Laura Ikeji

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Laura Ikeji
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereLaura Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Maachị 1988 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
nwanneIsii Dezie
Dị/nwunyeChristopher Kanu Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2017 Dezie
ihe nkiriThe Real Housewives of Lagos Dezie
nnọchiaha nkeonweL484, L305214 Dezie

Laura Ikeji-Kanu [1] (a mụrụ na abalị iri na ise nke ọnwa atọ n'ime Otu puku afọ narị iteghete na iri asatọ na asatọ ( March 15, 1988)) [2] bu onye Naijiria na-eme blọgụ ejiji na onye ọchụnta ego. Ọ bụ ya chọpụtara Hey! Laura, ihe ntụrụndụ n'ịntanetị, ejiji na blọgụ obibi ndụ.

Mpụta na akwụkwọ akụkọ magazin na atụmatụ[dezie | dezie ebe o si]

Na abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febrụwarị na afọ puku abụọ na ịrị na asatọ (28 February 2018),ọ pụtara n'ihu akwụkwọ akụkọ The Guardian Life Magazine [3]. Ebe ọ kparịtara ụka banyere akwụkwọ ya "Otu esi enweta ego na Instagram". N'ọnwa Jun afọ puku abụọ na ịrị na asatọ (2018,) e gosipụtara ya na akwụkwọ akụkọ magazin Ụmụnwanyị Tata nke a maara nke ọma dịka TW Magazin [4] ya na onye na-eme ihe nkiri na Naijiria bụ Omoni Oboli .

N'afọ Puku abụọ na ịrị na asaa (2017), e gosipụtara ya na Egwuregwu Zuru Oke [5] na ndepụta na-egosi ndị ama ama ntụrụndụ metụtara ndị egwuregwu bọọlụ mbụ ma ọ bụ ndị na-arụsi ọrụ ike.

2017 - ugbu a[dezie | dezie ebe o si]

Nkwekọrịta nkwado[dezie | dezie ebe o si]

Na Ọnwa Mee na afọ puku abụọ na ịrị na asaa (2017), Akara ntutu Nigeria BK Unique Hair Inc binyere aka na akwụkwọ iwere Laura dịka onye nnọchi anya ika [6] ya na Rita Dominic . Na ọnwa Jenụwarị afọ puku abụọ na ịrị na asatọ (2018,) ụlọ ahịa dị n'ịntanetị na onye nkwado nke Big Brother Naija season 2 na 3 "Payporte" bịnyere aka na akwụkwọ iwere Laura dị ka onye nnọchianya ika. [7] Na ọnwa Julaị afọ puku abụọ na ịrị na asatọ (2018), ụlọ Gtex bịnyere aka na akwụkwọ iwere Laura dị ka onye nnọchi anya akara ya na Mercy Aigbe Gentry [8]

Ezughi oke[dezie | dezie ebe o si]

Na abalị anọ nke ọnwa Julaị afọ puku abụọ na ịrị na asatọ (4 July 2018), weputara isi ísì ya Ezughị oke [9] nke edekọtara erere tupu ụbọchị ewepụtara ya ka ọ kwupụtachara maka orire ya. [10]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Laura lụrụ Christopher Kanu . Di na nwunye ahụ nwere agbamakwụkwọ ụlọikpe ha na abalị iri na iteghete nke ọnwa Jenụwarị afọ puku abụọ na ịrị na asaa (19 Jenụwarị 2017), na Lagos State, Nigeria. [11] Agbam nkwụ ha [12] hiiri odu n'obodo ya dị na Nkwerre LGA, steeti Imo na abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ puku abụọ na ịrị na asaa (28 Jenụwarị 2017). Na ọnwa Julaị na afọ puku abụọ na ịrị na asaa (July 2017), di na nwunye a nabakọtara nwa mbụ ha ọnụ, Ryan Kanu, [13] na Texas, United States of America.

Na abalị iri na ise nke ọnwa Maachị ọfọ puku abụọ na ịrị na asatọ (15 Maachị 2018), o jiri Mercedes-Benz ọhụrụ mee ememe ụbọchị ọmụmụ ya. [14]

Nkwanye ugwu[dezie | dezie ebe o si]

Otu ECOWAS Female Parliamentarians Association (ECOWAS) [15] na ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mei, na afọ puku abụọ na ịrị na asatọ (Monday May 21, 2018) na Abuja, kwanyere osote onye isi ala Nigeria, Prọfesọ Yemi Osinbajo, nnukwute onte azụmahịa, Alhaji Aliko Dangote nakwa Davido, Don Jazzy, Laura Ikeji na ọtụtụ ndị ọzọ.

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Laura Ikeji-Kanu: Petite ball of fashion. New Telegraph. Archived from the original on 1 October 2018. Retrieved on 6 July 2018.
  2. My Dream Is To Own A Big Fashion Mall – Laura Ikeji-Kanu. The Daily Independent. Retrieved on 6 July 2018.
  3. Style Crush Of The Week: Laura Ikeji. The Guardian Life Magazine. Retrieved on 6 July 2018.
  4. A Grass to Grace Story! Omoni Oboli covers TW Magazine's June Issue - BellaNaija. BellaNaija. Retrieved on 6 July 2018.
  5. 5 Nigerian Entertainment Celebrities Related To Former Or Active Footballers - Complete Sports Nigeria. Complete Sports (15 July 2017). Archived from the original on 6 July 2018. Retrieved on 6 July 2018.
  6. Laura Ikeji now brand ambassador - The Sun News. The Sun (26 May 2017). Retrieved on 6 July 2018.
  7. Laura Ikeji Is Latest Payporte Ambassador - PM NEWS Nigeria. P.M. News (20 January 2018). Retrieved on 6 July 2018.
  8. Laura Ikeji, Mercy Aigbe Bag New Deals - PM NEWS Nigeria. P.M. News (3 June 2018). Retrieved on 6 July 2018.
  9. A Day With Laura Ikeji Kanu - PM NEWS Nigeria. P.M. News (7 June 2018). Retrieved on 6 July 2018.
  10. Laura Ikeji's new cologne Incomplete sold out before launch date. Nigerian Tribune (2 June 2018). Archived from the original on 1 July 2019. Retrieved on 6 July 2018.
  11. Weddings (2017-01-19). Laura Ikeji and Ogbonna Nwankwo are Married! (en-US). BellaNaija.
  12. Ogbonna Kanu, Laura Ikeji Traditional Marriage Date Fixed - Complete Sports Nigeria. Complete Sports (10 January 2017). Archived from the original on 6 July 2018. Retrieved on 6 July 2018.
  13. Linda Ikeji Celebrates with Her Sister, Laura as She Gives Birth to a Son (Photos) - INFORMATION NIGERIA. INFORMATION NIGERIA (20 July 2017). Retrieved on 6 July 2018.
  14. New Whip Alert! Laura Ikeji Kanu Gifts herself a Mercedes Benz - BellaNaija. BellaNaija. Retrieved on 6 July 2018.
  15. ECOWAS Female MPs set to honour Osinbajo, IBB, Dangote, others. Ghananewsonline (21 May 2018). Archived from the original on 6 July 2018. Retrieved on 6 July 2018.