Nneka (singer)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nneka
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịJémanị, Naijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoNneka Egbuna Dezie
Aha ọmụmụNneka Egbuna Dezie
Aha enyereNneka Dezie
aha ezinụlọ yaEgbuna Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Disemba 1980 Dezie
Ebe ọmụmụWarri Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaGerman, pidgin Naịjirịa, Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Ọrụ ọ na-arụodee egwu, onye na-abụ abụ Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2003 Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ngwa egwuJita, Piano, ịgba, vocal Dezie
Ọrụ ama amaConcrete Jungle, Soul Is Heavy, My Fairy Tales Dezie
ụdịsoul music, rhythm and blues, ragga, pop music Dezie
akara ndekọSony Music, Epic Records, Decon Dezie
webụsaịtịhttp://www.nnekaworld.com Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Nneka Egbuna (a mụrụ n’abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Disemba na afọ 1980 [1] ) bụ onye Naijiria na-agụ egwú, na-ede abụ ma bụkwara onye na-eme ihe nkiri. Ọ na-abụ abụ na bekee, Igbo na Nigerian Pidgin nke bụ ngwakọta asụsụ Naijiria dị iche iche na bekee.

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

2Amụrụ Nneka Egbuna ma zụlite ya na Warri, na Delta State, Nigeria. [2] Nne ya bụ onye Germany ebe nna ya bụkwa onye Nigeria. [3] Na afọ 1999, ọ kwagara na obodo Hamburg, Germany ka ọ mụọ Anthropology na mahadum ebe ahụ. [1] Ọmalitere ịme egwuregwu n'ọgba egwu nke okpuru ala iji nweta ego iji kwụọ ụgwọ ụlọ akwụkwọ nzere ya. [4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

2003–2007: Ọrụ mmalite na egwu Victim of Truth[dezie | dezie ebe o si]

Nneka nwetara nlebara anya ọha na mbụ n'afọ 2004 ka ọ na-arụ ọrụ mmeghe maka onye na eti egwu akpọrọ Sean Paul[1] na Hamburg Stadtpark, nke a nyere ya otuto dị ukwuu, ma mee ka o kwupụta ebumnobi ya idekọ nchịkọta egwu mbụ ya. Mgbe o wepụtachara ọba egwu mbụ ya, The Uncomfortable Truth, ọ mere njem mbụ ya dị ka onye na-egwu n'ọnwa Eprel n'afọ 2005, ma mee ihe ngosi na obodo Germany, Austria na Switzerland.

N'afọ 2005, e wepụtara nchịkọta egwu mbụ nke Nneka, Victim of Truth, n'ofe Europe, Nigeria na Japan. N'ịchọta egwu nke a nwetara nlebanya dị egwu sitere na mgbasa ozi akwụkwọ akụkọ nke Sunday Times na obodo UK nke mechara kwupụta na Victim of Truth "abụ nke afọ a nke ịleghaara ya anya bụ mpụ".[5] N'agbanyeghị otuto zuru ụwa ọnụ, ndekọ ahụ abanyeghị na chaatị egwu. Ka o sina dị, Nneka mere njem nlegharị anya nke gara nke ọma, ya na onye otu ya bụ Patrice Bart-Williams. N'oge njem ya, ọ bụrụ abụ ya na Chiemsee Reggae Summer, Haarlem (Bevrijdingsfestival), The Hague (Park Pop) na Saint-Brieuc (Art Rock Festival), na ebe ndị a na-akwanyere ùgwù, dị ka La Maroquinerie na New Morning na Paris, Tivoli na Utrecht, Paradiso na Amsterdam, na Cargo na ULU na London. Ọ kwadokwara ndị nka dịka Femi Kuti, Bilal, Seeed, na Gnarls Barkley.

Nneka

N'afọ 2006, Nneka rụkwara ọrụ na netwọk telivishọn nke ndị German akpọrọ WDR, ebe ọ bụrụ otu egwu ya aha ya bụ "Gypsy", ebe otu egwu gbara usoro ịgba egwu emere maka maka egwu Nneka ahụ. Ndị otu Schlauberger kwadoro otu egwu.

2008- 2011: Egwu No Longer at Ease na Concrete Jungle[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Febụwarị n'afọ 2008, ọ wepụtara nchịkọta egwu nke abụọ ya, No Longer at Ease.[1] Ewepụtara aha nchịkọta egwu ahụ site na akwụkwọ akụkọ nke nwere otu aha ahụ nke Chinua Achebe dere nke na-egosipụta ọdịnaya egwu nke ndekọ ahụ. Ọtụtụ n'ime egwu na-ekwu maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-ekwu maka ọnọdụ ọjọọ nke Niger Delta na nrụrụ aka dị n’ala nna Nneka. No Longer at Ease na-ejikọta akụkọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke onwe " ngwakọta egwu nke mkpụrụ obi, nke pụtara n'ụdị dị iche iche gụnyere hip-hop na reggae". Isi otu egwu sitere na ndekọ ahụ, "Heartbeat", ghọrọ abụ mbụ nke Nneka batara na egwu iri ise kacha elu na obodo Germany.[6] N'ọnwa Septemba afọ 2009, egwu ahụ banyere na UK Singles Chart ọ we di n'ebe ahụ na ọnu-ọgugu iri-na-abua[7] Emegharịrị egwu "Heartbeat" ọtụtụ oge, ọkachasị site na aka Chase & Status, Rita Ora tinye kwara egwu ahụ na nchịkọta egwu nke ya nke a na-ewu ewu nke ukwuu akpọrọ "R.I.P.".

N'ọnwa ndị sochirinụ, Nneka gara njem n'ime France, Italy na Portugal, ebe ọ kwadokwara Lenny Kravitz mgbe ọmere njem na obodo France n'ọnwa Eprel n'afọ 2009.

A họpụtara Nneka n'ụdị atọ maka Channel O Music Video Awards nke afọ 2009[8] and won an award for Best African Act at the 2009 MOBO Awards.

Na ebe njedebe nke afọ 2009, a họpụtara ya dị ka otu n'etiti ndị iri ise na-apụta apụta, ndị na-emepụta ihe site n'aka ndị akwụkwọ akụkọ Beyond Race. Nke a mere ka a kpọtụrụ ya aha n'akwụkwọ akụkọ nke ahụ nke ọnụọgụgụ iri na otu (ya na Bodega Girls na J. Cole na mkpuchi akwụkwọ akụkọ ahụ), yana ajụjụ na azịza pụrụiche maka saịtị akwụkwọ akụkọ.[9]

N'ọnwa Nọvemba n'afọ 2009, Nneka malitere njem egwu mbụ ya na mba United States, ebe ọ mere ihe ngosi na New York City, Vienna (Washington DC), Boston, Philadelphia, Los Angeles, na San Francisco. Ọzọkwa, ọ bụ onye ọbịa pụrụ iche na The Roots. Nke ahụ bụ mmemme maka ndị egwu. Egwu izizi ya na mba US, Concrete Jungle, ka ewepụtara n'ụbọchị nke abụọ nke ọnwa Febrụwarị n'afọ 2010. E nyere egwu ahụ onye nke iri ise na asaa n'mkpokọta ọnụọgụ egwu nke Top R&B/Hip-Hop albums, na onye nke iri na asatọ n'mkpokọta ọnụọgụ egwu nke Heatseekers Albums, ebe ọ nọrọ izu ise n'ọnọdụ ahụ.

Ejikwa egwu ya nke ọkpọrọ "Kangpe" mee egwu ndabere na ihe egwuregwu vidiyo EA Sports, FIFA 10 .

N'ọnwa Jenụarị nke afọ 2010, Nneka pụtara na mmeme Late Show ya na David Letterman na obodo New York tupu ya aga njem US, na n'ime ọnwa Juun na-eso ya, o jiri egwu egwu ya, "Africans" nwe mmerina ngalaba reggae nke Museke Online Africa Music Award 2010. [10]

Nneka so Nas na Damian Marley gagharịa maka ọba egwu ha akpọrọ Distant relatives. Nas na Nneka gwakọtara egwu ya nke nwere nnukwu ọkwa akpọrọ, "Heartbeat". Ewepụtara ya site na iTunes na ụbọchị ise nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2010. [11]

O sonyere na ihe mmeme Lilith Fair Concert nke afọ 2010, ebe ndị egwu ndị ọzọ dị ka Tegan na Sara, Sarah McLachlan, Kelly Clarkson, Jill Scott, Erykah Badu, Corinne Bailey Rae, Mary J. Blige, Rihanna tiri egwu. N'oge njem ya na US maka egwu Concrete Jungle, ọ rụkwara ọrụ na Washington, Raleigh na Charlotte na oge ahụ.

Nneka dere egwu maka asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2010 na South Africa nke akpọrọ "Viva Africa"; egwu a bụ nkwanye ugwu maka mgbe egwuregwu Iko Mbaụwa biara na ala Africa.

N'afọ 2010, Nneka nwetara ihe nrite maka onye omenkà, onye egwu kacha mma na Naijiria na Nigerian Entertainment Awards, nke emere na obodo New York. [12] Kemgbe ahụ ọ nwetago nturu ugo NEA maka onye omenkà mba ụwa kacha mma ọtụtụ oge.

Nneka sonyere na ihe nkiri ejije, <i id="mwkg">Relentless</i> na Nigeria nke Andy Amadi Okoroafor mebere ma duzie ya. Ihe nkiri a gosikwara Gideon Okeke, Halle Mordu, Jimmy Jean-Louis na Tope Oshin Ogun. Relentless pụtara na ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2010 na BFI London Film Festival . [13]

N'afọ 2011, Nneka soro Ziggy Marley bụọ abụ akpọrọ "Express Yourself", nke emepụtara maka ihe nkiri Beat the World .

2012- ruo ugbu a: Soul is Heavy na My Fairy Tales[dezie | dezie ebe o si]

Na ọnwa Maachị n'afọ 2012, ọ pụtara na BET 106 na Park Music Matters. Na ihe nkiri ahụ ọ bụrụ abụ ya na otu onye egwu oge ochie nke Naijiria bụ Clef nite na Black Thought bụ onye rapper maka otu egwu hip hop a ma ama The Roots . Ọ pụtara kwara na MTV Iggy, ebe ọ bụrụ abụ ya na Clef nite onye nke kpọrọ ya ụbọ akwara.

Nneka dekọrọ ọba egwu ya nke akpọrọ Soul Is Heavy in Nigeria. Ewepụtara ya na ọnwa March n'afọ 2012. Ndekọ egwu ahụ ghọrọ ihe ama ama na France, Austria, Germany, Switzerland, wee nọrọ na ọnụọgụgụ iri atọ na asatọ na ihe ngụkọ na nke UK R&amp;B . Otu egwu kacha aga nke ọma na ndekọ egwu ahụ bụ "Shining Star", nke nọrọ na ọnụọgụgụ iri itoolu na asaa na UK Singles Chart. Nke ahụ bụkwa abụ ya nke abụọ na nke ikpeazụ nwetara ịnọ n'ọnọdụ ahụ. Ihe ndekọ ahụ nwetara nzaghachi dị oke egwu, ma nweta akara nke iri asaa na Metacritic . [14]

N'afọ 2012, Nneka na ndị na eme akpụkpọ ụkwụ na uwe ndị America akpọrọ Reebok nwere njikọ aka. [15] Na ọnwa Mee n'afọ 2013, ọ pụtara na ihe nkiri arụsị ụgha site na aka Tricky .

Ụdị egwu[dezie | dezie ebe o si]

N'agbanyeghị na Nneka na-abụ abụ karịa ka ọ na-abụ egwu rap, ọ na-akpọ hip hop dị ka mgbọrọgwụ egwu ya nke bụkwa isi ihe mkpali kachasị mkpa, ebe ọ na-ehota ndị egwu dịka Fela Kuti na Bob Marley nakwa ndị rap nke oge a Mos Def, Talib Kweli, na Lauryn Hill dịka ndị bụ isi mkpali na ihe banyere iti egwu. [16]

Egwu ya na-egosipụta ọtụtụ akụkọ ihe mere eme ya na ndụ ya na Nigeria yana oge ọ nọrọ na Western Europe. Egwu ya na ekwu okwu gbasara ikekete ego, ịda ogbenye na agha ma na-ejikarị ozi nke Akwụkwọ Nsọ na ntụnyere aka. Ụfọdụ ndị na-akọwa egwu ya ma na-atụnyere ya Erykah Badu, Neneh Cherry, [17] na Floetry . [18]

Nkwado[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2012, Nneka kwadoro Rope Foundation, n'akụkụ Ahmed "Genda" Nyei. [19] Rope Foundation na-eje ozi dị ka ikpo okwu maka ndị na-eto eto na ndị inyom na-egosipụta onwe ha site na nkà, [4] ha na arụ ọrụ ebere ma na-elekwasịkwa anya n'ịrụ ọrụ ebe ụmụ nwanyị ndị nke a na-emetọ mmekọahụ na WAGA (War Affected Girls & Adults) Foundation, nke dị na mpaghara Bo Town nke mba Sierra Leone . Nneka kọwara Rope Foundation dịka ndị na-arụ ọrụ "iji nye ohere maka inyere ndị mmadụ aka ikwupụta obi ha na okwu gbasara ọha mmadụ". [4]

Nneka na-ejekwa ozi dịka onye nnọchi anya Arts for the African Women Development Fund [AWDF] na mba Ghana. [20] Ọ na-arụ ọrụ nke ukwuu na ọrụ ebere na nka na Sierra Leone .

Egwu ya[dezie | dezie ebe o si]

Ndekọ egwu[dezie | dezie ebe o si]

  • 2005: Victim of Truth
  • 2008: No longer at Ease [21] - Germany #31, France #34, Switzerland #42, Austria #49
  • 2010: Concrete Jungle
  • 2012: Soul is Heavy [22] - France #38, Switzerland #30, Austria #46
  • 2015: My Fairy Tales
  • 2022: Love Supreme

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

  • 2009: To and Fro (3-CD igbe)
  • 2009: The Madness (Onye-Ala) [23] (with J.Period )

EPs[dezie | dezie ebe o si]

  • 2005: The Uncomfortable Truth
  • 2010: Heartbeat EP (na-egosi Nas )
  • 2022: About Guilt

Egwu ndị nọrọ onwe ha[dezie | dezie ebe o si]

  • 2005: "The Uncomfortable Truth"
  • 2006: "Beautiful"
  • 2006: "God of Mercy"
  • 2007: "Africans"
  • 2008: " Heartbeat " [24] - #9 Portugal, #20 UK, #34 Austria, #49 Germany
  • 2008: "Walking"
  • 2009: "Kangpe"
  • 2012: "Shining Star"
  • 2012: "Soul is Heavy"
  • 2012: "My Home"
  • 2013: "Shining" [25] - #7 South Africa
  • 2021: "Love Supreme"
  • 2021: "Tea?"
  • 2021: “Yahweh”
  • 2021: "This Life"
  • 2021: "With You"
  • 2021: "Maya"

Egwu[dezie | dezie ebe o si]

  • 2011: "Beat the World"

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • Lake of Fire (2004)
  • Offside(2005)
  • Relentless(2010)
  • Drexciya (2012)
  • Fifty (2015)

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Welle (www.dw.com). Artists After the Escape: How Nneka Egbuna found a home in music | DW | 18.12.2017 (en-GB). DW.COM. Retrieved on 2021-02-05.
  2. Live Sessions. Live Sessions. Retrieved on 2021-02-05.
  3. Live Sessions. Live Sessions. Retrieved on 2021-02-05.
  4. 4.0 4.1 4.2 The Official Nneka Site. www.nnekaworld.com. Retrieved on 2021-02-05.
  5. Edwards. "Nneka: Victim of Truth", The Times. Retrieved on 2021-02-05. (in en)
  6. AllMusic | Record Reviews, Streaming Songs, Genres & Bands (en-us). AllMusic. Retrieved on 2019-01-10.
  7. UK Singles & Albums Official Charts Company - Nneka - Heartbeat. Official Charts Company (17 October 2009). Retrieved on 27 October 2010.
  8. M-NET - Channel O. Beta.mnet.co.za (1 April 2007). Archived from the original on 10 October 2008. Retrieved on 27 October 2010.
  9. Nneka. Beyondrace.com. Archived from the original on 25 January 2010. Retrieved on 27 October 2010.
  10. 2010 Museke Online Africa Music Awards winners here (en). www.bizcommunity.africa. Retrieved on 2021-02-05.
  11. Heartbeat EP. itunes.apple.com (5 October 2010). Retrieved on 24 November 2012.
  12. Video: 5th Annual Nigeria Entertainment Awards (NEA) 2010 Recap (en). OkayAfrica (2010-09-27). Retrieved on 2021-02-05.
  13. Akideinde, Oye (6 October 2010). 360Trailers: "Relentless" starring Jimmy Jean-Louis, Gideon Okeke, Halle Mordu & Nneka Egbuna. 360Nobs.com. Retrieved on 4 October 2014.
  14. Nneka (en). Metacritic. Retrieved on 2021-02-06.
  15. StackPath. www.kicksonfire.com. Retrieved on 2021-02-06.
  16. Nneka - Listen for free on Deezer. Deezer.com. Archived from the original on 2 July 2009. Retrieved on 27 October 2010.
  17. Tom Horan (28 October 2006). Nigerian soul with a European groove. Daily Telegraph. Retrieved on 27 October 2010.
  18. .http://www.lunch.com/data/Nneka_No_Longer_at_Ease-1380813.html
  19. ROPE Online. Archived from the original on 2019-01-10. Retrieved on 2019-01-10.
  20. Introducing Nneka, Internationally Acclaimed Musician and Activist as AWDF's Ambassador for the Arts (en). The African Women's Development Fund (AWDF) (2012-02-21). Retrieved on 2021-02-06.
  21. No Longer At Ease by Nneka - Music Charts. acharts.co. Retrieved on 2019-01-10.
  22. Soul Is Heavy by Nneka - Music Charts. acharts.co. Retrieved on 2019-01-10.
  23. Free Download. Archived from the original on 2013-05-10. Retrieved on 2022-02-24.
  24. Heartbeat by Nneka - Music Charts. acharts.co. Retrieved on 2019-01-10.
  25. Archived copy. Archived from the original on 12 October 2013. Retrieved on 16 April 2013.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]