Adeseye Ogunlewe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adeseye Ogunlewe
Mmádu
Akụkụ nkeNigerian senators of the 4th National Assembly Dezie
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, asọmpi egwuregwu Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria, Minister of Works and Housing Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party, Alliance for Democracy Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie

Adeseye Ogunlewe
ConstituencyLagos East, Lagos State
Senator for Lagos East
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Minister of Works
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Succeeded byYahaya Abdulkarim
Personal details
NationalityNigerian
Political partyPDP APC
Alma materUniversity of Ibadan

Kingsley Adeseye Ogunlewe bụ onye Naịjirịa si a ezinụlọ ndị eze nke Igbogbo na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a họpụtara dịka Sịnetọ n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị Alliance maka Democracy (AD) ikpo okwu 1999 maka mpaghara ọwụwa anyanwụ Lagos, tupu Ọ gafee otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP. O mechara bụrụ Mịnịsta nke ọrụ (site n'ọnwa July afọ 2003 ruo ọnwa Maachị afọ 2006). [1] Mgbe onye isi ala Olusegun Obasanjo chụpụrụ ya n'ọkwa a, a sịrị na ọ bụ n'ihi esemokwu ya na onye bụbu onye nkwado ya, Bode George, onye osote onye isi oche otu PDP. [2]

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

Ogunlewe sitere na usoro ndị ọgaranya nke Igbogbo, obodo dị na okpuru ọchịchị obodo nke Ikorodu nke Lagos Steeti . Nwanne ya nwoke nke tọrọ ya Dr. Akin Ogunlewe, bụ odeakwụkwọ na- adịgide na Ụlọ Ọrụ ozi gọọmenti etiti maka Azụmaahịa na Mmepụta, onye a napụrụ ọnọdụ ya n'obere oge Ogunlewe gafere na PDP. [3]

Ogunlewe bụ otu n'ime ndị gụrụ akwụkwọ na mahadum Ibadan . N'oge ọnụnọ ya na mahadum nke mbụ ọ biri na ụlọ Mellanby were sonye nkeoma na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụmụ akwụkwọ. Ọ bụ onye ọkaiwu, ma n'otu oge ọ bụ onye odeakwụkwọ na-adịgide adịgide nke Lagos Steeti . [3]

Sịnetọ[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Julaị afọ 2002, Sịnetọ Wahab Dosunmu na Adeseye Ogunlewe boro Gọvanọ Lagos Steeti bụ Bola Ahmed Tinubu ebubo na ọ na -emegbu ntụkwasị obi ego ọha site na nturu ugo nkwekọrịta nye ndị enyi ya. [4]

Ọ zọrọ maka nhọpụta nke ugboro abụọ na ntuli aka nke afọ 2003 na tiketi nke otu PDP, mana Olorunnimbe Mamora nke Alliance for Democracy (AD) meriri ya. [3]

Mịnịsta nke ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Julaị nke afọ 2003, Ogunlewe mara ọkwa na gọọmentị etiti ga -etinye ihe ruru ijeri dọla abụọ na narị asatọ na iri ise n'ịhazigharị na ịkwalite okporo ụzọ nke mba ahụ, wee mee atụmatụ ime ka ụzọ niile dị na mba ahụ dị nma ịga na njedebe afọ. N'ọnwa Jenụwarị afọ 2004, Ogunlewe kwuru na gọọmentị etiti akwadola nde naira narị iteghete ọzọ maka idozi ụzọ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ. [5]

N'ọnwa Eprel afọ 2004, Ogunlewe meriri onyinye nkeDr Kwame Nkrumah Ọchịchị nke Afrịka na Accra, Ghana . [6] N'ọnwa Mee afọ 2004, Ogunlewe bipụtara akara ekwentị ya wee gwa ndị mmadụ ka ha jiri ya ma ọ bụrụ na ha hụ oghere ite ma ọ bụ nwee ihe mberede okporo ụzọ. O kwuru na oku jubigara ókè na ya, mana ọ kwukwara maka ụzọ "Ha mara mma ugbu a." O kwuru na 12,600 Emezigharịrị kilomita puku iri na abụọ na nari isii nke okporo ụzọ n'ime ọnwa isii gara aga. [7]

N'ọnwa Juun nke af 2004, enwere ọgbaghara na steeti Lagos n'etiti ndị ọrụ nke Ụlọ ọrụ ozi nke ọrụ nke etiti na ndị ọrụ nke Ikike Nhazi trafiki Lagos Steeti. Esemokwu ahụ bụ maka ịchịkwa okporo ụzọ etiti, o yikwara ka enwere njikọ na esemokwu na -aga n'ihu n'etiti Ogunlewe na gọvanọ steeti ahụ bụ Bola Ahmed Tinubu nke Alliance for Democracy. [8]

N'ọnwa Ọgọọst nke afọ 2004, Ogunlewe mara ọkwa na Ụlọ akụ mba ụwa na Ụlọ akụ nke mmepe mba Afrịka zubere ha na Naịjirịa ịnwe nkwekọrịta iwu Trans-West African Highway si Lagos ruo isi obodo Mauritania bụ Nouakchott . N'ọnwa Ọktoba afọ 2004, Ogunlewe kwuru na afọ 2005 ga -ahụ ọganihu ngwa ngwa na nrụzi na ịrụ ụzọ. [9]

N'ọnwa Maachị afọ 2006, mgbe a chụrụ ya n'ọrụ dị ka minista na -ahụ maka ọrụ, Ogunlewe gwara Onyeisiala Olusegun Obasanjo ka ọ chọọ ọchịchị nke atọ.

Ọrụ mmecha[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Julaị afọ 2006, achọpụtara na e gburu Funsho Williams onye n'azọ ọkwa gọvanọ na Steeti Legọs n'ụlọ ya. E jidere Ogunlewe, onye bụ onye Iro otu PDP n'oge gara aga, maka ogbugbu a. [10] E mechara hapụ ya, mana n'ọnwa Febụwarị 2007, e jidere ya ọzọ. [11]

N’ọnwa Nọvemba afọ 2009, kọmitii na-ahụ maka njem ụgbọ nke Heineken Lokpobiri na- duru, degara ụlọ elu ozi nke kpughere “ebubo arụrụala ” na-nkwekọrịta ọrụ ụzọ n’ime afọ iri, ma tụọ alo ka onye bụ minista ọrụ gara aga bụ Anthony Anenih, Adeseye Ogunlewe, Obafemi Anibaba, Cornelius Adebayo na ndị ọzọ nọ n'ikpe maka nrụrụ aka. [12] Mkparịta ụka Sineti maka akụkọ a egbuola oge. [13] Senator Ogunlewe gbara arụkwaghịm n'ọkwa ya dịka Pro-Chancellor nke Federal University of Agriculture, Abeokuta n'afọ 2016. [14] N'afọ 2019, Sịnetọ Ogunlewe hapụrụ Peoples Democratic Party maka All Progressives Congress [15]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Olayinka Oyebode (May 11, 2009). Lagos PDP without Bode George. The Nation. Archived from the original on 2011-07-26. Retrieved on 2009-11-13.
  2. Ndubusi Ugah (28 October 2009). The Many Controversies of Bode George. This Day. Retrieved on 2009-11-13.
  3. 3.0 3.1 3.2 Habib Aruna and Femi Ogbonnikan (June 22, 2004). Still on Tinubu/Ogunlewe tango. Daily Independent Online. Retrieved on 2009-11-13.
  4. Bature Umar (July 26, 2002). Lagos Senators Accuse Tinubu of Funds Diversion.. This Day. Retrieved on 2009-11-13.
  5. FG Approves N900m More for S/East Roads. Nigerian News Radio (January 24, 2004). Archived from the original on April 9, 2004. Retrieved on 2009-11-13.
  6. Nigerians Get Nkrumah Award. GhanaHomePage (30 April 2004). Retrieved on 2009-11-13.
  7. Call me, Nigerian minister says. BBC News (18 May 2004). Retrieved on 2009-11-13.
  8. Tolu Olarewaju (June 17, 2004). Pains, the anguish of Ogunlewe/George Army on Lagos roads. Daily Independent. Retrieved on 2009-11-13.
  9. Ogunlewe Promises Regular Funding for Road Projects. This Day (2004-10-27). Archived from the original on 2005-01-19. Retrieved on 2009-11-13.
  10. Nigeria police arrest rival in politician's slaying. CBC News (July 29, 2006). Retrieved on 2009-11-13.
  11. Idowu Sowunmi (February 24, 2007). Again, Ogunlewe Arrested. This Day. Archived from the original on March 6, 2007. Retrieved on 2009-11-13.
  12. Fixing Anenih and others for corruption. Next (November 8, 2009). Archived from the original on 2011-07-21. Retrieved on 2009-11-13.
  13. Emmanuel Aziken (November 5, 2009). Senate suspends N300bn contract report. Vanguard. Retrieved on 2009-11-13.
  14. BREAKING: Ogunlewe resigns appointment as FUNAAB’s pro-chancellor (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2019-08-26.
  15. No regrets dumping PDP, says Ogunlewe (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2019-08-26.