Isidingo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Isidingo bụ soap opera nke South Africa, nwere asụsụ mkparịta ụka na isiXhosa. [1] Usoro Ihe nkiri a malitere na SABC 3 na Julaị 1998 wee gbasaa na mgbede na SABC 3 site na Mọnde ruo Fraịde na 19:00. Ruo 2001, akpọrọ ya Isidingo: The Need . [2]

Grey Hofmeyr mebere ya, akụkọ ahụ na-adabere na Soap opera ọzọ na-ewu ewu nke Hofmeyr, The Villagers mere, nke a na-agbasa n'oge ọchịchị apartheid na South Africa. [1] Ndị na-ede akwụkwọ akụkọ mbụ gụnyere Neil McCarthy, Mitzi Booysen, Ilse van Hermert, Christian Blomkamp, Busisiwe Ntintili, Loyiso Maqoma, Liam J Stratton, Rohan Dickson, Bongi Ndaba, na Duduzile Zamantungwa Mabaso.

N'abali iri abụọ na iteghete nke ọnwa Nọvemba 2019 SABC kwupụtara na a ga-akagbu mmepụta [3] na mgbasa ozi ikpeazụ na-agbasa na 12 Maachị 2020.

Ndị isi akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

Ndị isi akụkọ gụnyere ezinụlọ Haines, Matabanes, Vusi Molettane onye njikwa ogbunigwe na ndị dị iche iche bi n'ụlọ obibi nke Maggie Webster nwere. Barker Haines, onye nwe ON TV, bụ onye na-ebi ndụ dị elu nke na-emekarị atụmatụ ịbanye na ndụ ndị dị iche iche na n'ime obodo na- egwupụta ihe na Horizon Deep, karịsịa nwa ya nwanyị Leone. [1] Matabanes bụ ezinụlọ nwere njikọ chiri anya nke nwere ebe siri ike, n'ụdị, na ndị mmadụ Horizon Deep, yana Zebedee dị ka nna ochie. Ndị ngosipụta agwa ndị ọzọ gụnyere Lolly De Klerk, Frank Xavier, Parsons Matibane, Georgie Zamdela na Calvin Xavier.

Ndepụta ndị ngosipụta agwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Lincoln Sibeko ( Lindani Nkosi )
  • Kgothalo Letsoalo ( Katlego Danke )
  • Nikiwe Sibeko ( Linda Sokhulu )
  • Nina Zamdela ( Khabonina Qubeka )
  • Obakeng Zamdela ( Anga Makubalo )
  • Sechaba Moloi ( Motlatsi Mafatshe )
  • Ntando Sibeko ( Loyiso McDonald )
  • Samuel Gatanga Masilo ( Amos Ketlele )
  • Shadrack Bhekiziswe Sibiya ( Tulani Mtsweni )
  • Makgorometsa (Vusi Jim Makwela)
  • Anja Lategan ( Lee Visagie )
  • Zandre Lategan (De-Andre Reinders)
  • Lalage Lategan ( Elma Postma )
  • Wendy Van Onselen ( Michelle-Beling Pretorius )
  • Morongwa Kau ( Soso Runqu )

Akparamagwa mbụ ama ama[dezie | dezie ebe o si]

  • Georgie Zamdela ( Darlington Michaels )
  • Agnes Matabane ( Keketso Semoko )
  • Godlieb Mofokeng ( Rapulana Seiphemo )
  • Angelique Scott ( Shanon Esra )
  • Aphiwe Nzimande ( Kanya Mkangisa )
  • Benjamin Le Roux ( Arno Marais )
  • Zebedee Matabane ( Mlangeni Nawa )
  • Barker Haines ( Robert Whitehead )
  • Lerato Tsotetsi
  • Kamogelo Tsotetsi (Makgotso Monyemorathule)
  • Sammy ( Tony Kgoroge )
  • Katlego Sibeko ( Kgomotso Christopher )
  • Cherel de Villiers ( Michelle Botes )
  • Derek Nyati ( Hlomla Dandala )
  • Dusty da Silva ( Milan Murray )
  • Bradley Haines ( Izak Davel )
  • Calvin Xavier ( Maurice Paige )
  • Priya Kumar ( Leeanda Reddy )
  • Rajesh Kumar ( Jack Devnarain )
  • Tiffany Steyn ( Carmen Pretorius )
  • Samantha Sharma ( Zakeeya Patel )
  • Charlie Holmes ( Michaella Russell )
  • Frank Xavier ( Kevin Smith )
  • Sizwe Zondile (Jet Novuka)
  • Harriet Thompson (Grethe Fox)
  • Joey Ortlepp ( Nathalie Boltt )
  • Len Cooper (Chris Beasley)
  • Kimberly Lewis ( Marisa Drummond )
  • Kyle Ortlepp (Owen Meyer)
  • Kieran Harriman (McGregor)
  • Leone Haines ( Ashley Callie )
  • Lesedi Moloi (Gugulethu Zuma)
  • Letti Matabane ( Lesego Motsepe )
  • Lolly van Onselen ( Kim Engelbrecht )
  • Maggie Webster ( Karin Van Der Laag )
  • Nandipha Sithole ( Hlubi Mboya )
  • Elise Buller ( Nicola Jackman )
  • Natasha Wallace ( Jo da Silva )
  • Parsons Matabane ( Tshepo Maseko )
  • Paul McPherson ( Carl Beukes )
  • Erin McPherson (Tessa Jubber) - 2005
  • Philippa de Villiers ( Bianca Amato ) – 1998–2001
  • Pradashan Naiker
  • Sean Kumar (Silvem Pillai)
  • Siyanda Mazibuko
  • Stella Fouche ( Judy Ditchfield )
  • Jaseel Gonasalen (Ishq Pitamber)
  • S'khumbuzo Nzimande (Sisa Hewana)
  • Zukisa Zondile ( Noluthando Meje )
  • Yvette (Charmaine Weir Smith)
  • Janine (Caitlin Kilburn)
  • Steve Stethakis ( Emmanuel Castis )
  • Stuart Buller ( Colin Moss ) – 1998–2000
  • Ted Dixon ( Clive Scott )
  • Tim Wilson (Nathan Ro)
  • Elize ( Lynne McCarthy )
  • Tommy "Mad Dog" McCulum ( David James ) - 2004-2006
  • Vusi Molettane ( Meshack Mavuso )
  • Yvette Meyer ( Shanon Esra ) - 2004
  • Zak ( Fikile Mthwalo )
  • Zebedee Matabane (Don Mlangeni)
  • Parsons Matabane ( Tshepo Maseko )
  • Dr Beth McNamara (Mary Ann Barlow)
  • Gabriel Mothusi (Aubrey Poo)
  • Hendrik Lategan ( Gérard Rudolf )
  • Lungi Biyela (Jo-Anne Reyneke)

Ọpụpụ Isi agwa[dezie | dezie ebe o si]

Onye na-eme ihe nkiri bụ Michelle Botes, onye ngosipụta agwa dị ka villainess Cherel De Villiers kemgbe Isidingo ' s 1998 mpụta mbụ, Ekwupụtara ọpụpụ ọ dị nso na usoro ahụ na Ọktoba 2006, otu izu ka South African Television Awards gbacharsvya nkiti (n'agbanyeghị Isidingo ewela chala ọtụtụ ihe nrite).  Ngosiputa Botes ọzọ dị ka Ingrid n'ihe nkiri Binnelanders, nke ya na Isidingo mara aka n'usoro ụgwọ nke M-Net . [4] Ọ laghachiri Isidingo site na 2010 ruo 2013.

N'oge na-adịghị mgbe ọ nwetasịrị ihe nrite ome kacha mma na ihe nkiri South Africa na Televishon Awards maka ihe ngosi ya dị ka Leone, "Lee" Haines, onye na-eme ihe nkiri gbara afọ iri atọ na abụọ bụ Ashley Callie nwụrụ n'ihi ihe mberede ụgbọ ala na February 2008. [5] A naghị emegharị ọrụ ahụ, ma e dere agwa ahụ site n'ịgosipụta Lee ka ọ bụrụ onye n'efu efu maka ọ pụtaghị ọrụ, ma mesịa gosi na ọ nwụọla n'ubi agbahapụrụ na-akọwaghị ihe kpatara ọnwụ ya. [6]

Ọnwa isii ka Callie nwụsịrị, usoro ahụ wepụrụ onye ngosipụta agwa bụ Letti Matabane (nke onye na-eme ihe nkiri Lesego Motsepe n'egosi) n'ihe mberede ụgbọ ala yiri nke ahụ, kpalitere "mwusa iru újú mba niile". [7]

Ihe nketa[dezie | dezie ebe o si]

Isidingo bụ ihe nkiri TV South Africa izizi gosipụtara nsusu ọnụ ndị nwoke nwere mmasị nwoke na mba ahụ, bụ nke hụrụ ome abụọ bụ Steve na Len ịsusu ọnụ. O mekwara akụkọ ihe mere eme mgbe ọ na-egosipụta agbamakwụkwọ mbụ ndị mmekọ nwoke na nwanyị na telivishọn South Africa mgbe ndị ome ihe nkiri bụ Steve na Luke gbara akwụkwọ. Ekesara ihe omume a ụbọchị ole na ole ka e kwadochara alụmdi na nwunye nwoke na nwoke na nwanyị na nwanyị na South Africa na 2006. Onye isi na-emepụta ihe nkiri ahụ Pumla Hopa kọwara otú Isidingo si dị iche na ihe nkiri soap opera ndị ọzọ n’oge ahụ, sị: “Ihe na-eme ka anyị dị iche bụ na anyị na-eleba anya n’ihe dị n'obodo ndị metụtara nwoke idina nwoke, ịkpa ókè agbụrụ, alụmdi na nwunye gwakọtara ọnụ na HIV-Aids. Anyị webatara ụdị akụkọ dị iche." [8]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta usoro ihe onyonyo South Africa

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 According to anonymous donor https://web.archive.org/web/20210920234522/https://media.discordapp.net/attachments/868233340543713310/869745339035430964/image0.gif
  2. Willoughby (28 April 2006). Isidingo's lustre will never fade while Barker remains his nasty self. www.tonight.co.za. Independent News & Media. Archived from the original on 20 October 2008. Retrieved on 6 December 2014.
  3. Final episode of Isidingo to air on SABC 3 in March 2020 | IOL News (en). www.iol.co.za. Retrieved on 2019-11-29.
  4. Engelbrecht (19 October 2009). Michelle Botes: Elegant and charming. Channel24.co.za. Retrieved on 6 December 2014.
  5. Isidingo actress Ashley Callie dies. Mail & Guardian (15 February 2008). Retrieved on 6 December 2014.
  6. Xulu (19 February 2008). Isidingo won't replace Ashley. The Times. Retrieved on 6 December 2014.
  7. Kennedy (23 January 2014). OBITUARY: Lesego Motsepe. Financial Mail. Retrieved on 6 December 2014.
  8. Staff writer (July 18, 2013). Gay friendly Isidingo celebrates 15 years. Mamba Online. Retrieved on April 15, 2020.