Onyema Ugochukwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Onyema Ugochukwu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya9 Novemba 1944 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụeconomist, Onye ntaakụkọ Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Onyema Ugochukwu // (na-ege ntị) CON (amụrụ na abali iteolu n'ime ọnwa iri na otu, n'afọ otu puku, narị iteolu na iri anọ n'anọ) (9/11/1944) bụ onye Naijiria na-ahụ maka akụ na ụba, onye nta akụkọ, na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ugochukwu jere ozi dị ka onye ndụmọdụ pụrụ iche na nkwukọrịta nye onye isi ala Naijiria Olusegun Obasanjo na onye isi oche mbụ nke Niger Delta Development Commission (NDDC).[1] N'abalị iri abụọ na ise n'ọnwa abụọ n'afọ puku abụọ n'asatọ (25/2/2008), ụlọ ikpe ntuli aka nke steeti Abia kwupụtara na Ugochukwu bụ onye mmeri nke ntuli aka gọvanọ nke steeti emere na afọ puku abụọ n'asaa (2007) na Gọvanọ a họpụtara nke steeti abia.[2] Otú ọ dị, na abali iri n'otu, n'ime ọnwa abụọ n'afọ puku abụọ n'iteolu (11/2/2009) ụlọ ikpe mkpegharị ikpe na Port Harcourt kagburu mkpebi ahụ, ma kwupụta na Theodore Orji nke PPA meriri ntuli aka ahụ n'ezie.[3]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Onyema Ugochukwu na abalị iteolu, n'ime ọnwa iri na otu, n'afọ otu puku, nari iteolu na iri anọ n'anọ (9/11/1944) na Ohuhu, Umuahia, Abia Steeti, Nigeria. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Naijiria, Nsukka, nwete nzere nke BSc na Economics. Ọ lụrụ alụmalụ di na nwunye ma nwee ụmụ anọ.

Agha Biafra[dezie | dezie ebe o si]

Ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke sochiri ọchịchị ndị agha mbụ n'afọ otu puku, narị iteolu na iri isii n'isii (1966) batara n'agha obodo mgbe mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ Naijiria kewapụrụ dịka Republic of Biafra otu afọ ka e mesịrị. Ugochukwu debanye aha na ndị agha Biafra wee ruo ọkwa onyeisi ala tupu agha ebie n'afọ otu puku, narị iteolu na iri asaa (1970).

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Akụ[dezie | dezie ebe o si]

Usòrò:Ogunbiyi-Thatcher-Ugochukwu.jpg
Ugochukwu (n'aka nri) na Praịm Minista Britain, Margaret Thatcher (n'etiti), na Yemi Ogunbiyi (n'akụkụ aka ekpe) na 10 Downing Street

Mgbe Ugochukwu gụsịrị akwụkwọ na kọleji, e were ya dị ka onye enyemaka nyocha akụ na ụba nke ụlọ akụ etiti nke naijirịa Central (CBN). Ọ nọrọ na CBN afọ abụọ tupu ọ gbahapụrụ ọrụ na-ekwe nkwa na akụ na ụba iji gbasoo ezi mmasị ya, akwụkwọ akụkọ.

Akwụkwọ akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

Ugochukwu sonyeere otu Business Times dị ka onye nyocha akụ na ụba na onye ọrụ ọsụ ụzọ nke ihe ga-emesị bụrụ akwụkwọ akụkọ gbasara ego na Naịjirịa. Ugochukwu ruru n'ọkwa wee bụrụ onye nchịkọta akụkọ akwụkwọ akụkọ Business Times n'afọ otu puku, nari iteolu na iri asaa n'asaa ruo otu puku, narị iteolu na iri asatọ n'abụọ (1977 ruo 1982). N'afọ otu puku, nari iteolu na iri asatọ n'atọ (1983), Ugochukwu ghọrọ Editor na Chief nke akwụkwọ akụkọ West Africa nke dị na Lọndọn, ebe o dere ọtụtụ ihe gbasara mmepe, iji nye nghọta nke ọma maka nsogbu ụgwọ n'Afrịka. O mechara laghachi Naịjịria ka ọ bụrụ onye nchịkọta akụkọ n'isi nke Daily Times of Nigeria ma emesịa họpụtaya na bọọdụ ya dịka onye isi nchikwa nke ndị ọrụ na mmepe. Ọ lara ezumike nkà na akwụkwọ akụkọ n'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu n'anọ (1994) dika onye isi nchikwa nke mbipụta. Ugochukwu nọgidere na-arụsị ọrụ ịke dịka media consultant for the Dow Jones Financial News Service. N'oge niile Ọ na-arụ ọrụ dịka onye nta akụkọ, Ugochukwu ezutela ma gbaa ọtụtụ ndị isi ala ajụjụ ọnụ – gụnyere mgbe ahụ onye isi ala Briain british prime minister Margaret Thatcher,[4] South African President Nelson Mandela, onye isi ala Jamaica P. J. Patterson, French President Jacques Chirac, Venezuelan President Hugo Chavez, Cuban President, Fidel Castro, Nigerian presidents Ibrahim Babangida, Muhammadu Buhari, Sani Abacha, and Abdusalami Abubakar – ma wepụta akwụkwọ gbasara mmepe akụ na ụba na ndọrọ ndọrọ ọchichị Afirika na ọgbakọ di iche iche gunyere Oxford University, England, na Uppsala University.[5]

ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ugochukwu na Onye isi ala United States, Bill Clinton

Site na nloghachi Naịjirịa na ọchịchị onye kwuo uche ya na-afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu n'asatọ (1998), Ugochukwu ghọrọ onye nduzi mgbasa ozi na "Obasanjo for President" Campaign Organisation, ma nye aka nke ukwuu na nhọpụta nke Olusegun Obasanjo dị ka onye isi ala Naịjirị. A họpụtara Ugochukwu dị ka Onye isi enyemaka pụrụ iche nke Onye isi ala na nhazi obodo na ihe gbasara ọha. Ọ butere ụzọ mkpọsa "National Rebirth" nke e mere iji tinye omume ọma ịhụ mba n'anya n'ime uche mba nke ọtụtụ afọ nke ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nrụrụ aka mebiri. Ọ bụ n'elu ikpo okwu a ka Ugochukwu malitere "Nkwupụta Naịjirịa nke Ọrụ Mmadụ", nke na-ekwupụta n'akụkụ ụfọdụ: "Onye a na Ọrụ Mmadụ... Ọ na-achọ iweta nnwere onwe na ibu ọrụ n'ime nguzozi ka mma, iji mee ka ọ pụta ìhè ma mee ka a mara ọrụ anyị ji ibe anyị na mba anyị ụgwọ. "[5]

Nsogbu Niger Delta[dezie | dezie ebe o si]

Iji mee ka obi dajụọ ọgba ghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mmanụ-ọgaranya Niger Delta mpaghara south Naijirịa, onye isi ala bụ Obasanjo bịanyere aka ya na Niger Delta Development Commission (NDDC) omume nke afọ puku abụọ (2000) n'ime iwu. Ugochukwu a họpụtara dika onye ọsụ ụzọ onye isi oche nke kọmitii ekere ọhụrụ, ne emepe steeti iteolu na-emeputa mmanụ na mba ahụ , n'oke ego mmanụ.[6]

Ugochukwu nyere aka ịkọwa ọhụụ onye isi ala banyere mmepe na-adịgide adịgide na mpaghara Niger Delta, ma mepụta iwu nke na-agba ume imekọ ihe ọnụ n'etiti ndị metụtara ya na ndị isi agbụrụ ha, ndị agha ntorobịa, ụlọ ọrụ mmanụ na ndị isi ha, gọọmentị Naijiria, na Òtù Na-abụghị Gọọmentị, na òtù mba ụwa dị ka United Nations Development Programme (UNDP) na World Bank. N'oge Ugochukwu nọ n'ọkwa, NDDC lekwasịrị anya na mmeghachi omume akụ na ụba na ọganihu, imezigharị gburugburu ebe obibi, na mmepe nke akụrụngwa mmekọrịta mmadụ na ibe ya.

Ugochukwu (etiti) na Onye isi ala Cuban Fidel Castro, na José Martí International Airport, Havana, Cuba.

Na ngwụcha afọ anọ ọ nọrọ na NDDC, Ugochukwu laghachiri Abuja ma gaa n'ihu na-eje ozi dị ka onye ndụmọdụ pụrụ iche nke onye isi ala na nkwukọrịta. O nwere mmasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị steeti, wee gbaa arụkwaghịm n'ọfịs iji sonye na agbụrụ gọvanọ nke Abia State. N'afọ puku abụọ na isii (2006), a malitere mkpọsa maka Abia Rebirth (CARE), na nkwa iwughachi steeti ahụ. N'abalị iri na atọ n'ọnwa iri na abụọ n'afọ puku abụọ na isii (13 Disemba 2006), Ugochukwu pụtara dị ka onye na-azọ ọkwa onye otu People's Democratic Patị (PDP) maka ntuli aka gọvanọ nke Abia Steeti n'afọ puku abụọ na asaa (2007). Ebubo nke ntuli aka, na ime ihe ike, mebiri agbụrụ ahụ a na-ese okwu nke ukwuu, nke niile rụzuru na nhọpụta nke onye mmegide Ugochukwu, Theodore Orji nke Progressive Peoples Alliance (PPA).

Mgbalị igbu ọchụ[dezie | dezie ebe o si]

E mere mgbalị igbu Ugochukwu n'oge ntuli aka Gọvanọ nke Abia Steeti na abalị iri na-anọ n'ọnwa anọ, n'afọ puku abụọ na-asaa (14 Eprel 2007). Ndị mwakpo ahụ gbara égbè n'ụgbọala ya, na-emerụ otu n'ime ndị nche ya nke State Security Service (SSS), bụ ndị merụrụ ahụ site n'isi na aka ya. Ugochukwu, onye na-azọ ọkwa onye isiala na onye na-ebute ụzọ na ntuli aka ahụ, boro ndị na-emegide ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na All Nigeria Peoples Party (ANPP) na Progressive Peoples Alliance (PPA) ụta maka mwakpo ahụ.[7]

Ụlọikpe mkpegharị ikpe maka ntuli aka[dezie | dezie ebe o si]

Ugochukwu chọrọ imezị ya n'ụlọ ikpe nhọpụta ndị ọchịchị Abia State. A kagburu nhọpụta gọvanọ Theodore Orji na abali iri abụọ nke ọnwa abụọ n'afọ puku abụọ na asatọ, (25 Febuarị 2008) n'ini na orughị eru ịzọ ọkwa n'ọkwa ahụ. Orji na onye osote ya dara n'agbaghị arụkwaghim n'okwa ha n'ọchịchị Abia Steetị, abalị iri atọ (30 days) tupu ntuli aka ahụ dika ekwuputere n'ịwụ mke 1999. Ụlọ ikwe ahụ kwukwara na gọvanọ Ọrji emeghi ka ọ pụta ìhè n'enweghi obi abụọ ọbụla inwe mmekọ ya na òtù nzuzo

Ugochukwu wee bụrụ onye e si otú a kwupụta na ọ bụ onye meriri n'ụzọ iwu kwadoro na ntuliaka gọvanọ e mere n'ọnwa anọ, n'afọ puku abụọ n'asaa (April 2007), na Gọvanọ-ahọpụtara nke Abia Steeti - na-eche ihe ga-esi na ya pụta n'ụlọ ikpe mkpegharị Port Harcourt. Òtu ọ dị na, n'abalị iri na otu nke ọnwa abụọ, n'afọ puku abụọ na iteolu, (11 February 2009) ụlọ ikpe mkpegharị ikpe dị na Port Harcourt kagburu mkpebi ahụ, na-ekwupụta na Theodore Orji nke PPA n'ezie emeriela ntuli aka ahụ.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

  • Ike na Ọchịchị: Ihe Nketa nke Dr. Michael Okpara ( )[8]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

 

  • Niger Delta Development Commission (NDDC)

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Politics : NDDC is reconstructing the destruction of 50 years —Onyema Ugochukwu, NDDC Chairman. News.biafranigeriaworld.com (30 September 2003). Archived from the original on 11 October 2012. Retrieved on 28 October 2012.
  2. "Suicide bomber kills 8, injures 100 in Nigerian church", Reuters. Retrieved on 28 October 2012.
  3. Appeal Court Affirms Orji As Abia Governor. ThisDay (12 February 2009). Retrieved on 23 March 2010.
  4. Margaret Thatcher — Interview for Daily Times of Nigeria. Thatcher Archive: COI transcript. Margaret Thatcher Foundation (5 May 1989). Retrieved on 23 March 2010.
  5. 5.0 5.1 Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified. Archived from the original on 28 September 2007. Retrieved on 7 February 2007.
  6. "Boost for Nigeria Delta", BBC News, 11 December 2001. Retrieved on 23 March 2010.
  7. Ademola Adeyemo (17 April 2007). Presidential Polls: Can Police Curb Violence?. ThisDay. Archived from the original on 30 September 2007. Retrieved on 23 March 2010.
  8. Power and Governance: The Legacy of Dr. Michael Okpara (978027264X) by Onyema Ugochukwu, Dr. Michael Iheonukara Okpara Foundation @. Bookfinder.com. Retrieved on 28 October 2012.

13. "Return.com" Africa.resources.com. 9 February 2009. Retrieved 28 october 2012.

14. Power and Governance: The Legacy of Dr. Michael okpara (978027264X) by Onyema Ugochukwu, Dr michael iheonukara Okpara Foundation @" Bookfinder.com. Retrieved 28 october 2012.

15. Archived 27 september 2007 at the wayback Machine

Àtụ:S-start Àtụ:Succession box Àtụ:S-end