Adaobi Tricia Nwaubani

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adaobi Tricia Nwaubani
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAdaobi, Tricia Dezie
aha ezinụlọ yaNwaubani Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1976 Dezie
Ebe ọmụmụEnúgwu Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụode akwukwo ifo, Odee akwụkwọ, Onye ntaakụkọ Dezie
ụdị ọrụ yaoru nta akuko, literature Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan, Federal Government Girls College Owerri Dezie
Ebe obibiAbuja Dezie
Ọrụ ama amaI Do Not Come To You By Chance, Buried Beneath the Baobab Tree Dezie
Ihe nriteCommonwealth Writers' Prize, Betty Trask Award, Ihe nrite Wole Soyinka maka edemede n'Africa Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Adaobi Tricia Obinne Nwaubani bụ nwafọ Naijiria bụ onye ode akwụkwọ, ode ihe ọchị, ode edemede na onye nta akụkọ . Akwụkwọ mbido ya, I Do Not Come to you by Chance, [1] meriri n'ihe nrite nke Commonwealth Writers ’Prize for Best First Book (Africa) nke afọ 2010, [2] [3] ihe nrite nke Betty Trask First Book, [4] The Washington Post kpọkwzịrị ya otu n'ime akwukwo kacha nma nke afọ 2009. [5] Akwụkwọ mbụ ya bụ Young Adult, Buried Beneath the Baobab Tree, dabere na ajụjụ ọnụ a gbara ụmụ agbọghọ ndị Boko Haram tọọrọ, ka HarperCollins bipụtara n'ọnwa Septemba nke afọ 2018. O meriri na Raven Award for Excellence in Arts and Entertainment nke afọ 2018, akpọkwazịrị ya otu n'ime akụkọ ifo maka ndị okenye nke kachasị mma nke ndị American Library Association Best Fiction for Young Adults, bụrụkwa nke a họọrọ maka Notable Social Studies Trade Books for Young People nke afọ 2019.

Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya n'Enugu, na Naijiria, nye Chief Chukwuma Hope Nwaubani na Dame Patricia Uberife Nwaubani n'afọ 1976, mana nne na nna Nwaubani zụlitere ya na obodo ya bụ Umuahia, [6] n'Abia Steeti, n'etiti ndị Igbo . Ezinụlọ ya sitere na ndị otu Nigerian chieftaincy system; Nna nna nna ya Chief Nwaubani Ogogo Oriaku - isi mmalite nke aha nna ya - bụ onye ahịaohu a ma ama nke Royal Niger Company na narị afọ nke iri na itoolu. [7]

Mgbe ọ dị afọ iri, ọ hapụrụ ụlọ gaa ụlọ akwụkwọ obibi nke Federal Government Girls College dị n'Owerri . Ọ gụrụ akwụkwọ maka akparamaagwa na Mahadum nke Ibadan, mahadum mbụ na Naịjirịa. [8] Dika onye na-eto eto, Nwaubani nọ na-atule ị rụ oru na CIA ma obu ndi KGB . Ọ nwetara ego mbụ ya site na mmeri n'asọmụmpi edemede mgbe ọ dị afọ 13. Nne ya bụ nwa nwanne nna Flora Nwapa, nwanyị mbụ n’Afrịka nke bipụtara akwụkwọ. [9] N’afọ mbụ ya na mahadum, ọ bụ onye otu Idia Hall Chess, ma bụrụkwa onye otu ndi otu egwu na mahadum (egwu gboo). [10]

Nwaubani bụ otu n'ime ndị bidoro ọrụ ndezi NEXT newspapers nke Naijiria nke anaghịzị arụ ọrụ ugbua, nke ọ bụ nta akụkọ Dele Olojede nke ritere onyinye Pulitzer Nrite guzobere ya . [11]

I Do Not Come to You by Chance bu akwụkwọ ọgụgụ nke izizi Nwaubani dere, nke ebiputara n’afọ 2009. [12] Nke e dere n'ụwa nke Nigerian email scams, akwụkwọ ahụ na-akọ akụkọ banyere otu nwa okorobịa, Kingsley, onye tụkwasịrị nwanne nna ya Boniface obi maka enyemaka n'ịgbapụta ezinụlọ ya n'ihe isi ike. N'afọ 2019, Masobe Books nwetara ikike i bipụta I Do Not Come to You by Chance na Naijiria. [13]

Adaobi Tricia Nwaubani bi n'Abuja, na Naijiria, ebe ọ na-arụ oru dika onye ndumodu.

Mmetụta[dezie | dezie ebe o si]

Nwaubani ekwupụtala nchegbu ya banyere ọtụtụ ihe odide akwụkwọ ọgụgụ nke Afrịka. [14] Ọ na-akwanyere ọrụ akwụkwọ ọgụgụ Angela Ash nke onye edemede Irish-American bụ Frank McCourt dere,nke meriri n'ihe nrite Pulitzer site na-igosi ya na ya nwere ike iji okwu ọchị dee maka okwu siri ike. [15] Ọ bụkwa ezigbo onye nwere mmasị na onye ma=eme ihe ọchị Britain bụ P.G Wodehouse .  [ <span title="This claim needs references to reliable sources. (July 2018)">see okwu dị mkpa</span> ]

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

  • 2010 Commonwealth Writers Prize for Best First Book (Africa) [16]
  • 2010 Betty Trask First Book Award [17]
  • 2010 Wole Soyinka Prize for Literature in Africa finalist [18]
  • 2012 Nigeria Prize for Literature shortlist [19]
  • The Washington Post Best Books 2009 [20]
  • 2018 recipient of the Raven Award of Excellence for her book "Buried Beneath the Baobab Tree" [21]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. I Do Not Come to You by Chance. 
  2. Marié Heese and Adaobi Tricia Nwaubani Win the 2010 Commonwealth Writers Prize – Africa Region Awards (11 March 2010). Retrieved on 14 June 2013.
  3. "My degree is better than yours", 7 October 2012. Retrieved on 14 June 2013.
  4. The Betty Trask Prizes and Awards. Archived from the original on 22 July 2011. Retrieved on 14 June 2013.
  5. "Best Books of 2009".
  6. "Adaobi Nwaubani talks with African Writing Online, many literatures, one voice".
  7. "My Great Grandfather, the Nigerian Slavetrader".
  8. About Adaobi Tricia Nwaubani. Adaobi Tricia Nwaubani website. Retrieved on 31 July 2013.
  9. Adaobi Nwaubani talks with African Writing Online [many literatures, one voice]; Interviews. African-writing.com. Retrieved on 19 August 2013.
  10. Adaobi Tricia Nwaubani. Archived from the original on 2019-08-04. Retrieved on 2018-06-14.
  11. "Nigeria's 'brown envelope' journalism", BBC News. (in en-GB)
  12. Banerjee, Neelanjana. I Do Not Come to You By Chance, by Adaobi Tricia Nwaubani.
  13. The Guardian Art Editor. Masobe books list new authors, books.
  14. "Nigerian anger over S Africa xenophobic attacks", 2019-08-29.
  15. Adaobi Tricia Nwaubani (2018-11-13).
  16. Marié Heese and Adaobi Tricia Nwaubani Win the 2010 Commonwealth Writers Prize - Africa Region Awards. Retrieved on 17 July 2018.
  17. 404 Error - The Society of Authors. Archived from the original on 22 July 2011. Retrieved on 17 July 2018.
  18. Adaobi Nwaubani: Humorous writer, journalist – Daily Newswatch Newspaper. Retrieved on 2020-05-27.
  19. Lola Shoneyin, Chika Unigwe and Others Shortlisted for 2012 Nigeria Prize for Literature. Retrieved on 17 July 2018.
  20. Holiday Guide 2009: Best Books - The Washington Post. Retrieved on 17 July 2018.
  21. Adaobi Tricia Nwaubani - Pulitzer Center.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Nyocha