Mohammed Mana

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mohammed Mana
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Akụkụ nkeNigerian senators of the 7th National Assembly Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereMohammed Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya7 Ọktoba 1950 Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Plateau State, onye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party, All Nigeria People's Party Dezie
ọkwa aghaizugbe Dezie

Mohammed Mana (amụrụ n'abalị asaa nke ọnwa Ọktoba afọ 1950) bụ onye nchịkwa agha nke Plateau Steeti n'agbata ọnwa Disemba nke afọ 1993 na ọnwa Ọgọstụ afọ 1996 n'oge ọchịchị ọchịagha Sani Abacha . [1] A hoputara ya dịka Sịnetọ n'ahụ maka ugwu Adamawa n'afọ 2007 n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị People's Democratic Party (PDP). [2]

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Mana n'abalị asaa nke ọnwa Ọktoba nke afọ 1950. Ọ gara kọleji gọọmentị, Keffi . O nwetara akara diplọma na teknụzụ mmanụ site n'ụlọ akwụkwọ quartermaster Ndị agha US n'afọ 1976. N'afọ 1987, ọ nwetara akara diplọma na nchịkwa ọhaneze na mahadum Ahmadu Bello, Zaria . [2]

Ọrụ agha[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka Gọvanọ Plateau Steeti, n'afọ 1994, Lt. Col. Mohammed Mana hiwere kọmishọn ga-eleba anya n'ime nsogbu agbụrụ dị na Jos . [3] Nsogbu ndị a bụ n'ihi esemokwu dị n'etiti Berom, Anaguta, na Afizere n'otu akụkụ, na agbụrụ Hausa -Fulani n'aka nke ọzọ. [4] Ihe butere ọgbaghara bụ nhọpụta Mana họpụtara onye Hausa ka ọ bụrụ "onye isi oche Kọmitii nlekọta" Jos.

Mana lara ezumike nká na ndị agha n'ọnwa June nke afọ 1999 mgbe Onye isi ala Olusegun Obasanjo nyere iwu na ndị niile bụ ndị nchịkwa ndị agha ga ala ezumike nka.

Ọrụ ndị nkịtị[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ bụrụ Sịnetọ n'onwa Mee nke afọ 2007, a họpụtara Mana ka ọ bụrụ onye otu kọmitii na Nhọrọ, Ike, Njikọta na Imekọ Ihe ọnụ. [2] A họpụtakwara ya ka ọ bụrụ osote onye isi ụtarị nke Sineti. Ọ kwadoro nkwado mmezi iwu n'ụlọ ọrụ n'ahụ maka oke ala n'afọ 2009 yana akwụkwọ iwu maka njikwa ụtaba, n'afọ 2009. [5] Mgbe ọ na -ekwu okwu n'onwa Maachị nke afọ 2009 na mkpesa Ndozigharị ntuli aka nke kọmitii nke ikpe ziri ezi nke Mohammed Uwais na-achị ọ tụrụ aro ka ndị isi otu ahụ họpụta onye isi Ụlọ ọrụ Ntuli Aka Mba, mana a ga -enyocha nyocha ikpe . [6]

Dika emechara Nnapụ ọchịchị n'ke nke ọnwa Febụwarị afọ 2010 na Niger, onye isi sineti David Mark rịọrọ Mohammed Mana na Sịnetọ John Shagaya nke Plateau Steeti ka ha jiri njikọ chiri anya ha na ndị isi ndị agha ọhụrụ nke Niger gbaa ha ume ka ha nabata ọchịchị onye kwuo uche ya. [7] N'ọnwa Maachị afọ 2010, a họpụtara Mana ka ọ bụrụ otu onye n'ime kọmitii mmadụ iri abụọ ga achọta ụzọ isi dozie nsogbu nke Jos na- enwe, ebe e nwere ọgba aghara na-enweghị atụ n'etiti ndị Alakụba na Ndị Kraịst . [8]

Na ntuli aka nke ntuli mba emere n'ụbọchị itooly nke ọnwa Eprel afọ 2011, Mana bụ onye na-asọ mpi na ntuliaka PDP ka ọ bụrụkwa onye ga-anọchite mpaghara ọchịchị sineti nke ugwu Adamawa. Agbanyeghị, ọ tụfuru nhọpụta. Mana tinyere akwụkwọ mkpesa megide nhọpụta Umar Bindo Jibrilla dị ka onye ga -azọ ntụli aka nke ugwu Adamawa. N'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Maachị afọ 2011, Ụlọikpe Kasị Elu nke dị n'Abuja kagburu mkpesa ahụ dị ka enweghị uru. Mana rịọrọ mkpesa a. [9] Akụkọ mbụ nke nsonaazụ ntuliaka mpaghara ọchịchị ugwu nke Adamawa kwuru na Bindo Jibrilla ( PDP ) meriri onye bụ gọvanọ Boni Haruna nke Action Congress of Nigeria (ACN), wee nweta vootu Puku iri asaa na ise, otu narị na iri na abụọ tụnyere Haruna nwere puku iri asaa na narị asatọ na iri itoolu. Onye mere ntụli aka n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị Congress for Progressive Change (CPC), Abba Mohammed, nwetara vootu puku iri abụọ na abụọ, narị asatọ na iri isii na isii. [10] Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) kọkwara nke a n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Eprel. [11] Agbanyeghị, ka ọ na -eru ụbọchị iri abụọ n'ato nke ọnwa Eprel, Njikọ Ntuli akaNaịjirịa na -akọ na Mana bụ onye otu PDP meriri ntuli aka ahụ . [12]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Nigeria States. Rulers.org. Retrieved on 2 May 2010.
  2. 2.0 2.1 2.2 Sen. Mohammed Mana. National Assembly of Nigeria. Archived from the original on 3 April 2010. Retrieved on 2 May 2010.
  3. Achilleus Chud-Uchegbu. "Jos - Once Upon a Peaceful Town", Daily Champion, 10 February 2010. Retrieved on 2 May 2010.
  4. "Whitepaper on the Report of the Commission of Inquiry into the riots of 12th April, 1994 in Jos Metropolis", Point Blank News, September 2004. Retrieved on 2 May 2010.
  5. "An Improved Senate, But Some Uninspiring Senators...", ThisDay, 24 May 2009. Retrieved on 2 May 2010.
  6. Stanley Yakubu. "National Assembly Will Decide Who Becomes INEC Chairman - Mana", Leadership, 29 March 2009. Retrieved on 2 May 2010.
  7. George Oji and Sufuyan Ojeifo. "Senate Tasks Ecowas, Others On Coup in Niger", ThisDay, 26 February 2010. Retrieved on 2 May 2010.
  8. "Jos - Northern Senators, Reps Move to End Crisis", Daily Trust, 11 March 2010. Retrieved on 2 May 2010.
  9. "Mana, Bent advised to obey court order on Senate tickets", Nigerian Daily, 30 March 2011. Retrieved on 23 April 2011.
  10. "NASS Poll: ACN Presidential Candidate Ribadu Loses In Adamawa", Online Nigeria, 4 December 2011. Retrieved on 23 April 2011.
  11. Collated Senate results. Independent National Electoral Commission. Archived from the original on 19 April 2011. Retrieved on 23 April 2011.
  12. Senatorial Elections. Nigeria Elections Coalition. Archived from the original on 13 April 2011. Retrieved on 30 December 2016.