Andy Chukwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ


Andy Chukwu

Andy Chukwu (amụrụ ya na ubosi nke iri na ano nke onwa mee na afo 1957) ọ bụ onye nduzi ihe nkiri Naijiria. Ọ malitere ọrụ ya dị ka onye na-eme ihe nkiri.[1] Ihe nkiri ndị o mere gụnyere Karishika (1996), Witches (1998) na Issakaba (2000). Ihe nkiri ndị ọ duziri gụnyere Maazị Ibu na 2 òké. Chukwu duziri ihe nkiri ndị na-eme ihe nkiri / ndị na-ese ihe nkiri Nollywood dị ka Osita Iheme, Chinedu Ikedieze, Dakore Egbuson, Patience Ozokwor, Amaechi Muonagor, Julius Agwu, Pete Edochie, Ali Nuhu, Emeka Ike, Gentle Jack, Ronke Ojo, Sandra Achums, na ndị ọzọ.

Ọ bụ otu n'ime ndị isi na-ahụ maka ụlọ ọrụ ihe nkiri nke onye isi ala Naịjirịa Goodluck Jonathan kpọrọ na afo 2013 iji mee emume ncheta afọ iri abuo kemgbe a tọhapụrụ ihe nkiri Naịjiria mbụ na vidiyo ụlọ.[2]

Ihe ndị mere n'oge gara aga[dezie | dezie ebe o si]

Chukwu bu onye Obinagu na obodo Ishiagu nke mpaghara Gọọmentị Obodo Ivo nke Ebonyi Steeti.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ ime ihe nkiri Chukwu malitere mgbe ọ na-egosi ihe inkiri na-atu egwu ndi Nollywood bụ Karishika na afo 1996. Mgbe ọ pụtasiri na ihe nkiri ole na ole dị ka onye na-eme ihe nkiri dịka Issakaba na Witches. Ọ si ime ihe nkiri na ngwụcha afọ iri itolu gàwa, gafare gaa na iduzi ihe nkiri na afọ puku abuo gàwa. O nwere ihe karịrị ihe nkiri iri na abụọ n'okpuru eriri ya ma na ime ihe nkiri ma ikike iduzi. Mgbe ụfọdụ ọ na esonye na-eme ihe nkiri na nke ọ na-eduzi, na-arụ obere ọrụ nkwado. Ọ bụ onye nduzi nke ihe nkiri na-atọ ọchị nke Naijiria nke a na-enyocha nke ọma bụ Maazị Ibu nke John Okafor mere dị ka onye isi ihe ngosi. Taa, a maara John Okafor nke ọma site na aha ọzara na ihe nkiri ahu karịa aha gọọmentị ya n'ezie.[3]

Ọru ngo obodo[dezie | dezie ebe o si]

Chukwu sonyeere gọọmentị nke Ebonyi State na Lagos State maka mmemme nnweta nkà a na-akpọ Street to Skills. Ebumnuche ya bụ iji nyere ụmụaka na ndị ntorobịa aka ịkwụsị ịzụ ahịa n'okporo ámá, ma muta nkà ha nwere ike iji na-nweta ihe ha ga-eji di ndu.[4][5]

Chukwu kwuputara na ọ na-arụ ọrụ na ihe nkiri iji mee ka a mara oria akporo Vesicovaginal fistula (VVF) na nsogbu ndị na-arịa ya na-agabiga. O kwere nkwa ime ihe nkiri ahụ dị ka uzọ ọgesi tinye aka nke onyinye ya na ọrụ anụ ụlọ nke nwanyị mbụ nke Ebonyi State, Josephine Elechi.[6]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Afo Ihe nkiri Ihe ndetu Ndi so meputa ihe nkiri (ọru)
1996 Karishika omee ya na Becky Ngozi Okorie (Karishika)

Bob-Manuel Udokwu (onye ozuzu aturu Everest), Sandra Achums, Amaechi Muonagor

1998 Ndi amoosu Omee (Ọrụ di ka Dickson) ya na Liz Benson (Adaeze), Zack Orji (Desmond), Patrick Doyle (Onye azuzu aturu), Obot Etuk (Jagua), Bukky Ajayi (Nne Desmond), Larry Koldsweat (Babalawo), Tony "Otu izu" Muonagor (George)
2000 Issakaba omee ya na Zulu Adigwe, Chiwetalu Agu, Sam Dede, Amaechi Muonagor
2001 ìhè ubochi Omee Hanks Anuku, Enebeli Elebuwa, Gentle Jack, Bimbo Manuel
2002 Mkpu enyemaka Omee, onye nduzi Amaechi Muonagor, Ngozi Nwosu, Clem Ohameze, Nkiru Sylvanus
Nwa m nwanyi Omee ya na Chiege Alisigwe,

Pete Eneh, Clem Ohameze, Zack Orji, Bob-Manuel Udokwu

Ibe Akwa na iru-ugu Omee Sandra Achums, Chiwetalu Agu, Chiege Alisigwe, Pete Edochie, Emeka Ike, Ramsey Nouah
2003 òke abuo Omee, Onye nduzie ya na Osita Iheme (A-Boy), Chinedu Ikedieze (Bobo), Patience Ozokwor, Amaechi Muonagor
inwu nihi ihunanya Omee, Onye nduzi ya na Chiege Alisigwe, Bruno Iwuoha, Ramsey Nouah, Clem Ohameze
Ihunanya ji m onye nduzi Hanks Anuku, Osita Iheme, Chinedu Ikedieze, Camilla Mberekpe
umu nwoke lagos Onye nduzi Julius Agwu, Osita Iheme, Chinedu Ikedieze, Ronke Ojo
nwoke ezughi oke Omee, Onye nduzi Lilian Bach, Emeka Ike, Genevieve Nnaji, Muna Obiekwe
2004 Otu nde ara ogbubga Omee, Onye nduzi ya na Chiege Alisigwe, Charles Awurum, Emeka Enyiocha, Kenneth Okonkwo
Anya nke ihunanya Onye nduzi Ini Edo, Emeka Ike, Tom Njamanze
Egwuruegwu rụrụ arụ Omee, onye nduzi ya na Chioma Chukwuka, Ejike Asiegbu, Sam Dede, Thelma Okoduwa
Mazi Ibu Omee, onye nduzi, ngosi ihe onyonyo, Odee (mere dika Azuh) ya naJohn Okafor (Ibu), Osita Iheme (Muo)
Idi nkwadobe inwu Onye nduzi Jim Iyke, Lilian Bach
Ndi nghori: umu nwanyi ojoo omee, Onye nduzi Ya na Bimbo Akintola, Rita Dominic
Obi nke mmadu Onye nduzi Steve Eboh, Pete Edochie
Abuo aburula otu onye nduzi Chioma Chukwuka, Emeka Ike, Patience Ozokwor
2005 Ebe ngedobe ego Omee, onye mmeputa, onye nduzi, odee with Pete Edochie, Ejike Asiegbu, Pete Edochie, Kanayo O. Kanayo, Kenneth Okonkwo, Chiege Alisigwe
Ụzọ oroma Onye nduzi Pat Attah, Rita Dominic, Desmond Elliot, Oge Okoye
Dọkapu Omee,Onye nduzi Charles Lawson, Genevieve Nnaji, Ramsey Nouah
nkpuru obi no n'oku Omee, Onye nduzi Patience Ozokwor, Sophia Tchidi Chikere, Olu Jacobs
Nwanyi no n'elu Omee, Onye nduzi ya na Stephanie Okereke, Saint Obi, Ifeoma Anyiam, Steve Eboh, Uche Elendu
2006 Ntaramahuhu Omee, onye nduzi Kate Henshaw-Nuttal, Ramsey Nouah, Oby Okafor
ulo oru na-agbaoso Omee, onye nduzi ya na Monalisa Chinda, Uche Jombo, Zack Orji, Tony Umez
Oke òkè Omee, onye nduzi Chidi Mokeme, Dakore Egbuson, Ofia Afuluagu Mbaka, Nobert Young
Ndi nwoke nagba-ọsọ Onye nduzi Klint da Drunk

(dika onwe ya), Sam Loco Efe, John Okafor, Victor Osuagwu

nwannem nwanyi di uto Omee, onye nduzi Chigozie Atuanya, Dakore Egbuson, Emeka Ike, Gentle Jack
Nwanyi: Ị ga-eruberịrị isi Onye nduzi Fred Amata, Ngozi Ezeonu, Kate Henshaw-Nuttal, Ramsey Nouah, Tony Umez
Ọkụ dị jụụ Omee, onye nduzi Ini Edo, Charles Inojie, Uche Jumbo
Anu ohia wolf ahu Onye nduzi Ejike Asiegbu, Nonso Diobi, Prince Eke, Desmond Elliot, Charles Inojie
2007 Onye agbatobi Omee,Onye nduzi ya na Nonso Diobi (Tony), Ebube Nwagbo (Whitney), Monalisa Chinda (Geraldine)
Onye nkịtị di ike Omee, Onyenduzi ya na Osita Iheme, Chinedu Ikedieze, Sam Loco Efe, Queen Nwokoye, Victor Osuagwu
Ịgịgị di isi ike Omee, onye nduzi ya na Osita Iheme, Chinedu Ikedieze
Dike kachasi Onye nduzi ya na Chiwetalu Agu, Chidi Mokeme, Oge Okoye,
2009 onye nduhie eziokwu Omee,onye nduzi (oru dika Oscar)ya na Ini Edo (Diana), Justus Esiri (Denis), Ali Nuhu (Damian), Sylvia Oluchy (Lara)
2013 Mama dị abuọ Onye nduzi, Odee Osita Iheme (Arusi), Chiwetalu Agu (Osimiri), Ify Dollars (Bebiana), Ugo Doris Igwe (Miss Kate), Linda Iheanacho (Cossy)

[7]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

N'afo 2015,nna Chukwu nwuru. N'onwa Mee nke afo 2016, nwunye Chukwu muru ejima.[8][9]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke ndị nduzi ihe nkiri Naijiria
  • Ndepụta ndị si Ebonyi Steeti

Ebemside[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]