH AND LUCY KOMISAR (25 May 2009). Halliburton & Nigeria's missing millions. Business Day. Archived from the original on 2011-07-08. Retrieved on 2009-11-24.
  3. Olusegun Adeniyi. The Alleged NLNG $180 Million Bribe Scandal: The Unanswered Question.... ThisDay. Archived from the original on 2006-07-01. Retrieved on 2009-11-24.
  4. Russell Gold, Charles Fleming (Sep 29, 2004). Out of Africa: In Halliburton Nigeria Inquiry, A Search for Bribes to a Dictator. Wall Street Journal. Retrieved on 2009-11-26.
  5. Stephen Foley (4 September 2008). Cheney colleague admits bribery in Halliburton oil deals. The Independent. Retrieved on 2009-11-24.
  6. Kalu Okwara (1 October 2009). Nigeria At 49 - Any Hope for Party Democracy?. Daily Champion. Retrieved on 2009-11-24.
  7. Steve Nwosu and Tokunbo Adedoja (2001-09-01). One North, Different People. ThisDay. Archived from the original on 2011-03-09. Retrieved on 2010-04-02.
  8. Kunle Ajayi. Security Forces, Electoral Conduct and the 2003 General Elections in Nigeria. University of Ado-Ekiti. Retrieved on 2009-11-24.
  9. Acceptance Speech by Bashorun J. K. RANDLE, FCA. The Institute of Chartered Accountants of Nigeria (June 3, 2003). Archived from the original on October 20, 2008. Retrieved on 2009-11-25.
  10. Habeeb I. Pindiga (November 10, 2003). Asylum for Taylor an impeachable offence - MD Yusufu. Daily Trust. Retrieved on 2009-11-25.
  11. Former Inspector General Of Police, MD Yusuf Is Dead. Leadership Nigeria. Archived from the original on 2 April 2015. Retrieved on 2 April 2015.