Sule Lamido

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sule Lamido
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoSule Lamido Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Ọgọọst 1948 Dezie
Ebe ọmụmụBirnin Kudu Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, diplomat Dezie
Ọkwá o jiMinister of Foreign Affairs, Governor of Jigawa State Dezie
ebe agụmakwụkwọGovernment College, Birnin Kudu, Barewa College Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
agbụrụNdi Haụsa Dezie
Sule Lamido
Foreign Affairs Minister of Nigeria
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Preceded byIgnatius Olisemeka
Succeeded byOluyemi Adeniji
Governor of Jigawa State
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Preceded bySaminu Turaki
Succeeded byBadaru Abubakar
Personal details
Born (1948-08-30) 30 Ọgọstụ 1948 (age 75)
Bamaina, Northern Region, British Nigeria
(now Bamaina, Birnin Kudu, Jigawa, Nigeria)
NationalityNigerian
Political partyPeople's Democratic Party (PDP)
Children11

A mụrụ Sule Lamido na (n'ụbọchi iri atọ n'ọnwa ọgọstụ afọ 1948) Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ozi okwu mba ofesi nke obodo Naịjirịa site na 1999 ruo 2003. A hoputara ya dịka onye ochichi nke Jigawa Steeti n’onwa Eprel afọ 2007. O so n’otu ndị ọchịchi ara aga bụ People's Democratic Party (PDP). Ọ dọrọ ndọrọ ọchịchị nke ọma ị laghachi na nhọpụta ndị ọchịchị na-ụbọchị nke iri abụọ na isii n'ọnwa Eprel afọ 2011. N’afọ 2015, ya na ụmụ ya nọ n'ikpe maka izu ego obodo site n’aka EFCC . [1] [2] [3] [4] [5]

Ọrụ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Lamido na n'ụbọchị iri atọ n'onwa Ọgọstụ afọ 1948 na Bamaina, Birnin Kudu ọchịchị mpaghara nke Jigawa Steeti Naijiria .

Lamido banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị dịka onye otu aka-ekpe-isi nke Redemption Party (PRP) na Naijiria nke abụọ . Ọ ghọrọ odeakwụkwọ mba nke Social Democratic Party n'oge Naijiria nke atọ, ebe ọ natara nkatọ maka etu o si mee ntuli aka onye isi ala nke n'ụbọchi iri na abụọ n'ọnwa juun afọ 1993 nke Moshood Abiola meriri, bụ onye e gbochiri ịbanye n'ọchịchị. [6]

Mgbe onye isi ochichi ndị agha bụ General Sani Abacha kwupụtara atụmatụ ya ịlaghachi na ọchịchị onye kwuo uche ya, Lamido bụ onye otu mbido nke Social Progressive Party, ọ bụkwa onye odeakwụkwọ mba nke otu ọhụrụ ahụ. [7] A tụrụ ya mkpọrọ na-afọ 1998 site n'aka Abacha maka ịkatọ atụmatụ Abacha ime ka ọ dịgide n'ọkwa. [6] Mgbe Abacha nwụrụ na mberede na-ọnwa June afo 1998, General Abdulsalami Abubakar kwupụtara usoro atụmatụ mgbanwe wee mepụta otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ maka ịzọ ọkwa ntuli aka 1999 Lamido ghọrọ onye otu PDP. Ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ nke Jigawa Steeti na ntuli aka 1999 na mmalite nke Naijiria nke anọ, ma onye otu nke All People's Party (APP) Ibrahim Saminu Turaki meriri ya . [8]

Onye ozi mba ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Onye isi ala Olusegun Obasanjo họpụtara Lamido dịka onye ozi nke mba ofesi na-ọnwa Juun n'afọ 1999, nke a kpatara esemokwu n'etiti Lamido na onye nlekọta ya bụ Abubakar Rimi bụ onye agbaturu dìka osote onye isi oche nke Obasanjo ma na-agbakwa mbọ i nweta ọrụ onye ozi nke mba ofesi. [9] Esemokwu dị n'etiti Lamido na Rimi digidere. N'ọnwa Disemba afọ 2003 ha abụọ ekwekọrịtaghị na nhọrọ onye isi oche otu kọmiti a họpụtara ga-enyocha onyeisiala mpaghara nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ, nke a mere ka arụmụka a na-akawanye njọ n’ihe otu onye nnọchiteanya kọwara dịka “akparaghị ókè omume”. [10] N'ọnwa Ọktọba afọ 2006, Lamido kọwara Rimi dị ka "mmegide nke ọchịchị ya n'oge gara aga". [11] Agbanyeghị, n'oge nleta nke ikike na nke Rimi n'ọnwa Disemba afọ 2007 Lamido kọwara ya dị ka isi ihe na-enweghị ike ileghara anya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria. [12]

N'ọnwa Jenụwarị 2001, Naịjirịa nyefere Iran ikike ịbụ Onyeisi otu nke 77. N'ikwu okwu na mmemme inyefe aka ahụ, Lamido nyere akụkọ ịnụ ọkụ n'obi banyere ọganihu G77 n'okpuru ọchịchị Nigeria. Ndị nnọchiteanya si mba ndị ọzọ kwetara na e mezuola ọtụtụ ihe. [13] Ka ha na Prime Minista Britain Tony Blair nọ n'ọnwa Septemba afọ 2001 na London, Lamido gwara BBC na Obodo Britain nwere obi ụtọ maka ọtụtụ nsogbu na-eweghasị udo na ọganiihu nke Afrika, Ọ kọwara nzukọ ahụ dị ka "nzukọ dị egwu" [14] N’otu ọnwa ahụ, o hibere kọmitii na-ahazi ọgbakọ mba ụwa maka mgbere mmadụ, mmekpa ahụ ụmụaka, ọrụ ụmụaka na ịgba ohu. O kwuru na ọtụtụ narị ndị ahịa mgbere Naijiria nwụrụ ka ha na-achọ ịgafe Ọzara Sahara na Oke Osimiri Mediterenian iji ruo Europe . [15] N'ikwu okwu na United Nations N'ọnwa Nọvemba afọ 2001, Lamido kọwara ajọ mmetụta nrụrụ aka nke ọchịchị onye kwuo uche ọhụrụ dịka Naijiria, ma kpọọ oku maka "ngwa ọrụ mba ụwa" megide ịnyefe ego ezuru n'ike na mba ọzọ. [16]

N'ọnwa Jenụwarị afọ 2003, Komitii na-ahụ maka ndị isi nke nke ụlọ Ndị Nnọchiteanya gara leta Pakistan, na-egosi na ọ chọrọ ikpezi esemokwu ahụ banyere Kashmir, na-enweghị ike ịkpọtụrụ ụlọ ọrụ ozi mba ọzọ. Lamido degara Sadiq Yar'Adua, onye isi oche nke Kọmitii ahụ, na-akọwa ihe ize ndụ nke njem dị otú a na-enweghị ihe amara banyere njikọta siri ike nke njikọ aka. Yar'Adua ji were iwe, na-asị "... n'onweghi onye nọ ebe a dịka mgbakwunye nke ụlọ ozi Sule Lamido. Anyị abụghị ụmụ ya; usoro iwu mba ofesi ya adighi-ejide anyi. " [17]

N'ọnwa Maachị afọ 2003, Lamido mere mkpesa maka ihe Gọvanọ Turaki nke Jigawa Steeti kwuru na gọọmentị etiti elegharala steeti ahụ anya, na-akpọ ya ka o kwuo maka etu o si mefuo ego gọọmenti etiti.

Ọru Emechaa[dezie | dezie ebe o si]

N'onwa Mee afọ 2003, mgbe PDP furu efu na ntuli aka ozo na Jigawa Steeti, Lamido kwuputara na e meghariri ntuli aka ahụ na nkwado nke All Nigeria People's Party (ANPP). [18] N’ọnwa Ọgọst nke afọ 2006, a kọrọ na mpaghara ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke PDP ajụla Lamido dịka onye ga-azọ ndọrọ ndọrọ ọkwa Gọvanọ 2007. [19] N'agbanyeghị, n'ọnwa Eprel afọ 2007, Lamido zọrọ wee merie ntuli aka okwa gọvanọ na Jigawa Steeti site n'enyemaka nke gọvanọ na-achị n'oge ahu, Saminu Turaki bụ onye pụrụ na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị People's Democratic Party n'ọnwa ndị dị n'ihu ntuli aka ahụ. Ọ batara n'ụlọ ọrụ nn'ụbọchị ịri abụọ n'itoolu n'ọnwa Mee afọ 2007. [6] Ka emechara ntuli aka ahụ, ọ kpụpụrụ onye bu ya ụzọ Saminu Turaki maka ebubo na-ojikwaghị ego obodo nkeoma. na mbù o siri ya ike inweta ndị ga-akwụ ụgwọ iji wee gbapụta ya. O boro Lamido ebubo na ọ na-eyi ndị ndu Jigawa ụjọ ka ha ghara iguzo dị ka ndị e tinyere ya aka iji mee ka agbapụta ya. Lamido gọrọ ebubo ndị a. [20]

N’ọnwa Juun afọ 2007, Lamido boro ụlọ akụ ndị ọhụụ ebubo na ha na-enyere ndị gọvanọ steeti aka ịkwakọrọ akụ ha, ma kpọọ oku ka iwu sie ike. [21] N'onwa Julai afọ 2007, Lamido kwuputara atumatu itinye ego ijeri naira abuo n’ime onwa isii na-abia abia, were ego were wughari a ulo akwukwo ma nyekwa ha ihe ndi eji eme nkuzi. [22] Steeti ahụ tinyekwara ego dị nde naịra narị anọ na iri anọ na ise (N450m) maka ọzụzụ ndị nkuzi na-akụzi isi ọmụmụ na kọleji. [23] Ọ malitere mmemme ihe owuwu buru ibu, nke ikike mmepe isi obodo Dutse na Ikike ụlọ Jigawa Steeti duziri. [24] N'ọnwa Septemba, afọ 2009, Lamido kwere nkwa ịnye ndị na-etinye ego na njem nleta na ile ọbịa na Jigawa Steeti ohere ibupụta ala na akụrụngwa bụ n'efu. [25] N’ọnwa iri na abụọ n’afọ 2009, Lamido kwupụtara atụmatụ nke a ga-enye ndị arịrịọ ego kwa ọnwa iji kwụsi ịnọ n’okporo ụzọ. [26]

N’ọnwa Disemba afọ 2009, akọwara na Olusegun Obasanjo ebidola ịmanye Lamido ka ọ bụrụ osote onyeisiala PDP na ntuliaka nke afọ 2011. [27] Lamido dọrọ ndọrọ nke ọma maka ntuli aka nke ụbọchị iri abụọ na isii n'ọnwa Eprel afọ 2011. O nwetara vootu dị n'ọnu ogụgụ Puku Narị isii na iri asaa na isii, nari atọ na asa, ya na onye so ya n'azụ Badaru Abubakar nke otu Action Congress of Nigeria (ACN) nwetara vootu puku narị atọ na iri anọ na atọ, otu nari na iri asa na asaa.

N'afọ 2015 Lamido na ụmụ ya ndị nwoke abụọ ka ejidere na mkpọrọ nkenke oge ma nwaa ha maka ebubo ịhazi nkwekọrịta site n'ụlọ ọrụ ndị ha na-achịkwa. Lamido tara ndị iro ya ụta. [28]

N’ọnwa Ọktọba afọ 2017, Lamido dere ndị otu ndọrọ ndọrọ ya na ndị isi otu ndọrọ ndọrọ ya bụ (PDP) kwupụta na ya nwere mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuli aka onyeisiala na-afọ 2019. [29] [30] [31] [32] N’ọnwa Febụwarị nke afọ 2018, Lamido kwuputara n’onwe ya ịzọ ọkwa n'iwepụta onye ga-azọ ọkwa onyeisiala nkePDP maka ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2019 na ọgbakọ ọ chịkọbara na obodo ya na Gọọmenti mpaghara Birni Kudu na Jigawa Steeti. Lamido na nnọkọ ahụ kwupụtara na ọ ga-abụ onyeisiala Naịjirịa na 2019 ruo n'isi ndị na-akwado ya. [33] N’ọnwa Juun afọ 2018, ndị nkwado Lamido haziri nnọkọ ikpe ekpere na Dutse maka ọganiihu nke mkpọsa onyeisiala ya mana ndị uwe ojii megidere ya n’ihi ihe nchekwa. Ụmụ akwụkwọ Jigawa Steeti ndi Lamido nyere agụmakwụkwọ efu mgbe ọ bụ gọvanọ na steeti ahụ haziri ekpere a. [34]

Lamido bụ otu n’ime mmadụ iri na abụọ na-azọ ọkwa onyeisiala PDP n'ọnwa Nọvemba afọ 2018. Ndị ọzọ zọrọ ọkwa a bụ onye bụ osote onye isi ala, Atiku Abubakar (Adamawa Steeti), Ibrahim Dankwabo (Yobe Steeti) otu mpaghara ugwu ọwụwa anyanwụ dịka Lamido. Nke a bụ nnukwu nsogbu dịrị Lamido n'ihi na a ga-ekewa ndị vootu si mpaghara ahụ n'etiti ndị pụtara na mpaghara a. N’iru ntuli aka nke onye otu ahụ, Atiku Abubakar gwara Lamido ka ọ pụọ n’ọsọ ahụ ma kwado ya mana Lamido jụrụ na ya bụ okenye Atiku. [35] [36] Ndị ọzọ bụ Bukola Saraki, Aminu Tambuwal, Rabiu Kwankwaso, Jonah Jang, David Mark, Kabiru Turaki, Dati Baba-Ahmed, Attahiru Bafarawa na Ahmed Makarfi . [37] [38]

Na ntuli aka onye isi ala nke PDP mere n'ụbọchi isii n'ọnwa ọktoba afọ 2018, Lamido nwetara votu iri itoolu na isii bụrụ onye nke isii dị anya na-esote Atiku Abubakar onye nwetara otu puku, narị ise na iri atọ na abụọ wee merie nhoputa otu a. [39] [40] [41] [42]

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Aha ndi gọvanọ steeti Jigawa

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. How EFCC arrested Lamido, 2 sons (en-US). Vanguard News (2015-07-08). Retrieved on 2020-04-01.
  2. Court grants bail to Lamido, sons (en-US). TheCable (2015-07-14). Retrieved on 2020-04-01.
  3. EFCC re-arraigns Sule Lamido, sons over alleged N1.35bn fraud (en). News Express Nigeria Website. Retrieved on 2020-04-01.
  4. Corruption: The Story Of Fathers, Sons On Trial. Sahara Reporters (2017-02-26). Retrieved on 2020-04-01.
  5. EFCC re-arraigns Sule Lamido, sons over alleged N1.35bn fraud - Premium Times Nigeria (en-GB) (2018-10-24). Retrieved on 2020-04-01.
  6. 6.0 6.1 6.2 Those who could be vice president. Next. Retrieved on 2010-04-21.
  7. Bolaji Abdullahi and Kola Ologbodiyan (2001-03-11). How Far Can the Progressives Go?. ThisDay. Archived from the original on 2004-12-10. Retrieved on 2010-04-21.
  8. PDP's Men of Power. ThisDay (2001-11-10). Archived from the original on 2005-12-02. Retrieved on 2010-04-21.
  9. Obasanjo Is On His Way Out. ThisDay (2002-09-08). Archived from the original on 2005-04-21. Retrieved on 2010-04-21.
  10. Chuks Okocha, Tokunbo Adedoja and Agaju Madugba (2003-12-08). PDP Crisis: Rimi, Lamido Trade Words. ThisDay. Archived from the original on 2005-11-22. Retrieved on 2010-04-21.
  11. Yakubu Musa (10.06.2005). Lamido to Rimi: You're a Contradiction of Your Past. ThisDay. Archived from the original on 2007-06-21. Retrieved on 2010-04-21.
  12. Taiwo Olawale (2007-12-24). Rimi’s a Factor in Nigerian Politics - Lamido. ThisDay. Archived from the original on 2007-06-21. Retrieved on 2010-04-21.
  13. Adagbo Onoja (2001-02-04). G-77: Nigeria's Graceful Exit. ThisDay. Archived from the original on 2004-12-10. Retrieved on 2010-04-21.
  14. Andrew Ahiante (2001-09-19). Britain Concerned over Plight of Africa -Lamido. ThisDay. Archived from the original on 2005-09-08. Retrieved on 2010-04-21.
  15. Hundreds of Trafficked Nigerians Die, Trying to Cross African Deserts, Mediterranean. People's Daily (September 21, 2001). Retrieved on 2010-04-21.
  16. Kayode Komolafe (2001-11-17). Lamido Calls for Global Action Against Corruption. ThisDay. Archived from the original on 2005-09-11. Retrieved on 2010-04-20.
  17. Bola A. Akinterinwa (2003-02-03). Legislative Misdirection in Foreign Policy. ThisDay. Archived from the original on 2004-12-27. Retrieved on 2010-04-21.
  18. Eddy Odivwri (2003-05-10). How the Polls Were Rigged. ThisDay. Archived from the original on 2005-01-12. Retrieved on 2010-04-21.
  19. PDP Drops Buhari, Zubairu, Lamido, Others. ThisDay (12.08.2006). Retrieved on 2010-04-21.
  20. Funso Muraina (08.03.2007). Turaki Accuses Lamido of Frustrating Bail Bid. ThisDay. Retrieved on 2010-04-21.
  21. Chuks Okocha (2007-06-23). Lamido: Banks Assist Govs to Loot Treasuries. ThisDay. Archived from the original on 2007-06-21. Retrieved on 2010-04-21.
  22. Taiwo Olawale (08.07.2007). Jigawa to Rescue Education with N2bn. ThisDay. Archived from the original on 2007-06-21. Retrieved on 2010-04-21.
  23. NUT endorses Gov Lamido ahead of 2011 election. Newsday Weekly (5 May 2008). Archived from the original on 2011-07-19. Retrieved on 2010-04-21.
  24. ISMAILA MUHAMMAD (15 March 2010). Lamido’s housing revolution in Jigawa state. Daily Triumph. Archived from the original on 2016-03-03. Retrieved on 2010-04-21.
  25. Taiwo Olawale (2009-09-30). Jigawa Woos Investors with Land, Facilities. ThisDay. Retrieved on 2010-04-21.
  26. Jigawa’s Heart for the Beggars. ThisDay (12.06.2009). Retrieved on 2010-04-21.
  27. Iyobosa Uwugiaren (2 December 2009). Obasanjo Positions Lamido for Vice President. Leadership. Retrieved on 2010-04-21.
  28. My prison experience, Sule Lamido, August 2015, VanguardNGR, Retrieved 10 February 2016
  29. 2019: Sule Lamido declares for presidency under PDP » Top News » Tribune Online (en-GB). Tribune Online (2017-10-23). Retrieved on 2020-04-01.
  30. Iroanusi (2017-10-23). 2019: Sule Lamido writes PDP, declares intention to run for president - Premium Times Nigeria (en-GB). Retrieved on 2020-04-01.
  31. 2019: I want to run for presidency, Sule Lamido writes PDP (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2020-04-01.
  32. Breaking: Sule Lamido declares interest in 2019 presidential race + Letter of intent.
  33. I shall be elected Nigerian President in 2019 - Sule Lamido - Premium Times Nigeria (en-GB) (2018-02-19). Retrieved on 2020-04-01.
  34. Police foil prayer rally for Sule Lamido's presidential ambition (en-GB) (2018-06-21). Retrieved on 2020-04-01.
  35. 2019: I am Atiku's senior, I won't step down for him - Lamido (en-GB) (2018-09-11). Retrieved on 2020-04-01.
  36. Abubakar (2018-09-11). 2019: Ex-VP Atiku Abubakar, Sule Lamido bicker over PDP ticket (en-US). TODAY. Retrieved on 2020-04-01.
  37. How they stand: The 12 aspirants vying for PDP’s presidential ticket (en-US). TheCable (2018-10-05). Retrieved on 2020-04-01.
  38. Lawal (2018-09-05). Atiku, Kwankwaso and 11 other PDP 'heavyweights' set to slug it out with Buhari (en). Legit.ng - Nigeria news.. Retrieved on 2020-04-01.
  39. Atiku emerges PDP presidential candidate (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2020-04-01.
  40. Atiku emerges PDP’s Presidential candidate – Agents (en-US). Vanguard News (2018-10-07). Retrieved on 2020-04-01.
  41. Galaxy Television | Atiku emerges PDP presidential candidate (en). Galaxy Television. Retrieved on 2020-04-01.
  42. Atiku Emerges PDP Presidential Candidate. Channels Television. Retrieved on 2020-04-01.