Aisha Buhari

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Aisha Buhari
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoAisha Buhari Dezie
Aha enyereAisha Dezie
aha ezinụlọ yaBuhari Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya17 Febụwarị 1971 Dezie
Ebe ọmụmụAdamawa Steeti Dezie
Dị/nwunyeMuhammadu Buhari Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụactivist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, beauty therapist Dezie
Ọkwá o jiFirst Lady of Nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello, Ụlọ Akwụkwọ Nchebe Naijiria Dezie
Ebe ọrụAbuja, Kaduna Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Congress Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie

Aisha Halilu Buhari (amụrụ 17 Febụwarị 1971) [1] bụ nwanyi mbụ nke Naijiria na nwunye onye isi ọchịchị Muhammadu Buhari ugbu a, onye weghaara ọkwa na 29 Mee 2015 ka o meriri onye isi ọchịchị na-achị mgbe ahụ Goodluck Jonathan . Aisha Buhari bụ onye na-ahụ maka ịchọ mma. [2] [3] [4]

Ndụ mmalite na ezinụlọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Aisha Buhari na 17 February 1971, [5] [6] [7] na Adamawa State, n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Nigeria . [8] Nna nna ya bụ Alhaji Muhammadu Ribadu bụ minista nchekwa nchekwa mbụ nke Naijiria. [9] Nna Aisha bụ sịvịl injinia, nne ya bụ ụmụ ndị ezinụlọ Ankali, ndị ọrụ ugbo a ma ama. Aisha Buhari gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na sekọndịrị na Adamawa State . [10] Na 2 Disemba 1989, Aisha lụrụ Muhammadu Buhari, [11] [12] onye dị mbụ nwee ụmụ ise na alụmdi na nwunye mbụ ya na Safinatu Yusuf . Aisha na Muhammadu Buhari nwere ụmụ is na nchịkọta ọnụ na otu nwa nwa. [13]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Aisha Buhari ji ogo na bachelọ nke nka na ọchịchị ọha sitere na Mahadum Ambrose Alli (AAU), [8] na ogo masta na ihe gbasara mba ụwa na ọmụmụ atụmatụ sitere na Ụlọ Akwụkwọ Mgbachite Naijiria, Kaduna. [10] Aisha Buhari nwetara diplọma na ịchọ mma site na Ụlọ Akwụkwọ Carlton Ịchọ Mma dị na Windsor, United Kingdom. Aisha Buhari ji diplọma ndị gụsịrị akwụkwọ na ụzọ esi achọ mma na ịchọ mma sitere na Ụlọlọ Akwụkwọ Ịchọ Mma nke Esthetique dị na France. [14] Aisha Buhari bụ onye otu ọzụzụ aka ọrụ na ndi óbị ebere nke United Kingdom na Kansul Ahụike na Ịchọ Mma nke Mba Ụwa. [15]

Ọrụ azụmahịa[dezie | dezie ebe o si]

Ruo ọtụtụ afọ, Oriakụ Aisha Buhari azụọla azụmaahịa na-aga nke ọma dị ka onye nchoputa / onye nduzi na onye isi Ụlọ Akwụkwọ Ịchọ Mma Hanzy Spa, ụlọ mma di na Kaduna na Abuja . [16] Aisha Buhari bụ onye enyemaka na Agụmakwụkwọ Ọrụ Isi mbụ nke Mba(NBTE), [17] na ịchọ mma na ụzọ ịchọ mma ma soro na mmepe usoro ọmụmụ nke obere ụlọ ọrụ maka NBTE. Aisha Buhari mechiri ụlọ ịchọ mma ya ka di ya ghọrọ onye ịsị ọchịchị Naịjirịa. [10] [18]

Aisha bipụtara akwụkwọ akpọrọ Ihe Ndị Kachasị Mkpà na Ịchọ Mma: Ntuziaka zuru oke maka ndị ọkachamara maka ịchọ mma, [19] nke akwadoro ka ọ bụrụ ederede maka usoro ọmụmụ NBTE.

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nkwado[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Julaị n'afọ 2014, Aisha dụrụ Goodluck Ebele Jonathan ọdụ ka ọ gbaa arụkwaghịm n'ọrụ dịka onye ịsị ọchịchị ala Naịjirịa, n'ihi ogbunigwe ogbugbu ma bo ya ebubo na ọ igbu di ya. [11]

Aisha Buhari bụ onye na-akwado oke ruuru ụmụ nwanyị na ụmụaka, nke a bụkwa isi okwu n'oge ọ na-agba mbọ ịzọrọ di ya ọkwa n'afọ 2015. Ọtụtụ oge, Aisha kwusiri ike na ọ dị mkpa ka ụmụ agbọghọ na-agụ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị tupu ha alụọ di, na-ekwu na ya kwenyere na ọ dịghị nwa agbọghọ kwesịrị ịlụ di tupu ya agba afọ 17. [20] Ọ katọrọ alụmdi na nwunye ụmụaka na nwoke idina nwoke. [21]

Na Mee 2015, n'akụkụ nke Ọgbakọ Ụmụnwanyị Ndị Zuru Ụwa nke e mere na Buenos Aires, Argentina, o kwusiri ike na ọ dị mkpa ka iwu Naijiria na egbochi alumdi nwunye ụmụaka mmanye, ịzụ ahịa mmekọahụ na ihe ndị ọzọ ụmụ agbọghọ na ụmụ nwanyị Naijiria na-alụ. Aisha welitere nchegbu banyere mmetọ ụmụaka na Naijiria, ịzụ ahịa mmekọahụ na oke mkpa iwu na adachi ịlụ nwunye ụmụaka di. [22]

Na 12 Goon 2015, Aisha Buhari zutere ụfọdụ ndị nne ụmụ agbọghọ Chibok [23] a tọọrọ na 14 Eprel 2016, ma nye nne na nna ụmụ agbọghọ Chibok onyinye sitere n'akwụkwọ, ụmụ nwoke Buni Yadi e gburu na 2014, na ụmụaka na-ata ahụhụ site na erighị ihe na-edozi ahụ. .

N'Ọktoba 2016, Aisha Buhari kwuru na ya agaghị akwado di ya na ntuli aka na-abịa ma ọ kpakọghi ọchịchị ya ọnụ. Ọ zara na ebe ya bu na kichin ya, na-asị "Amaghị m otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwunye m nọ, ma ebe ya bu na kichin m na ọnụ ụlọ m na ime ụlọ m." [24]

N'Eprel 2021, ọ gara akwụkwọ "Aisha Buhari - Ịdị Iche", nke Hajo Sani dere, Onye Ọkwa Kachasị elu Ndụmọdụ Pụrụ Iche nke Onye isi ọchịchị na ihe gbasara ụmụ nwanyị na nchịkwa. Akwụkwọ ahụ nwere ncheta nke nwanyị mbụ site mgbe ọ bụ nwata gaa n'ihu. [25] [26]Osote onye ịsị ọchịchị Yemi Osinbajo na ndị ọkaibe ndị ọzọ bịara na mmemme mmalite ya. [27]

Ọdịnihu Kwenyesịrị Ike[dezie | dezie ebe o si]

Ọdịnihu Kwenyesiri Ike bụ uzo nke Aisha Buhari tọrọ ntọala iji gaa n'ihu n'ọrụ nkwado ya maka ahụike na ọdịmma ụmụ nwanyị na ụmụaka site na nchịkọta obodo na nkwalite ahụike..Ihe kpaliri Aisha bu oke mkpa ọ dị imezi ọnọdụ ahụike ụmụ nwanyị, ụmụaka na ndị ọzọ na-adịghị ike ma biri na Naijiria ugbu a. O kwuputara nkwa ya n'ọrụ a na nzụkọ ndị ji obodo mere na ụlọ onye isi ọchịchị na mmemme mmalite ọha [28] nke Otu Ọdịnihu Kwenyesiri Ike n'akụkụ United Nations Ọgbakọ Izugbe na New York na 29 Septemba 2015.

Aisha Buhari na ndị na enweghị ebe n'ime obodo n'ihi ọgbaghara Boko Haram na arụkọ ọrụ. O hibere kọmitii maka ikesa ihe enyemaka mgbe ọ garachara nleta n'ogige IDP dị na Borno State . [29] [30]

Iko Aisha Buhari[dezie | dezie ebe o si]

Iko Aisha Buhari bụ asọmpi ịkpọ òkù nke ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjiria haziri maka otu bọọlu ụmụnwaanyị mba a. [31]

Onyonyo ọha[dezie | dezie ebe o si]

Aisha Buhari tụrụ ndị Naijiria n'anya mgbe o mere ka a mara na ọrụ ya dị ka nwunye onye isi ọchịchị Naijiria ga-abụ naanị ihe ọ bụla iwu kwadoro, ma kwe nkwa na ya agaghị agafe ihe íwú kwadoro. [32] Na ngosi nkwanye ugwu e nyere ndị nwunye ndị gọvanọ, na Tọzdee, 13 Goon 2019, [33] Aishat Buhari nakweere aha nwanyị mbụ mgbe afọ ise gara mgbe onye ịsị ọchịchị Buhari kwuchara na ọ ga-ewepụ ụlọ ọrụ ahụ.

Aisha Buhari bụ nwunye onye ịsị ọchịchị Naijiria mbụ nọ na Twitter, na Instagram, na mgbasa ozi soshal midia ndị ọzọ, na-enye echiche ya na'ekpuchighi ihe ọbụla.[34]

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Ọktoba 2019, Fatima Daura, nwa nwanyi onye nchịkọta akụkọ akwụkwọ akụkọ bụ Mamman Daura, boro Aisha ebubo na ọ kparịrị ya ma mbuso agha n'ezinụlọ ya. Fatima dekọrọ vidiyo nke Aisha ka ọ na-aba mba n'ime ụlọ ọrụ onye ịsị ọchịchị dị n'Abuja ma nye ya ndị nta akụkọ. Fatima Daura kwuru na ya dekọrọ ihe onyonyo a n'ihi na ọ nweghị onye ga-ekwere ya ma ọ bụrụ na o kwuru ihe ndị ahụ n'enweghị ihe akaebe. [35] [36] [37] Aisha Buhari kwuputara na ọ bụ ya bụ onye n'ihe onyonyo a ma kwuo na Fatima Daura kwara ya emo mgbe ọ na-edekọ ya. Aisha mechara rịọ mgbaghara na nkwupụta sitere na ọnụ onye na-ekwuchitere ya. Ọ kọwara na iwe were ya n'ihi na Mamman Daura na ndị ezinaụlọ ya gọnarị ya ịbanye n'ime ebe ụfọdụ nke ụlọ ọrụ onye ịsị ọchịchị ka onye ịsị ọchịchị Buhari gwara Mamman Daura na ezinụlọ ya ka ha si n'ụlọ ya pụọ.[38] [39]

  1. Biography of Aisha Buhari; First Lady Of The Federal Republic Of Nigeria, Politician, Adamawa State Celebrity.. www.nigerianbiography.com. Retrieved on 20 December 2017.
  2. Aisha Buhari's Book presentation like no other. PunchNews.
  3. Aisha Buhari urges fair representation of women in appointments. Vanguard News.
  4. Aisha Buhari Meets With APC Women, Youths - Channels Television. Channels Television.
  5. Who is Aisha Buhari? | Buhari/Osinbajo Updates. buhariosinbajo.org. Archived from the original on 7 August 2017. Retrieved on 20 December 2017.
  6. Who Is Aisha Buhari ? | Biography/Profile/Curriculum Vitae Of MRS AISHA BUHARI – Daily Media Nigeria. dailymedia.com.ng. Archived from the original on 19 October 2017. Retrieved on 20 December 2017.
  7. "Aisha: Brain and beauty in the villa - Vanguard News", Vanguard News, 1 April 2015. Retrieved on 20 December 2017.
  8. 8.0 8.1 "Aisha Muhammadu Buhari Wife of the President of the Federal Republic of Nigeria", The Presidency. Retrieved on 23 November 2019.
  9. Clement Ejiofor. 5 Facts You Need to Know About Aisha Buhari. NEWS.NAIJ.COM - Nigerian & worldwide news..
  10. 10.0 10.1 10.2 Aisha Buhari: 10 Things to Know About Nigerian President-Elect Muhammadu Buhari's Wife. International Business Times. Retrieved on 13 June 2015.
  11. 11.0 11.1 Windsor. "Nigeria's New First Lady, Aisha Buhari: 8 Things To Know About The President-Elect's Wife", International Business Times, 22 April 2015. Retrieved on 20 December 2017.
  12. "Biography/Profile/Curriculum Vitae Of MRS AISHA BUHARI". Archived from the original on 31 May 2015. Retrieved on 14 June 2015.
  13. Patience Jonathan’s mistake, lesson for Aisha Buhari – Women. The Punch - Nigeria's Most Widely Read Newspaper. Archived from the original on 30 May 2015. Retrieved on 14 June 2015.
  14. "5 Facts You Need to Know About Aisha Buhari", The Punch. Retrieved on 13 June 2015.
  15. Sean. Biography/Profile/Curriculum Vitae Of MRS AISHA BUHARI. dailymedia.com.ng. Archived from the original on 2017-10-19. Retrieved on 2022-02-06.
  16. Isenho. "Aisha Buhari Closes Beauty Parlour in Kaduna", The Punch. Retrieved on 13 June 2015.
  17. "Nigerian Basic Technical Education", The Punch. Retrieved on 13 June 2015.
  18. Aisha Buhari Closes Beauty Parlour in Kaduna. The Punch. Archived from the original on 30 May 2015. Retrieved on 13 June 2015.
  19. "The Essentials of Beauty Therapy", Future Assured.
  20. Ugwuanyi. "Aisha Buhari says girls should attain 17 years before going into marriage", The Daily Post. Retrieved on 13 June 2015.
  21. Creating a Brighter Future for Children and Women The Aisha Buhari’s Future Assured Story A quiet but virtuoso Achievements – Pleasures Magazine (en-US). Retrieved on 2021-09-03.
  22. "Aisha Buhari Seeks Legislation Against Early Marriage=June 13, 2015", ChannelsTV.
  23. Adoyi. "Tears as Aisha Buhari, Mrs Osinbajo meet mothers of Chibok", Daily Post, 13 June 2015.
  24. Nigeria's President Buhari: My wife belongs in kitchen. BBC. Retrieved on 14 October 2016.
  25. Osinbajo extols Aisha Buhari’s virtues as book on First Lady is launched (8 April 2021). Retrieved on 17 April 2021.
  26. Book on First Lady, Aisha Buhari, for public presentation. The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (7 April 2021). Archived from the original on 17 April 2021. Retrieved on 17 April 2021.
  27. Deji. Aisha Buhari Assembles 12 Billionaires for Her Book Launch. thisdaylive.com. Retrieved on 3 April 2021.
  28. "Aisha Buhari hosts summit on maternal health others in New York", Leadership News, 29 September 2015. Retrieved on 4 May 2016.
  29. "First lady sets committee care for IDPS in Borno", Sahara Reporters, 23 December 2015.
  30. "Aisha Buhari distributes relief materials to Borno pregnant IDPs", Vanguard (Nigeria), 2 January 2016.
  31. "All you need know about Aisha Buhari Cup 2021", BBC News Pidgin. Retrieved on 2022-02-04.
  32. "How I will operate as Nigeria’s First Lady – Buhari’s Wife=June 13, 2015", Premium Times.
  33. "Aisha Buhari adopts title of First Lady, dumps ‘wife of the president’", Oak TV Newstrack, 14 June 2019. Retrieved on 14 June 2019.
  34. Aisha Buhari's views truthful but controversial – Osinbajo (en). Daily Trust. Retrieved on 2021-06-14.
  35. "Aisha Buhari attacked us inside Aso Rock, says Mamman Daura’s daughter", TheCable. Retrieved on 14 October 2019.
  36. "Aisha Buhari Almost Attacked Me, Mamman Daura's Daughter Àtụ:Sic", SaharaReporters.
  37. Adedokun. "Between Aisha Buhari and Fatima Daura", Punch. Retrieved on 17 October 2019.
  38. Egbas. "Aisha Buhari says she was the angry woman in that viral video", Pulse. Retrieved on 14 October 2019.
  39. Lere. "How Mamman Daura’s family blocked me from Aso Rock apartment — Aisha Buhari", Premium Times. Retrieved on 14 October 2019.