Nnenna Oti

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nnenna Oti
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereNnenna Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Novemba 1958 Dezie
Ebe ọmụmụAfikpo North Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria, Katholieke Universiteit Leuven, Federal University of Technology Owerri Dezie
ogo mmụtaBachelor of Science in Agriculture, Master of Science, doctorate Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Nnenna Nnannaya Oti (a mụrụ na abalị iri na ise ọnwa Nọvemba (15 Novemba) 1958) bụ onye prọfesọ na Naijiria na-osote onye isi nke mahadum Federal University of Technology Owerri . Oti meriri Ikechukwu Dozie na abalị iri na atọ nke ọnwa Eprel afọ puku abụọ na ịrị abụọ na otu ( 13 Eprel 2021) wee malitekwa ọrụ dịka osote onye isi oche nke asatọ nke ụlọ akwụkwọ ahụ na abalị iri na itoolu nke ọnwa Juun afọ puku abụọ na ịrị abụọ na otu (19 June 2021)

Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nnenna Oti na Afikpo North, Steeti Ebonyi , Nigeria. Ọ natara nzere B. Agric. na sayensị ala site na Mahadum Nigeria, o jiri akwụkwọ klaasi mbụ (nke bekee kpọrọ First class honor) wee gụchaa.Ọ gara n'ihu wee nweta nzere masta na social science nke lekwasịrị anya na bayọlọji ala(soil biology) na bayọkemịstrị(biochemistry) site na otu mahadum Naịjirịa. Ọ gakwara n'ihu gaa mahadum Katọlik dị na Leuven ebe ọ nwetara diplọma postgraduate na injiniarịn mmiri, nweta ọpụrụiche. O nwetara akara ugo mmụta dọctọrete na nchekwa ala na gburugburu ebe obibi na mahadum Federal University of Technology Owerri . [1] [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Oti bụ onye isi ugboro atọ na ngalaba sayensị na teknụzụ ala n'ụlọ akwụkwọ nke ọrụ ugbo na teknụzụ ugbo na mahadum Federal University of Technology Owerri. Ọ bụbu onye isi oche ngalaba amụma nwoke na nwanyị nakwa onye isi ụlọ akwụkwọ ndi postgrajuete n'oge nke abụọ ya. Ọ bụ nnukwu ọka mmụta (prọfesọ) nke sayensị ala na nchekwa gburugburu ebe obibi. [1] [3]

Osote onyeisi oche Mahadum FUTO[dezie | dezie ebe o si]

Na abalị iri na atọ nke ọnwa Eprel afọ puku abụọ na iri abụo na otu (13 Eprel 2021), a họpụtara Oti dịka osote onye isi oche nke mahadum Federal University of Technology Owerri ka ọ nọchie Francis Chukwuemeka Eze mgbe ọchịchị ya ga-agwụ na abalị iri na itoolu nke ọnwa Juun afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (19 June 2021). Ọ meriri mmadụ isii ndị ọzọ wee nweta pasentị iri asaa na ise na ụma (75.5  %) wee merie onye ya na ya na-akpachi anya bụ Ikechukwu Dozie bụ onye nwetara pasentị iri isii na iteolu na ụma (69.7%). Ugbu a ọ bụ nwanyị mbụ na-anọ dika osote onye isi oche nke ụlọ akwụkwọ ahụ naka onye bụbu osote onye isi oche, ngalaba agụmakwụkwọ [4]

N'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (2021, nchịkwa ya chere nkatọ maka ịhọpụta Minista Nkwukọrịta na Akụnaụba Dijitalụ, Isa Ali Pantami nnukwu onye ọka mmụta Prọfesọ na-agbasoghị usoro ziri ezi. Otu ndi gụrụ na mahadum ahụ nke a kpọrọ Alumni Association of Federal University of Technology Owerri (FUTO) kpọrọ ihe nrite a aghụghọ ma kpọkuo ndị isi mahadum ka ha chegharịa echiche na nhọpụta ahụ [5] [6] . Otu Academic Staff Union of Universities (ASUU) kọwakwara nkwalite Ali Isa Pantami, na ọkwá onye prọfesọ dị ka nke “iwu akwadoghị.” ma kwe nkwa na ya ga-enye Oti [7] [8] ntaramahụhụ.

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Oti lụrụ Nnannaya Oti ma ha mụrụ ụmụ atọ. [1]

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Gbemisola (15 April 2021). Six things you probably didn't know about new FUTO female VC. The Nation Newspaper. Retrieved on 18 April 2021.
  2. Prof. Nnenna N. OTI. SAAT FUTO. Archived from the original on 20 April 2021. Retrieved on 18 April 2021.
  3. Idoko. "Professor Nnenna Oti emerges new Vice-Chancellor of FUTO", Nigerian Tribune, 14 April 2021. Retrieved on 18 April 2021.
  4. Ogugbuaja (15 April 2021). Oti emerges FUTO’s first female VC. The Guardian Newspaper. Retrieved on 18 April 2021.
  5. Award of professorship to Pantami inappropriate, alumni tells FUTO management | Premium Times Nigeria (en-GB) (2022-02-18). Retrieved on 2022-02-21.
  6. Reconsider Pantami’s professorship—FUTO alumni tells varsity management (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-02-18). Archived from the original on 2022-02-21. Retrieved on 2022-02-21.
  7. 'Pantami's professorship illegal' -- ASUU vows to sanction FUTO VC (en-US). TheCable (2022-02-14). Retrieved on 2022-02-21.
  8. ASUU declares Pantami's professorship illegal, to sanction FUTO VC, others (en-US). Punch Newspapers (2022-02-14). Retrieved on 2022-02-21.