Chigozie Stephanie AlichiAudio(help·info) (a mụrụ n'ụbọchị nke 23 n'ọnwa Disemba nke afọ1993), onye amara aha ya bụ Chizzy Alichi, bụ onye na-eme ihe nkiri na Naịjirịa .
Chizzy Alichi sitere na Ezza Nkwubor Nike n'Enugu East, okpuru ọchịchị ime obodo nke Enugwu steeti, nke di na South East (Nigeria) . Ọ bụ nwa ikpeazụ nwere ụmụnne abụọ. O mere isi akụkọ mgbe o wuru ulo nne na nna ya n'afọ 2017. [1][2][3][4] O bi n'Asaba,na Delta . [5]
O sonyeere Nollywood n'afọ 2010 na mberede. O sonyeere ndị Actors Guild of Nigeria, tinye akwụkwọ maka i so n'ihe nkiri were nweta ohere nke mbụ dịka onye ome ihe nkiri na ihe nkiri a kpọrọ Magic Money nke gosipụtara Mercy Johnson na Bob-Manuel Udokwu . [6] Oge mgbanwe nke ọrụ ya bịara na ihe nkiri Akaraoku, nke pụtara " hot akara", n'afọ 2016, nke Yul Edochie duziri.Ihe nkiri vidio ahụ malitere ị ba ụba na soshal midia mgbe ndị mmadụ chere na onye omeejije ahụ bụ onye na-ere akara. O gosiputara na ihe nkiri ndi ozo n'afọ 2017 maka nkea.