Azubuike Ihejirika

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Azubuike Ihejirika
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Febụwarị 1956 Dezie
Ebe ọmụmụIsuikwuato Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụndị agha Dezie
Ọkwá o jiChief of Army Staff Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello, Ụlọ Akwụkwọ Nchebe Naijiria, Armed Forces Command and Staff College, Jaji Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
ọkwa aghaizugbe Dezie
Azubuike Ihejirika
Chief of Army Staff
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Preceded byLt-Gen. A.B. Dambazau
Succeeded byMaj-Gen. K. Minimah
Personal details
Born (1956-02-13) 13 Febụwarị 1956 (age 68)
Isuikwuato, Abia State, Nigeria
RelationsNnenna Ihejirika (Spouse)
AwardsCommander of the Federal Republic, CFR
Military service
Nickname(s)Dike Abia
Allegiance Nigeria
Branch/service Nigerian Army
Years of service17 December 1977–January 2014
RankLieutenant general
Unit81 Division
CommandsLagos garrison Command
Battles/warsBoko Haram Insurgency War

Azụbụike Ihejirika, CFR (Amụrụ Febuwarị 13, 1956) bụ onye gara ezumike nká Amị Naịjirịa, onyeisi jenaral na onye bụbu Onye isi ọrụ Amị. [1] [2] [3]

Ndabere na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ ya na 13 Febuwarị 1956 na okpuru ọchịchị Isuikwuatọ nke dị na Abịa Steeti . [4] Ọ gụrụ akwụkwọ na "Williams Memorial High Sukulu" dị na Afugiri, obodo dị na Ugwu Ụmụahịa, Abịa Steeti ebe ọ nwetara "London General Certificate" na 1975 ya na akwụkwọ nyocha nke "West African Senior School" na ọkwa I. [5] Ọ bụ otu onye na ndị 18 Regụla Kọmbatantị Kọsụ nke "Naịjirịa Defense Academy", Kaduna ma nye ya onye isi nke abụọ na Disemba 1977 n'ime ndị "Corps of Naịjiria Army Engineers" (NAE). [6] Ihejirika nwere BSc (Hons) na Kwontity Sovee na Mahadum Ahmadu Bello, Zaria ma bụrụkwa onye bụ isi nke ụlọ ọrụ ndị agha dịka "Command and Staff College", "Jajii" na "National War Koleji".

Ọrụ agha[dezie | dezie ebe o si]

Jenaral Ihejirika nọ na ndị nduzi na "Command and Staff College", "Jajii" ma bụrụkwa onye isi na Nchekwa na Isi ụlọ ọrụ ndị Amị. Ọ nwekwara ọtụtụ nhọpụta dị n'iwu gụnyere: [6]

  • Ọchịagha nke nkeji ndị Ịnjinịa
  • Ọ na-arụ ọrụ Jeneral ọchịagha, nke nkeji mbụ
  • Jeneral Ọchịagha Ofisa ndị nkeji 81.

Ahọpụtara Jenaral Ihejirika dịka onye isi ọrụ ndị Amị (COAS) na Septemba 8, 2010 site n'aka onye isi ala Goodluck Jonathan . [7] O jere ozi dịka COAS ruo afọ anọ ruo mgbe ọ lara ezumike nká na Jenụwarị 2014. [8]

Ndụ mgbe ọ rụchara Amị[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ lara ezumike nká dịka Onye isi ndị agha na Jenụwarị 2014, ọ laghachiri n’obodo ya, Isuikwuatọ ebe echiri ya echichi dịka, “Dike Abịa” (n’asụsụ Igbo), “Warrior of Abia” (Na asụsụ Bekee). [9] [10] "Echere m na ha ga-echim echichi ma


mana ha mere m eze. Ya mere, enyefere m ndị ọchịagha na ndịnsọpụrụ g, aha a bụ ndị gosipụtara ike n'etiti ihe ịmna nsogbu a aka ndị siri ike ",kwuruhotara. [11]

Ebubo nkwado ndị Boko Haram[dezie | dezie ebe o si]

Na Ọgụstụ 2014, e boro ya na Ali Modu Sheriff, nke bụbu gọvanọ nd Borno Steeti ebubo na o so na ndị na-akwado ndị ụka Alakụba na-eyi ọha egwu nke Boko Haram. Onye mere ebubo ahu bụ onye Australia, Dr Stephen Davis, nke ya na ndị Nchekwa Naịjirịa na-arụkọ maka nnapụta Ụmụakwụkwọ nwanyị atọrọ. Eziokwu dị n'ebubo ahụ butere ọtụtụ mmeghasị omume ma mba ahụ na kwa Mba ndị gbara ya okirikiri.

Ndị ọrụ nchekwa obodo (SSS), N'aka nke ọzọ kwuru na Lt. Gen. Azụbụike Ihejirika abụghị ya na-akwado ndị otu Boko Haram ma wee kwuo n'aka ya dị ọcha na ebubo onye Australia na- ebo ya. [12] [13] [14]

Awọdụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ nweela ọtụtụ nturu ugo na nkwanye ugwu n'etiti ndị a,

  • Ọchịagha nke gọọmentị etiti, CFR onye nyere ya bụ Goodluck Ebele Jonathan, Onye isi ala nke gọọmentị etiti Naịjirịa
  • The Forces Service Star (FSS) nke ndị Amị nyere ya.[15]
  • (FSS) onyinye
  • Meritorious Service Star (MSS) nke ndị agha Naịjirịa nyere .
  • Distinguished Service Star (DSS) nke ndị agha Naịjirịa nyegoro ha .
  • Grand Service Star (GSS) nke ndị Amị Naịjirịa nyere ya.
  • Passed Staff College(psc (+)) nke ndị agha Naịjirịa nyere ya .
  • Onye otu Akwụkwọ Koleji nke Agha (FOC)

Njide ala na ụlọ site na ndị na-ahụ maka mpụ Akụnụba na ihe gbasara ego.[dezie | dezie ebe o si]

Na Jenụwarị 27, 2016, ndị mgbachibido omekome na-ahụ maka mpụ Nchekwa na Akụnụba nke gbasara ego (EFCC) kpochiri ala na ụlọ ya na ụzọ mkpị Jabi Airport dị na Abuja, bụ nke Azụbụike Ihejirika. Ọ bụ otu n'ime ọtụtụ ndị isi ndị ọchịagha nke metụtara igwu wayo $ 2.1 ijeri nke ngwa agha nke metụtara onye bụbu onye ndụmọdụ n'ihe gbasara nchekwa obodo, Sambo Dasuki . [16]

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndị agha Naịjirịa

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Former Chief of Army Staff, GENERAL AZUBUIKE IHEJIRIKA set to join Abia guber race. encomium.ng.
  2. Meritocracy: Elevation Of Azubuike Ihejirika To Chief Of Army Staff. nigeriavillagesquare.com. Archived from the original on 2014-12-13. Retrieved on 2020-11-22.
  3. "Army Promotions: I’m not favouring my kinsmen – COAS - Daily Post Nigeria", Daily Post Nigeria.
  4. Lt.Gen.Azubuike Ihejirika – The Abia State Government – Official Website. abiastate.gov.ng. Archived from the original on 2020-01-28. Retrieved on 2020-11-22.
  5. Meritocracy: Elevation Of Azubuike Ihejirika To Chief Of Army Staff. nigeriavillagesquare.com. Archived from the original on 2014-12-13. Retrieved on 2020-11-22.
  6. 6.0 6.1 LT GEN OA IHEJIRIKA CFR Gss Psc(+)fwc fniqs {COAS 2010 -2013}. Nigerian Army.
  7. IHEJIRIKA: ONE YEAR AFTER, HOW FAR. Retrieved on 25 July 2015.
  8. B’Haram sponsorship: SSS exonerates Ihejirika, to quiz Modu-Sheriff.
  9. Insecurity: Ihejirika Advocates Synergy among Govts, Security Agencies, Articles - THISDAY LIVE. thisdaylive.com. Archived from the original on 2014-12-13.
  10. When a General returned home. elotitv.com. Archived from the original on 2014-12-13.
  11. A Hero's Welcome for Ihejirika, Articles - THISDAY LIVE. thisdaylive.com. Archived from the original on 2014-12-13.
  12. Former Army Chief, Ihejirika is not a Boko Haram sponsor - SSS - DailyPost Nigeria.
  13. "[General - Australian Negotiator Names Ihejirika, Sheriff as Sponsors of Boko Haram]". Retrieved on 2017-12-20.
  14. Boko Haram Sponsor: Ihejirika, El-Rufai trade accusations - Vanguard News.
  15. Why we offered GCON to Dangote - Jonathan - Vanguard News. Vanguard News.
  16. Akinloye, Dimeji. "Azubuike Ihejirika: EFCC seizes ex-Chief of Army Staff"s estate". (in en-US)