Rabia Salihu Sa'id

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rabia Salihu Sa'id
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Eprel 1963 Dezie
Ebe ọmụmụWangara Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, Arabic, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụphysicist, academic Dezie
ụdị ọrụ yaỌ̀mụ̀ntụdị Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Reading, Bayero University Kano Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
Ihe nriteBBC 100 Women, OWSD-Elsevier Foundation Award Dezie

Rabia Salihu Sa'id (a mụrụn'ụbọchị nke 21 n'ọnwa Eprel n'afọ 1963) bụ onye dibia bekee nke Naịjirịra, bu prọfesọ ihe gbasara mbara igwe na ihu igwe, na onye nnyocha na Mahadum Bayero nke Kano Ọ na-eme nnyocha mbara igwe na ihu igwe, patịkụl fiziks, na ihe gbasara elektrọnik. Sa'id bụ onye nkwado na onye ndụmọdụ maka ụmụ agbọghọ nọ na sayensị na Visiola Foundation na Peace Corps ; o so hiwe Nigeria's Association of Women Physicists. Ọ bụ onye nkwado na onye ndụmọdụ nke sayensị, teknụzụ, injiniariịn, na mgbakọ na mwepụ (STEM) nakwa onye mmezi nke British Council's Active Citizens' Programme.

Sai'd enwetela onyinye ọrụ mmekọrịta sitere na Institute of Physics Applied na Bern,dị na Suwizalandị na Ford Foundation wee bụrụ onye otu African Scientific Institute (ASI). N'afọ 2015, ọ natara Elsevier Foundation Award for Women Scientists in the Developing World. [1] Ndị British Council nyekwara ya onyinye nhubaama n'afọ 2015 maka ọrụ mwulite obodo ya. BBC nyekwara ya onyinye nhubaama dịka akụkụ nke ihe omume usoro 100 Women .

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Rabia Sa'id na Wangara, obodo dị na okpuru ọchịchị obodo Gezawa nke Kano Steeie, na mgbago ugwu Naịjiria, [2] ebe ụmụ agbọghọ nwere ohere agụmakwụkwọ ole na ole, ọtụtụ na-alụrụ di na nwunye mgbe ha dị afọ iri na ụma, a na-atụkwa anya na ụmụ nwanyị ga-anọ n'ụlọ. Kosiladị, nna ya chọrọ ka ọ bụrụ dọkịta. Ọ bụ onye otu ndị agha Naịjirịa nwere nwunye abụọ ma mụta ụmụ iri. [3]

Sa'id gara ụlọ akwụkwọ ndị agha ma bụrụ onye mdụ na klaasị ya. [3] Ọ họọrọ ịlụ di mgbe ọ dị afọ 18, ozugbo ọ gụsịrị akwụkwọ na kọleeji. Ọ bụ nne nye ụmụ isii. [4] Ụmụ ya abụọ chọrọ nlekọta ahụike (otu n'ime ha bu ụkwụ gbara ngọ pụta ka a mụrụ ya, nke ọzọ bu ọrịọ́ sịkụl sel ka a mụrụ ya), nke gbakwunyere na ihe ịma aka nke ya onwe ya i nweta ogo mmụta agụmakwụkwọ ka elu.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mmụta na mmalite ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Sa'id malitere agụmakwụkwọ ya mgbe ọ dị afọ 29 were nwee ụlọ akwụkwọ ọta akara iji kwụọ ụgwọ maka agụmakwụkwọ ya. O nwere akara ugo mmụta bachelọ na sayensị, nzere mastas na Ph.D na Fiziks nke ọ gụrụ na Mahadum Bayero dị na Kano . [5] Na Septemba afọ 1999, ọ malitere ọrụ dị ka onye na-enyere aka na nkuzi na Mahadum Bayero. [6] N'afọ 2002, na agụmakwụkwọ n'efu International Fellowships Program (IFP) nke Ford Foundation, ọ gụrụ maka gburugburu ebe obibi na mmepe n'ogo mastas na Madadum nke Reading na Yunaịted Kịndọm. [7] [8]

Onye nkuzi[dezie | dezie ebe o si]

Ọ malitere ịrụ ọrụ n'afọ 1999 na Mahadum Bayero [6] ma bụrụkwa prọfesọ ndị ogo bachelọ na ogo mmụta dị elu n'ihe gbasara ihe gbasara mbara igwe na ihu igwe. [5] Site n'afọ 2015, ọ bụ onye na-esote Diin na ngalaba na-ahụ maka ụmụakwụkwọ nke Mahadum. [1]

Nnyocha[dezie | dezie ebe o si]

Ọ natara ọkwa nnyocha na mahadum, ebe ọ na-eme nyocha mbara igwe na ihu igwe, patịkụl fiziks, na ihe gbasara elektrọnik. Ọ na-eme nnyocha ya iji dozie nsogbu ndị metụtara gburugburu ebe obibi nke Naịjirịa. [5] Iji belata ọnụ ọgụgụ nke osisi a na-egbutu maka nkụ, dịka ọmụmaatụ, otu nnyocha e mere bụ iji obere iberibe osisi sitere n'ọrụ ịkwa osisi mee ihe dịka mmanụ ọkụ, were si otú a belata ọnụego nke oke ọhịa nke obodo. Ọ na-achịkọtakwa ahịrị gbasara mbara igwe ma na-amụ banyere mmetụta nke igbu osisi [4] na uzuzu erosọl na ọnọdụ ihu igwe. Ebumnuche ya bụ ị kwalite ndabere dị elu na Naijirịa n'ebe ike ọkụ ndị ọzọ e megharịrị ọhụrụ dịka ike ifufe, ike anyanwụ, na ike mmịrị - ndị na-anaghị emerụ gburugburu ebe obibi ahụ ka mmanụ ọkụ mma. [7] [3]

N'afọ 2010, ya na Dọkịta C. Matzler rụkọrọ ọrụ, bụ onye sayensị nke na-ahụ maka ihe omimi na mbara igwe, na Institute of Applied Physics, Mahadum nke Bern,dị na Suwizalandị dị ka onye nnyocha sayensị ọbịa ihe ruru ọnwa anọ. [8] Na Jenụwarị afọ 2013, e mere ya African Scientific Institute (ASI) Fellow of Physics, [9] [10] nke bụ mkpakọrịta na-asọpụrụ ma na- eche echiche nke ndị mmụta, ndị nnyocha, na ndị ọchụnta ego. [11]

Mgbasa ozi STEM[dezie | dezie ebe o si]

Sa'id na-arụ ọrụ na sayensị, teknụzụ, injiniarịn, na mgbakọ na mwepụ (STEM). O so na ndị hiwere Association of Women Physicists nke Naijirịa n'afọ 2011, nke na-agba ụmụ nwanyị ume ka ha bụrụ ndị ọkà mmụta sayensị na fiziks, na-achọ imeziwanye agụmakwụkwọ fiziks n'ụlọ akwụkwọ, ma na-enye ụmụ agbọghọ onyinye nturuugo. Sa'id gbakwara ndị ntorobịa ume isonye site na ịdụ ha ọdụ na mmemme sayensị obodo na nke mba, [5] ọrụ efu Peace Corps Nigeria Alumni Foundation na Visiola Foundation. [8] Ọ na-ekwu na ọ na-arụsi ọrụ ike na mgbasa ozi STEM n'ihi na e nwere nrụgide otu na ihe mgbochi ụmụ agbọghọ, ọkachasị ndị nọ na mgbago ugwu Naijirịa, ga-emerịrị iji chụso agụmakwụkwọ na ọrụ na mpaghara ndị a. Na mgbakwunye, "ọtụtụ ụmụ agbọghọ na sayensị ga-apụta na azịza nke sayensị na-enye abụghị naanị maka mkpa otu ndị." [12] Na mgbakwunye, e nwere nnukwu ekele maka ọrụ ebe e nwere ngwa bara uru, dịka ọrụ ụlọakụ na ọgwụ. [13]

Onyinye mmata[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2015 ọ bụ onye natara otu n'ime onyinye ise Elsevier Foundation maka ụmụ nwanyị ndị ọkà mmụta sayensị na ụwa na-emepe emepe. [3] E gosipụtara na mmekorita ya na <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Organization_for_Women_in_Science_for_the_Developing_World" rel="mw:ExtLink" title="Organization for Women in Science for the Developing World" class="cx-link" data-linkid="101">Organization for Women in Science for the Developing World</a> (OWSD) na The World Academy of Sciences (TWAS), ihe nrite afọ ahụ bụ maka fiziks na mgbakọ na mwepụ, yana onyinye Sa'id na ngalaba nke fiziks nke mbara igwe. [5] Ọ natara onyinye a maka oru ya banyere nsogbu gburugburu Naijirịa, nke e mere n'ụbọchị 14 ọnwa Febụwarị afọ 2015 na nzukọ kwa afọ nke American Association for the Advancement of Science (AAAS) na San Jose, dị na Kalifoniya.

N’ọnwa Ọgọstụ afọ 2015, onye ntaakụkọ BBC Claudia Hammond gbara Sa’id ajụjụ ọnụ maka otu ihe omume BBC World Service, [6] ma gosipụta ya na ihe omume usoro ụmụ nwaanyị 100 BBC na- eme kwa afọ, na-egosipụta mbọ ọ na-agba iji kwalite mmụta sayensị na Naịjirịa. [14] N'afọ sochirinụ (2016) e gosipụtara ya na magazin ịntanetị The Nigerian Academia na ndepụta nke ụmụ nwanyị Naijiria ndị a ma ama na sayensị. [8]

Nkwado[dezie | dezie ebe o si]

Na mgbakwunye na ndụmọdụ ọ na-eme na Peace Corps na Visiola maka mgbasa ozi STEM, ọ bụ onye nhazi na British Council Active Citizens' Programme, bụ onye na-agba ndị na-eto eto ume ị zụlite usoro nkwukọrịta udo maka nkwado mmepe obodo ha. [8]

Ọ bụ otu n'ime mmadụ itoolu a kwanyeere ugwu dịka "ụmụ nwanyị na-akwado na ndị mmeri" na Naịjirịa na Machị afọ 2015 dịka akụkụ nke <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/International_Women's_Day" rel="mw:ExtLink" title="International Women's Day" class="cx-link" data-linkid="114">International Women's Day</a> site n'aka ndị British Council na abụọ nke mmemme mmepe ya, Nigeria Stability and Reconciliation Programme (NSRP) na Justice for All (J4A) Programme. [15]

Ihe e deturu[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Notelist

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "Early-Career Women Scientists From Developing Countries Honored at AAAS Annual Meeting", AAAS - The World's Largest General Scientific Society, 10 February 2015. Retrieved on 10 December 2016.
  2. "Rabia Salihu Sa'id", Bayero University. Retrieved on 1 December 2016.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Bert (23 February 2015). 5 women scientists tell their stories of hard-earned success. Elsevier Connect. Elsevier. Retrieved on 11 December 2016.
  4. 4.0 4.1 Venton (17 February 2015). Tough As Nails: Female Scientists Rise Up In Nigeria. NPR. Retrieved on 14 December 2016.
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 5.4 Schemm (10 February 2015). Here are the winners of the Women in Science Elsevier Foundation Awards. Elsevier Connect. Elsevier. Retrieved on 11 December 2016.
  6. 6.0 6.1 6.2 Claudia Hammond. "Nigerian Physicist sold her Jewellery for Science", Discovery, BBC World Service. Retrieved on 1 December 2016.
  7. 7.0 7.1 Getting Ahead Through Higher Education - Ford Foundation Fellowships - 2003-11-07. Voice of America (30 October 2009). Retrieved on 12 December 2016.
  8. 8.0 8.1 8.2 8.3 8.4 "Ten Distinguished Nigerian Women In Science", The Nigerian Academia, 21 October 2016. Retrieved on 12 December 2016.
  9. Fellows in Physics. African Scientific Institute. Archived from the original on 4 August 2017. Retrieved on 14 December 2016.
  10. "African Scientific Institute", Legali, 7 February 2013. Retrieved on 14 December 2016.
  11. ASI Fellows. Retrieved on 14 December 2016.
  12. Okeke. "Nigeria: Girls Urged to Develop Confidence in Maths, Science", Daily Trust (Abuja), 7 October 2015. Retrieved on 14 December 2016.
  13. Covenant University Hosts 2nd National Conference of Women in Physics. Covenant University (17 June 2013). Archived from the original on 20 December 2016. Retrieved on 14 December 2016.
  14. "Who are the 100 women?", BBC. Retrieved on 1 December 2016.
  15. International Women's Day: British Council To Honour Nine Women. International Centre for Investigative Reporting (7 March 2015). Retrieved on 12 December 2016.

Ọgụgụ ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Nke Rabia Salihu Sa'id

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]