Nnamdi Kanu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nnamdi Kanu
Nnamdi Kanu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Septemba 1967 Dezie
Ebe ọmụmụSteeti Abia Dezie
Ọrụ ọ na-arụpolitical activist Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria, gọọmentị kọleji Umuahia Dezie
Nnamdi Kanu

Nnamdi Okwu Kanu (a mụrụ ya na ụbọchị ịrị abụọ na ise nke ọnwa Septemba na 1967) [1] ) ọ bụ onye Naịjiria mụrụ n'ala bekee[2] Ọ bụ onye ndu ndị Indigenous People of Biafra (IPOB). Ebumnuche ndị IPOB bụ imepụta obodo kwụụrụ onwe ya maka ndị bi na mpaghara ọdịda anyanwụ mpaghara nke Nigeria site na ntụgharị aka. [3] Kanu bụ onye isi ụlọ ọrụ redio a ala ndị ọcha edebanyere aha ya bụ Radio Biafra . [4] Ejidere Kanu maka ebubo aghụghọ na Lagos dị na Nigeria na ka ọnwa Ọktọba dị na mkpụrụ ụbọchị iri na anọ na afo 2015 wee jidere ya ihe karịrị otu afọ, n'agbanyeghị iwu dị iche iche ụlọ ikpe nyere maka ịhapụ ya. Mgbe ọ nọ n'ụlọ ikpe, Kanu na-eyi uwe mkpuchi na mkpuchi isi ndị Juu mgbe niile. O kwuru na ụlọ ikpe, na ya "kwenyere n'okpukpe ndị Juu " ma na-ele onwe ya anya dị ka onye Juu na oge ụfọdụ edugawo ndị ya na Biafra n'ekpere dị iche iche nke ndị Juu na nkwenye okpukpe. [5] Ka ọnwa Eprel dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na asatọ nke afọ 2017, a tọhapụrụ Kanu n'ụlọ mkpọrọ na ịgba akwụkwọ. [6]

Ndụ Mbido[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Kanu na Isiama Afara Ukwu, Umuahia, Abia State, Republic of Biafra . Aha nna ya bu Eze Israel Okwu Kanu (JP) [7] na nne ya, Ugoeze Nnenne Kanu. Ọ gara ụlọ akwụkwọ a na-akpọpPaịmarị Avenue wee gaa Gọọmenti College nke dị na Umuahia maka agụmakwụkwọ sekọndrị ya. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum nke Nigeria, Nsukka wee kwaga ala bekee bụ UK tupu ya gụchaa akwụkwọ. [6]

Mmeme[dezie | dezie ebe o si]

Mmata[dezie | dezie ebe o si]

Na u

Na ụbọchị nke ise nke Septemba na afo 2015, Nnamdi Kanu bụ onye ọbịa bịara nzụkọ World Igbo Congress nke emere na Los Angeles, ebe ọ gwara ndị na-ege ya ntị "anyị chọrọ egbe ma chọkwue mgbọ". [8] N'ajụjụ ọnụ ya na Junu na afo 2017, Kanu kọwara ihe ọ na-ekwu na arịrịọ ọ rịọrọ maka ịnata ihe onyinye mgbọ na egbe na aka ndị otu ndị ala anyị nọ America maka ichekwa ndị Igbo na mwakpo ndị agha ndị Fulani na-achị ehi na a wakpo ndị Igbo, ha ka na -eme ya ụgbụ a na ala Biafra. [9]

Nnupụisi obodo[dezie | dezie ebe o si]

Nkwupụta mkpọpụta Kanu bụ ntinye nke nnupụ isi obodo iji kwagide ụlọ ọ na-achọ nnwere onwe nke ndị ya. N’ igbasa ozi dị iche iche, Nnamdi Kanu kwupụtara etu nnabata ya Martin Luther King Jr. na ụdị ndị isi obodo Mahatma Gandhi ga-esi bute “mweghachi nke Biafra”. N'ajụjụ ọnụ a gbara ya na Newsweek, Nnamdi Kanu kwupụtara nkwenye ya na nkuzi Martin Luther King Jr na Mahatma Gandhi, "Enwere m olileanya na ihe anyị na-achọ nwere ike mezuo n'udo. Abụ m onye na-akwado iguzogide oke. Gandhi na Martin Luther King nwalere ya wee rụpụta ezigbo ihe, ya bụ o gịnị kpatara na ọ gaghị arụ ọrụ n ’ọnọdụ anyị?”

Tupu nhoputa ndi isi nke afọ 2019, IPOB yiri egwu ijide nhoputa ndi ndọrọ ndọrọ ochichi. Site na ihe onye ndu IPOB, Nnamdi Kanu kwuru na, "Ọ ga abụ nwa nwoke bụ usoro dị iche iche. Ọ bụ nnupụ isi obodo, mmegide ọnụ, ọ bụ ngosipụta nke iwe anyị nke Naịjiria na ihe ọ na-anọchite anya ya ". Ndi ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo Naijiria katọrọ nguzo ya maka ịhapụ itu ntuli aka. N'uhuruchi nke ntuli aka ahụ, Nnamdi Kanu buliri ọkwa nwatakịrị ahụ ma gbaa ndị nwe ala ume ka ha sonyere na ntuli aka ahụ ọ kọwapụtara ọnọdụ ya dị ka "bịanyere aka na ya, kaa ya akara ma nyefee ya" [10] . A nabatara mgbanwe ya na ebe di iche iche dika njikere igha ntị ihe ndi ozo kwuru.

Mkpọrọ[dezie | dezie ebe o si]

Njide[dezie | dezie ebe o si]

Na ụbọchị ịrị na asatọ nke ọnwa Ọktọba na afo 2015, akụkọ kọrọ na ndị uwe ojii nzuzo Nigeria jidere Kanu na Lagos State site na Ngalaba Ọrụ (DSS). [11] [12] Kanu a gwala ndị ọkaiwu ya na n’abalị iri na anọ n’ọnwa Ọktọba afọ 2015, ndị ọrụ gọọmentị Federal Security nke Nigeria, ndị ọrụ nchekwa steeti (SSS) jidere ya n’ime ụlọ họtel ya na Golden Tulip Essential Hotel Ikeja, Lagos Steeti . [13] Ndị ọka iwu na mkparịta ụka mgbasa ozi kwuru n'etiti ụbọchị ịrị na anọ na iri na asaa nke ọnwa Ọktoba na afo 2015 na ha amaghị ka onye nke ha ejidere mere wee ruo na ụbọchị nke iri na asatọ nke onwa Ọktọba na afọ 2015, mgbe ụlọ ọrụ mgbasa ozi mebiri akụkọ banyere njide e jidere ya na aka ndị SSS na Abuja . Ozi ọma banyere njide e jidere Kanu kpalitere ngagharị iwe na Delta State, Enugu State, Rivers State, Cross River State, Abia State, Imo State, Akwa Ibom Sate, Bayelsa State nakwazi Anambra State . [14]

Njide[dezie | dezie ebe o si]

N’abalị iri na itoolu na afọ 2015, a gwara anyị na Nnamdi Kanu enwerugo onwe ya [15] mgbe ọ mechara ịgba izu nzuzo n’ụlọikpe majistrate, Wuse 11. [16] N'gbanyeghị, mgbapụta agbapụtara ya, e nwere "ihe arụmuka" ma nwekwara ebubo na ndị DSS kwupụtara mgbapụta ahụ naanị "iji mee daa ndị Biafra obi maka iwe ya na enwe." [17]

Ikike ụlọ ikpe[dezie | dezie ebe o si]

Ụlọ ikpe Majistrate nke mbụ nọ na Abuja na ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Novemba na afọ 2015 nyere iwu na Ngalaba Ọrụ (DSS) maka iwepụta Kanu n'ụlọ ikpe na ụbọchị ịrị abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba na afọ 2015. [18] N'agbanyeghị, akụkọ a kọọrọ na Ngalaba Ọrụ (DSS) nwetara "ikike ụlọ ikpe nzuzo iji jide Nnamdi Kanu". [19] [20] [21] Onye ọka iwu Kanu, Obetta, na n'ajụjụ ọnụ kwuru na mgbe n'ụlọ ikpe, onye ọka iwu ahụ nyere ya akwụkwọ nwere mpempe akwụkwọ nke nyere ikike ka Ngalaba nke Ọrụ (DSS) inwụchi Kanu ruo ọnwa atọ na-esote ya iji mechie ihe ha kwụrụ bụ nyocha maka nkwado nke iyi egwu na iyi ọha egwu ”. [22]

Nnwale Ikpe[dezie | dezie ebe o si]

Emechara ka akpọrọ Kanu ikpe na 23 nke November 2015 n'ụlọ ikpe gaa n'ulo Magistrate nke dị na Abuja na nke mbụ [23] [24] maka ebubo nke "izu ohi, mmaja na ndị otu nke nzukọ na-akwadoghị" nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ndị Ọrụ Naịjirịa (DSS). Ebubo ahụ merụrụ "Nkebi 97, 97B na 397" nke ntaramahụhụ koodu nkeNigeria. [25] [26] Onye ọka ikpe bụ Usman, nọ na ụbọchị ikpeazụ a hotara maka Mịnịstrị na- ahụ maka ọrụ (DSS) maka ọdịda n'ihe na ha enwepụtaghị Kanu n'ụlọ ikpe ugboro abụọ nkemgbe e wepụtara okwu a n'ụlọ ikpe. [27] Ka ọ dịgodị, ndị na akwado Kanu were iwe bata Nigeria gaa n' isi obodo ala ahụ bụ Abuja ha ji okomoko ụgbọ ala na udo mkpesa maka onye ndú ha bụ onye akpụrụ site aka Gọọmenti dị elu, tupu Wuse Mpaghara nke abụọ majistrati Court, Abuja na ụbọchịiịrị abụọ na atọ nke ọnwa Novemba na afọ 2015. [28] [29] [30] Ndị na-eme ngagharị iwe Biafra ji kaadị ekike ha bụọ abụ ma gbaa egwu na ogige ụlọ ikpe ebe ịnụ ikpe a gara. Ndị na-eme ngagharị iwe yiiri polo na okpu nwere akwụkwọ e dere dị ka "Biafra Ugbu A Ma Ọ Bụghị Ma Ọlị", "Buhari Hapụ Kanu Maka Anyị", "N'elu Biafra ka anyị guzoro". Ndị ngagharị iwe nke ndị otu IPOB na agagharị na mpaghara ahụ dị mmadụ puku iri na ise n'obodo ndịda ọwụwa anyanwụ isi nke Onicha n'otu oge. Ọ bụ otu ihe ahụ mere n'ihe karịrị puku mmadụ iri abụọ na-eme ngagharị iwe na Aba, Abia Steeti n'otu ụbọchị ahụ.

Kanu, site na aka onye ndụmọdụ ya, tinye akwụkwọ na-arịọ ndị ọchịchị gọọmentị ka ha wepụ ya n'aka ndị ọrụ nke Ngalaba Ọrụ (DSS) ma gị ya n'ụlọ mkpọrọ. Ọkaikpe ya, Obetta siri ọnwụ ka ebu gara ya onye ọ na ekpere ikpe n'ụlọ mkpọrọ ịji nyere ya aka ịnweta ndị lowya ya n'ụzọ dị mfe. [27]

Mgbe ọ nọ n'ụlọ ikpe, Ngalaba Ọrụ (DSS) rịọrọ Ụlọikpe Magistrati nke 'Wuse Zone 2 ka ọ kwụsị ikpe Nnamdi Kanu n'okpuru ngalaba 108 (1) nke nchịkwa nke ikpe ikpe mpụ na afọ 2015. [31] Idakwo gara n'ihu kwuo na Ngalaba Ọrụ nke DSS enwetara iwu site na aka Ụlọikpe dị elu na Abuja, nke dị na abalị iri na Nọvemba, iji jide onye a na-ebo ebubo na mkpesa yawee rue ụbọchị iri na itenanị . N'agbanyeghị, onye ọka iwu Kanu Obetta jụrụ mkpọrọ nke atụrụ onye onye ọ na ekpere ikpe. Obetta kpere ụlọ ikpe ekpere ka ọ kwụsị ikpe a n'ihi na ndị ọka iwu ewepụtaghị ozi ọbụla n'aka Attorney-General nke Naịjiria niile onye nwere ikike ịnabata ụdị ihe a. Obetta gwakwara ụlọ ikpe ahụ na "DSS mebiri iwu ụlọ ikpe ahụ nyere ikike ịgbazị ego zuru oke mana enyereghị ya, na-agbakwụnye na onye eboro ebubo nọrọ na Ngalaba Ọrụ Ndị Ọrụ (DSS) kemgbe ejidere ya." Onye ọka ikpe ụlọ ikpe ahụ, Usman Shuaibu, mgbe o gechara ndụmọdụ abụọ ahụ, eyigharịrị okwu a ruo ụbọchị nke mbụ nke ọnwa Disemba na afọ 2015 maka ikpe.

Ndị ikike ọchịchị nke Naịjiria ka na-achọ ya mgbe o mere aghụghọ nke kpatara ọnwụ nke ọtụtụ ndị ntorobịa ọwụwa anyanwụ.

Ntọhapụ n'ụlọ mkpọrọ[dezie | dezie ebe o si]

N’abalị iri abụọ n’ọnwa Ọgụstụnna afọ 2015, Vanguard kwupụtara na ahapụrụ Kanu na mgbapụta. Agbanyeghị, isi mmalite mgbasa ozi na-akwado ebumnuche IPOB kpọrọ ịgbapụta "mgbagha" ma kwuo na DSS kwupụtara mgbapụta ahụ naanị "iji mee ka obi dị ndị Biafra na-enwe iwe mma." [17] Emechaala tọhapụ Kanu na mgbapụta site n'aka Justice Binta Nyako maka ahụike.

Ọpụpụ[dezie | dezie ebe o si]

Kanu pụrụ n'anya ndị mmadụ mgbe ndị agha Nigeria wakporo ụlọ ya na Septemba na afo 2017. [32] Enweela asịrị banyere ebe ọ nọ kemgbe ihe karịrị otu afọ na ndị otu IPOB na-ebo gọọmentị Buhari ebubo na ha tọrọ ya. Ọ ga-emegharị ọzọ na Ọktoba na afọ 2018 mgbe foto ya na vidiyo ya banyere ya n'Izrel gbasara mgbasa ozi n'ebe dum. [33] Ọ ga na-eleta mba dị iche iche na Europe ebe ikpe ịgba ọchịchị gọọmentị Naịjirịa wetaara ya, ka na-agha n'ihu.

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

Kanu sitere na mmalite nke nkwado ya kwuru okwu banyere ndị na-akpata arụmụka nke ukwuu n'oge dị iche iche.

• Oge gara aga na afọ 2017, e wepụtara vidiyo nke Kanu ebe ọ wepụtara iyi egwu ọnwụ n’ebe onye isi ala chibụrụ Naịjirịa bu Chief Obasanjo. Ọ gwala nzukọ nke ndị na-akwado ụlọ n'obodo ya na ọ bụrụ na nsogbu ọ bụla adakwasị ya, ndị otu IPOB kwesịrị iwepu Obasanjo na agbụrụ ya. [34] Nke a bụ na nkwupụta okwu Obasanjo na nnọkọ na Abuja na a ga-emerịrị ihe niile iji kwụsị IPOB.

  1. Fani kayode Sends Birthday Greetings to Nnamdi Kanu @52 (26 September 2019). Archived from the original on 28 January 2021. Retrieved on 20 November 2019.
  2. "The man fighting for independence of the West African nation of Biafra... from a flat in Peckham", 21 January 2017. Retrieved on 7 May 2017.
  3. Mystery of the missing Biafran separatist (2017-10-06). Retrieved on 2019-11-20.
  4. "Nigeria police shoot Biafra supporters", 18 December 2015. Retrieved on 22 August 2017.
  5. "What's An Igbo 'Jewish High Priest' Doing at Center of Political Drama in Nigeria?". Retrieved on 17 May 2017.
  6. 6.0 6.1 "Biafran leader Nnamdi Kanu: The man behind Nigeria's separatists", 5 May 2017. Retrieved on 6 May 2017.
  7. Published. I’m proud of Nnamdi Kanu, he’s just like me — Father (en-US).
  8. Egbejule. "Nigeria fails to come to grips with separatist 'New Biafra'".
  9. Chijioke. "Biafra: Why I asked for guns from US-based Nigerians – Nnamdi Kanu".
  10. Onyeji, Ebuka (2019-02-15). Nigeria: IPOB - Nnamdi Kanu 'Calls-Off' Election Boycott (en).
  11. "Nigeria Protesters Demand Release of Jailed Radio Biafra Director", 11 November 2015.
  12. Uguru. "Nigerian intelligence arrests Biafran separatist leader", 19 October 2015.
  13. Sahara Reporters, New York (14 November 2015). Nnamdi Kanu's Lawyer Issues Statement on DSS And Efforts To Release Him From Detention. saharareporters.com.
  14. Radio Biafra Director, Nnamdi Kanu reportedly arrested (18 October 2015).
  15. Vanguard Nigeria (19 October 2015). Breaking: Radio Biafra’s Nnamdi Kanu Granted Bail. vanguardngr.com.
  16. Vanguard Nigeria (24 October 2015). DSS refuse to produce Radio Biafra Director, Nnamdi Kanu – Lawyer. vanguardngr.com.
  17. 17.0 17.1 Ludovica Iaccino. Nnamdi Kanu: Ipob leader whereabouts unknown despite Nigeria security forces claiming he is on bail.
  18. This Day Live, Nigeria. Biafra: Court Orders DSS to Produce Nnamdi Kanu Nov.23. Archived from the original on 2015-11-19. Retrieved on 2020-08-16.
  19. News Express on 19/11/2015. Biafra: DSS springs surprise, obtains secret court order to detain Nnamdi Kanu for 90 days.
  20. Daily Times, Nigeria. Pro-Biafra Protest Grounds Aba. Archived from the original on 2015-11-17. Retrieved on 2020-08-16.
  21. The Guardian, Nigeria. Pro-Biafra Activists Continue Protests in Aba.
  22. Ludovica Iaccino; IBTimes UK. Nigeria: State 'obtains court order' to detain Biafran leader Nnamdi Kanu for next three months.
  23. Vanguard, Nigeria (23 November 2015). Breaking: Nnamdi Kanu finally appears in Court.
  24. IBTimes, UK (23 November 2015). Nigeria: Radio Biafra leader Nnamdi Kanu appears in court despite death rumours.
  25. Biafra protests in Nigeria driven by poverty, neglect, injustice (20 November 2015).
  26. Premium Times, Nigeria (23 November 2015). Biafra: SSS seeks transfer of Nnamdi Kanu’s case to higher court.
  27. 27.0 27.1 Vanguard, Nigeria (24 November 2015). Biafra: Transfer me to prison custody, Kanu begs court. vanguardngr.com.
  28. Vanguard, Nigeria (23 November 2015). Photos: Protest in Abuja, as FG arraigns Nnamdi Kanu in Court. vanguardngr.com.
  29. The Sun, Nigeria (23 November 2015). Pro-Biafra protesters storm Abuja as SSS arraigns Kanu in court. sunnewsonline.com.
  30. Linda Ikeji, Nigeria (23 November 2015). Photos: Supporters of Pro-Biafran leader, Nnamdi Kanu storm Abuja court. lindaikejisblog.com.
  31. Vanguard, Nigeria (23 November 2015). DSS asks court to discontinue Kanu's trial. "/vanguardngr.com".
  32. Tayo, Sola. "Calls for Biafran Independence Return to South East Nigeria", 9 November 2017.
  33. Nnamdi KANU Resurfaces in Jerusalem 1 year after mysterious disappearance.
  34. siteadmin. Nnamdi Kanu Threatens To Kill Obasanjo.